< 2 Kronická 15 >
1 Tehdy na Azariáše syna Odedova sstoupil duch Boží.
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded.
2 Pročež vyšed vstříc Azovi, řekl jemu: Slyšte mne, Azo i všecko pokolení Judovo a Beniaminovo. Hospodin byl s vámi, dokudž jste byli s ním, a budete-li ho hledati, najdete ho; pakli ho opustíte, opustíť vás.
Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, “Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.
3 Po mnohé zajisté dny Izrael jest bez pravého Boha a bez kněží, učitelů i bez zákona,
Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke
4 Ješto, kdyby se v úzkosti své k Hospodinu Bohu Izraelskému byli obrátili a hledali ho, byliť by ho nalezli.
Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka.
5 Ale časů těchto není bezpečno vycházeti ani vcházeti; nebo nepokoj veliký jest mezi všemi obyvateli země,
Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara.
6 Tak že šlapá národ po národu, a město po městu, proto že Bůh kormoutí je všelijakými úzkostmi.
Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha.
7 Protož vy posilňte se, a neopouštějte rukou svých; nebo má mzdu práce vaše.
Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”
8 A když slyšel Aza slova ta a proroctví Odeda proroka, posilil se, a vyplénil ohavnosti ze vší země Judské a Beniaminské, i z měst, kteráž byl vzal na hoře Efraim, a obnovil oltář Hospodinův, kterýž byl před síní Hospodinovou.
Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
9 Potom shromáždil všecko pokolení Judovo i Beniaminovo, a příchozí s nimi z Efraima, Manassesa a Simeona; nebo jich bylo uteklo k němu z lidu Izraelského velmi mnoho, vidouce, že Hospodin Bůh jeho jest s ním.
Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
10 I sebrali se do Jeruzaléma třetího měsíce, patnáctého léta kralování Azova,
Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa.
11 A obětovali Hospodinu v ten den z kořistí přihnaných, volů sedm set a ovcí sedm tisíc.
Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha.
12 A vešli v smlouvu, aby hledali Hospodina Boha otců svých, z celého srdce svého a ze vší duše své,
Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe.
13 A kdož by koli nehledal Hospodina Boha Izraelského, aby byl usmrcen, buď malý neb veliký, buď muž neb žena.
Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye.
14 I přisáhli Hospodinu hlasem velikým, s zvukem na trouby i na pozouny.
Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi.
15 Všecken zajisté lid Judský radoval se z přísahy té; nebo celým srdcem svým přisáhli, a se vší ochotností hledali ho, a nalezli jej. I dal jim odpočinutí Hospodin se všech stran.
Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
16 Nadto i Maachu matku ssadil Aza král, aby nebyla královnou, proto že byla vzdělala v háji hroznou modlu. I podťal Aza modlu tu hroznou, a zdrobil i spálil ji při potoku Cedron.
Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
17 Ačkoli výsosti nebyly zkaženy v lidu Izraelském, srdce však Azovo bylo celé po všecky dny jeho.
Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile
18 Vnesl také ty věci, kteréž posvěceny byly od otce jeho, i to, čehož sám posvětil, do domu Božího, stříbro, zlato i nádoby.
O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
19 A nebylo války až do léta třidcátého pátého kralování Azova.
Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.