< Zjevení Janovo 14 >
1 A tu jsem spatřil Beránka, jak stojí na hoře Sijónu, a kolem něho sto čtyřicet čtyři tisíce těch, jejichž čela jsou označena jménem Beránka a jeho Otce.
Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha.
2 Z nebe se ke mně donesl zvuk nejprve jako mohutného vodopádu nebo burácení hromu, potom jako hra na mnohé harfy.
Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
3 Těch sto čtyřiačtyřicet tisíc začalo zpívat před Božím trůnem, před čtyřmi bytostmi a čtyřiadvaceti starci docela novou píseň. Nikdo jiný se k ní nemohl připojit, uměli ji jen tito vykoupení.
Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta.
4 To jsou ti, kteří nejsou poskvrněni modloslužbou a následují Beránka všude. Byli jako první sklizeň vykoupeni pro Boha a pro Beránka.
Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.
5 Jsou čistí a mají čistá ústa – nepropůjčili je nikdy lži.
Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
6 Pak jsem viděl anděla, jak letěl vysoko nad nebeskou klenbou. Nesl radostnou zprávu o vykoupení, zprávu, která nikdy neztratí svou platnost. Ohlašoval ji všem obyvatelům země, lidem všech ras, kmenů, jazyků i národností. (aiōnios )
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. (aiōnios )
7 Volal silným hlasem: „Bojte se Boha, vzdejte mu čest! Chvíle jeho konečného soudu nastává. Poklekněte před Stvořitelem nebe i země, moře i pramenů vod!“
O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
8 Následoval ho druhý anděl a ten volal: „Padl, padl mocný Babylón, který opájel národy, aby zrazovaly Boha. Jeho číše se teď změnila v pohár Božího hněvu.“
Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”
9 Za nimi letěl třetí anděl s důležitou zprávou: „Kdo uctívá šelmu a její sochu, kdo nese na čele nebo na ruce její znak,
Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya,
10 ten okusí víno Božího rozhořčení; už se nalévá nezředěné do poháru Božího hněvu. Ctitelé šelmy, její sochy a nositelé jejího znaku propadnou před svatými anděly a před Beránkem soudu.
ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.
11 V jejich utrpení nebude pro ně úleva ve dne ani v noci. (aiōn )
Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. (aiōn )
12 Vyplatí se vytrvalost těch, kdo zachovali Boží přikázání a věrnost Kristu!“
Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”
13 K tomu se připojil hlas z nebe: „Piš! Ti, kdo umírají s Kristem a zůstávají mu věrní, mohou se od této chvíle radovat. Boží Duch jim dává odpočinek i zadostiučinění.“
Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.
14 Tu vidím sněhobílý oblak a na něm muže – ano, je to sám Kristus! Na hlavě má zlatou korunu a v ruce ostrý srp.
Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.
15 Z chrámu vyšel anděl a volá na něj hlasitě: „Začni svou žeň, chvíle pro ni nastala, úroda země už dozrála!“
Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.”
16 Pán z oblaku mávl srpem po zemi a země byla rázem požnutá.
Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.
17 Z chrámu vyšel jiný anděl s ostrým vinařským nožem v ruce.
Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.
18 Od oltáře vyšel další anděl, ten který měl moc nad ohněm. Hlasitě zavolal na anděla se srpem a vybídl ho: „Sklízej hrozny, vinice země dozrály k soudu!“
Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.”
19 Anděl odřezával hrozny pozemské révy a házel je do obrovského lisu Božího hněvu za hradbami města.
Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.
20 Tam byly hrozny tlačeny, až víno rudé jako krev se rozlévalo do nedohledna.
A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.