< 2 Korintským 10 >

1 Já pak sám Pavel prosím vás skrze tichost a dobrotivost Kristovu, kterýžto v přítomnosti u vás jsem pokorný, ale v nepřítomnosti jsem k vám směle dověrný.
Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke Kraịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu.
2 Prosímť pak, abych přítomen jsa, nemusil se osvoboditi tou smělostí, na kterouž myslím, abych smělý byl proti některým, kteříž za to mají, že bychom my podlé těla chodili.
Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya.
3 V těle zajisté chodíce, ne podlé těla rytěřujeme,
Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị.
4 (Nebo odění rytěřování našeho není tělesné, ale mocné v Bohu k vyvrácení ohrad, )
Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi.
5 Podvracejíce rady, i všelikou vysokost, povyšující se proti umění Božímu, a jímajíce všelikou mysl v poddanost Kristu,
Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst.
6 A nahotově majíce pomstu proti každému neposlušenství, když naplněno bude vaše poslušenství.
Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke.
7 Na to-liž jen, co před očima jest, hledíte? Má-li kdo tu naději o sobě, že by Kristův byl, pomysliž také na to sám u sebe, že jakož on jest Kristův, tak i my Kristovi jsme.
Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya.
8 Nebo bychť se pak i ještě hojněji chlubil mocí naší, kterouž nám dal Pán k vzdělání, a ne k zkažení vašemu, nebuduť zahanben;
Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a.
9 Abych se nezdál listy strašiti vás.
Achọghị ka ọ dịka m a ga-asị na m sitere nʼakwụkwọ ozi m na-emenye unu egwu.
10 Nebo listové prý jsou těžcí a mocní, ale přítomnost osobná jest mdlá, a řeč chaterná.
Nʼihi na ha na-asị, “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike, ma na mmadụ, ma nʼọdịdị ya na mmadụ adịghị ike, okwu ọnụ ya bụkwa ihe na-abaghị uru.”
11 Toto nechať myslí takový, že jacíž jsme v slovu skrze psání, vzdáleni jsouce, takoví také budeme i v skutku, přijdouce.
Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu.
12 Neboť my se nesmíme přimísiti aneb přirovnati k některým, kteříž sami sebe chválí. Ale ti nerozumějí, že sami sebou sebe měří, a přirovnávají sebe sobě.
Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta.
13 My pak tím, což není odměřeno, nebudeme se chlubiti, ale podlé míry pravidla, kteroužto míru odměřil nám Bůh, tak že jsme dosáhli až k vám.
Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ.
14 Nebo ne jako bychom nedosáhli až k vám, rozšiřujeme se nad míru. Až i k vám zajisté přišli jsme v evangelium Kristovu.
Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst.
15 My tedy tím, což není odměřeno, nechlubíme se, cizími pracemi, ale naději máme, když víra vaše růsti bude v vás, že se rozšíříme dále podlé toho, jakž nám odměřeno,
Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.
16 Abych ještě tam za vámi kázal evangelium, ne abych v tom, což jinému odměřeno jest, a jest hotové, chlubil se.
Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ.
17 Ale kdo se chlubí, v Pánu se chlub.
Ma, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”
18 Nebo ne ten, kdož se sám chválí, zkušený jest, ale ten, kohož Pán chválí.
Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.

< 2 Korintským 10 >