< 1 Janův 3 >

1 Pohleďte, jakou lásku dal nám Otec, totiž abychom synové Boží slouli. Protoť svět nezná nás, že jeho nezná.
Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.
2 Nejmilejší, nyní synové Boží jsme, ale ještěť se neokázalo, co budeme. Vímeť pak, že když se okáže, podobni jemu budeme; nebo viděti jej budeme tak, jakž jest.
Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị.
3 A každý, kdož má takovou naději v něm, očišťuje se, jakož i on čistý jest.
Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.
4 Každý, kdož činí hřích, činíť proti zákonu; nebo hřích jest přestoupení zákona.
Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu.
5 A víte, že on se okázal, aby hříchy naše sňal, a hříchu v něm není.
Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya.
6 Každý tedy, kdož v něm zůstává, nehřeší; ale každý, kdož hřeší, neviděl ho, aniž ho poznal.
Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.
7 Synáčkové, nižádný vás nesvoď. Kdož činí spravedlnost, spravedlivý jest, jakož i on jest spravedlivý.
Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume.
8 Kdož činí hřích, z ďábla jest; nebo ďábel od počátku hřeší. Na toť jest zjeven Syn Boží, aby kazil skutky ďáblovy.
Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.
9 Každý, kdož se narodil z Boha, hříchu nečiní; nebo símě jeho v něm zůstává, aniž může hřešiti, nebo z Boha narozen jest.
Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke.
10 Po tomtoť zjevní jsou synové Boží a synové ďáblovi. Každý, kdož nečiní spravedlnosti, neníť z Boha, a kdož nemiluje bratra svého.
Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.
11 Nebo toť jest to zvěstování, kteréž jste slýchali od počátku, abychom milovali jedni druhé.
Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya.
12 Ne jako Kain, kterýž z toho zlostníka byl, a zamordoval bratra svého. A pro kterou příčinu zamordoval ho? Proto že skutkové jeho byli zlí, bratra pak jeho spravedliví.
Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi.
13 Nedivtež se, bratří moji, jestliže vás svět nenávidí.
Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị.
14 My víme, že jsme přeneseni z smrti do života, nebo milujeme bratří. Kdož nemiluje bratra, zůstáváť v smrti.
Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ.
15 Každý, kdož nenávidí bratra svého, vražedlník jest, a víte, že žádný vražedlník nemá života věčného v sobě zůstávajícího. (aiōnios g166)
Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya. (aiōnios g166)
16 Po tomto jsme poznali lásku, že on duši svou za nás položil, i myť tedy máme za bratří duše klásti.
Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị.
17 Kdo by pak měl statek tohoto světa, a viděl by bratra svého, an nouzi trpí, a zavřel by střeva svá před ním, kterak láska Boží zůstává v něm?
Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya?
18 Synáčkové moji, nemilujmež slovem, ani jazykem, ale skutkem a pravdou.
Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.
19 A po tomť poznáváme, že z pravdy jsme, a před oblíčejem jeho spokojíme srdce svá.
Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya.
20 Nebo potupovalo-liť by nás srdce naše, ovšemť Bůh, kterýž jest větší nežli srdce naše, a zná všecko.
Nʼihi na ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, Chineke dị ukwuu karịa obi anyị, ọ mazukwara ihe niile.
21 Nejmilejší, jestližeť by nás srdce naše nepotupovalo, smělou doufanlivost máme k Bohu.
Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke
22 A zač bychom ho koli prosili, béřeme od něho; nebo přikázaní jeho ostříháme, a to, což jest libého před oblíčejem jeho, číníme.
na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ.
23 A totoť jest to přikázaní jeho, abychom věřili jménu Syna jeho Jezukrista, a milovali jedni druhé, jakož nám vydal přikázaní.
Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu.
24 Nebo kdož ostříhá přikázaní jeho, v němť zůstává, a on také v něm. A po tomť poznáváme, že zůstává v nás, totiž po Duchu, kteréhož dal nám.
Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị.

< 1 Janův 3 >