< 1 Mojžišova 6 >

1 Stalo se pak, když se počali množiti lidé na zemi, a dcery se jim zrodily,
Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom,
2 Že vidouce synové Boží dcery lidské, any krásné jsou, brali sobě ženy ze všech, kteréž oblibovali.
ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha.
3 Pročež řekl Hospodin: Nebude se nesnaditi duch můj s člověkem na věky, proto že také tělo jest, a bude dnů jeho sto a dvadceti let.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.”
4 Obrové pak byli na zemi v těch dnech; ano i potom, když vcházeli synové Boží k dcerám lidským, ony rodily jim. To jsou ti mocní, kteříž zdávna byli, muži na slovo vzatí.
Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama.
5 Ale když viděl Hospodin, an se rozmnožuje zlost lidská na zemi, a že by všeliké myšlení srdce jejich nebylo než zlé po všecken čas,
Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile.
6 Litoval Hospodin, že učinil člověka na zemi, a bolest měl v srdci svém.
O wutere Onyenwe anyị nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu.
7 Tedy řekl Hospodin: Vyhladím z země člověka, kteréhož jsem stvořil, od člověka až do hovada, až do zeměplazu, až i do ptactva nebeského; nebo líto mi, že jsem je učinil.
Nʼihi ya, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.”
8 Ale Noé našel milost před Hospodinem.
Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị.
9 Tito jsou příběhové Noé: Noé muž spravedlivý, dokonalý byl za svého věku, s Bohem ustavičně chodil Noé.
Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.
10 (Zplodil pak Noé tři syny: Sema, Chama a Jáfeta.)
Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet.
11 Ale země byla porušena před Bohem, a naplněna byla země nepravostí.
Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.
12 Viděl tedy Bůh zemi, a aj, porušena byla, nebo bylo porušilo všeliké tělo cestu svou na zemi.
Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.
13 Protož řekl Bůh k Noé: Konec všelikého těla přichází přede mne, nebo naplněna jest země nepravostí od nich; z té příčiny, hle, již zkazím je s zemí.
Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya.
14 Učiň sobě koráb z dříví gofer; příhrady zděláš v tom korábu, a oklejuješ jej vnitř i zevnitř klím.
Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.
15 A na tento způsob uděláš jej: Tří set loktů bude dlouhost toho korábu, padesáti loktů širokost jeho a třidceti loktů vysokost jeho.
Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara.
16 Okno uděláš v korábu, a svrchkem na loket vysokým zavřeš jej; dvéře také korábu v boku jeho postavíš, a pokoje spodní, druhé i třetí zděláš v něm.
Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.
17 Já pak, aj, já uvedu potopu vod na zemi, aby zkaženo bylo všeliké tělo, v němž jest duch života pod nebem. Cožkoli bude na zemi, umře.
Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.
18 S tebou však učiním smlouvu svou; a vejdeš do korábu, ty i synové tvoji, žena tvá i ženy synů tvých s tebou.
Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
19 A ze všech živočichů všelikého těla, po dvém z každého uvedeš do korábu, abys je živé zachoval s sebou; samec a samice budou.
Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ.
20 Z ptactva podlé pokolení jeho, a z hovad podlé pokolení jejich, ze všelikého také zeměplazu podlé pokolení jeho, po dvém z každého vejdou k tobě, aby živi zůstali.
Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ.
21 Ty pak nabeř s sebou všeliké potravy, kteráž se jísti může, a shromažď sobě, aby byla tobě i jim ku pokrmu.
Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.”
22 I učinil Noé podlé všeho, jakž mu rozkázal Bůh, tak učinil.
Noa mere ihe niile dịka Chineke nyere ya iwu ime.

< 1 Mojžišova 6 >

The World is Destroyed by Water
The World is Destroyed by Water