< Matouš 13 >

1 A v ten den vyšed Ježíš z domu, sedl podlé moře.
Nʼotu ụbọchị ahụ, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nʼọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala.
2 I sešli se k němu zástupové mnozí, tak že vstoupiv na lodí, seděl, všecken pak zástup stál na břehu.
Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nʼime ụgbọ mmiri. Nʼime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nʼọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe.
3 I mluvil jim mnoho v podobenstvích, řka: Aj, vyšel rozsevač, aby rozsíval.
O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịkụ mkpụrụ nʼubi ya.
4 A když on rozsíval, některá padla podlé cesty, a přiletěli ptáci, i szobali je.
Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime ha dara nʼakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrịa ha loo.
5 Jiná pak padla na místa skalnatá, kdež neměla mnoho země; a rychle vzešla, proto že neměla hlubokosti země.
Ma ụfọdụ nʼime ha dara nʼala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha puputara, too, nʼihi na aja dị nʼebe ahụ emighị emi.
6 Ale když slunce vzešlo, vyhořela, a proto že neměla kořene, uschla.
Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nʼihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nʼime ala.
7 Jiná pak padla do trní; i zrostlo trní, a udusilo je.
Mkpụrụ ụfọdụ danyere nʼetiti ogwu, ogwu ahụ topụtara kpagbuo ha.
8 A jiná padla v zemi dobrou; i vydalo užitek, některé stý, jiné šedesátý a jiné třidcátý.
Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nʼezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị mkpụrụ iri atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ kwa otu narị.
9 Kdo má uši k slyšení, slyš.
Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
10 Tedy přistoupivše učedlníci, řekli jemu: Proč jim v podobenstvích mluvíš?
Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?”
11 On pak odpověděv, řekl jim: Proto že vám dáno jest znáti tajemství království nebeského, ale jim není dáno.
Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya.
12 Nebo kdož má, dáno bude jemu, a rozhojníť se; ale kdož nemá, i to, což má, bude od něho odjato.
Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere.
13 Protoť v podobenstvích mluvím jim, že vidouce, nevidí, a slyšíce, neslyší, ani rozumějí.
Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu: “Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya.
14 A plní se na nich proroctví Izaiáše, řkoucí: Slyšením slyšeti budete, ale nesrozumíte; a hledíce, hleděti budete, a nepoznáte.
Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla. Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.
15 Nebo ztučnělo srdce lidu tohoto, a ušima těžce slyšeli, a oči své zamhouřili, aby někdy neviděli očima, a ušima neslyšeli, a srdcem nesrozuměli, a neobrátili se, abych jich neuzdravil.
Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
16 Ale oči vaše blahoslavené, že vidí, i uši vaše, že slyší.
Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe.
17 Amen zajisté pravím vám, že mnozí proroci a spravedliví žádali viděti to, co vidíte, ale neviděli, a slyšeti to, což slyšíte, ale neslyšeli.
Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.
18 Vy tedy slyšte podobenství rozsevače.
“Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ.
19 Každý, kdož slyší slovo o tom království a nerozumí, přichází ten zlý a uchvacuje to, což jest vsáto v srdce jeho. To jest ten, kterýž podlé cesty vsát jest.
Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ.
20 V skalnatou pak zemi vsátý jest ten, kterýž slyší slovo, a hned je s radostí přijímá.
Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.
21 Než nemá v sobě kořene, ale jest časný, a když přichází ssoužení neb protivenství pro slovo, hned se horší.
Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.
22 Mezi trní pak vsátý jest ten, kterýž slyší slovo, ale pečování tohoto světa a oklamání zboží udušuje slovo, i bývá bez užitku. (aiōn g165)
Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. (aiōn g165)
23 V dobrou pak zemi vsátý ten jest, kterýž slyší slovo a rozumí, totiž kterýž užitek nese. Neseť pak někdo stý, a jiný šedesátý, jiný pak třidcátý.
Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”
24 Jiné podobenství předložil jim, řka: Podobno jest království nebeské člověku, rozsívajícímu dobré semeno na poli svém.
Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụnʼubi ya.
25 Když pak lidé zesnuli, přišel nepřítel jeho, a nasál koukole mezi pšenici, a odšel.
Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa.
26 A když zrostla bylina a užitek přinesla, tedy ukázal se i koukol.
Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito.
27 I přistoupivše služebníci hospodáře toho, řekli jemu: Pane, zdaližs dobrého semene nenasál na poli svém? Kde že se pak vzal koukol?
“Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’
28 A on řekl jim: Nepřítel člověk to učinil. Služebníci pak řekli mu: Chceš-liž tedy, ať jdeme a vytrháme jej?
“Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ “Ndị ọrụ ya jụrụ ya sị, ‘Ị chọrọ ka anyị gaa fopụtasịa ha?’
29 On pak odpověděl: Nikoli, abyste trhajíce koukol, spolu s ním nevytrhali pšenice.
“Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti.
30 Nechte ať obé spolu roste až do žně. A v čas žně dím žencům: Vytrhejte nejprv koukol a svažte jej v snopky k spálení, ale pšenici shromažďte do stodoly mé.
Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’”
31 Jiné podobenství předložil jim, řka: Podobno jest království nebeské zrnu horčičnému, kteréž vzav člověk, vsál na poli svém.
Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya.
32 Kteréžto zajisté nejmenší jest mezi všemi semeny, když pak zroste, větší jest nežli jiné byliny, a bývá strom, tak že ptáci nebeští přiletíce, hnízda sobě dělají na ratolestech jeho.
Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
33 Jiné podobenství mluvil jim: Podobno jest království nebeské kvasu, kterýž vzavši žena, zadělala ve třech měřicích mouky, až by zkysalo všecko.
Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha, nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.”
34 Toto všecko mluvil Ježíš v podobenstvích k zástupům, a bez podobenství nemluvil jim,
Oge niile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.
35 Aby se naplnilo povědění skrze proroka, řkoucího: Otevru v podobenstvích ústa svá, vypravovati budu skryté věci od založení světa.
O mere nke a ka okwu onye amụma kwuru mezuo, sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọbụla na-amaghị site nʼoge e kere ụwa.”
36 Tedy propustiv zástupy, šel domů Ježíš. I přistoupili k němu učedlníci jeho, řkouce: Vylož nám podobenství o koukoli toho pole.
Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.”
37 On pak odpovídaje, řekl jim: Rozsevač dobrého semene jest Syn člověka.
Jisọs zara ha sị, “Nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke Mmadụ.
38 A pole jest tento svět, dobré pak símě jsou synové království, ale koukol jsou synové toho zlostníka.
Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ.
39 A nepřítel, kterýž jej rozsívá, jestiť ďábel, žeň pak jest skonání světa, a ženci jsou andělé. (aiōn g165)
Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. (aiōn g165)
40 Protož jakož vybrán bývá koukol a ohněm spálen, takť bude při skonání tohoto světa. (aiōn g165)
“Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. (aiōn g165)
41 Pošle Syn člověka anděly své, i vyberouť z království jeho všecka pohoršení, i ty, kteříž činí nepravost,
Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe.
42 A uvrhouť je do peci ohnivé. Tamť bude pláč a škřipení zubů.
Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.
43 A tehdážť spravedliví stkvíti se budou jako slunce v království Otce svého. Kdo má uši k slyšení, slyš.
Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
44 Opět podobno jest království nebeské pokladu skrytému v poli, kterýž nalezna člověk, skrývá, a radostí naplněn jsa pro něj, odchází a prodává všecko, což má, a koupí pole to.
“Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ.
45 Opět podobno jest království nebeské člověku kupci, hledajícímu pěkných perel.
“Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.
46 Kterýž když nalezl jednu velmi drahou perlu, odšed, prodal všecko, což měl, a koupil ji.
Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.
47 Opět podobno jest království nebeské vrši puštěné do moře, a ze všelikého plodu shromažďující.
“Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche.
48 Kteroužto, když naplněna byla, vytáhše na břeh a sedíce, vybírali, což dobrého bylo, do nádob, a což bylo zlého, preč zamítali.
Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma.
49 Takť bude při skonání světa. Vyjdou andělé, a oddělí zlé z prostředku spravedlivých, (aiōn g165)
Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, (aiōn g165)
50 A uvrhou je do peci ohnivé. Tamť bude pláč a škřipení zubů.
ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”
51 Dí jim Ježíš: Srozuměli-li jste tomuto všemu? Řekli jemu: I ovšem, Pane.
Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha zara sị ya, “E.”
52 On pak řekl jim: Protož každý učitel umělý v království nebeském podobný jest člověku hospodáři, kterýž vynáší z pokladu svého nové i staré věci.
Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”
53 I stalo se, když dokonal Ježíš podobenství ta, bral se odtud.
Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ.
54 A přišed do vlasti své, učil je v škole jejich, tak že se velmi divili, a říkali: Odkud má tento moudrost tuto a moc?
O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile?
55 Zdaliž tento není syn tesařův? Zdaliž matka jeho neslove Maria, a bratří jeho Jakub a Jozes a Šimon a Judas?
Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom?
56 A sestry jeho zdaliž všecky u nás nejsou? Odkudž tedy má tyto všecky věci?
Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?”
57 I zhoršili se na něm. Ježíš pak řekl jim: Neníť prorok beze cti, než v své vlasti a v domě svém.
Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.”
58 I neučinil tu mnoho divů pro nevěru jejich.
Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.

< Matouš 13 >