< Otkrivenje 19 >

1 Nakon toga začujem kao jak glas silnoga mnoštva na nebu: “Aleluja! Spasenje i slava i moć Bogu našemu!
Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.
2 Doista, istiniti su i pravedni sudovi njegovi jer osudi veliku Bludnicu, što pokvari zemlju bludom svojim, i osveti na njoj krv slugu svojih!”
Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”
3 I ponove: “Aleluja! Dim njezin suklja u vijeke vjekova!” (aiōn g165)
Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
4 Nato starješine, njih dvadesetčetvorica, i ona četiri bića padoše ničice i p okloniše se Bogu, koji sjedi na prijestolju, govoreći: “Amen! Aleluja!”
Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!”
5 I s prijestolja iziđe glas: “Hvalite Boga našega, sve sluge njegove, svi koji se njega bojite, i mali i veliki!”
Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”
6 I začuh kao glas silna mnoštva i kao šum voda mnogih i kao prasak gromova silnih: “Aleluja! Zakraljeva Gospod, Bog naš Svevladar!
Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.
7 Radujmo se i kličimo i slavu mu dajmo jer dođe svadba Jaganjčeva, opremila se Zaručnica njegova!
Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ. Ka anyị nye ya otuto. Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola, nwunye ya edoziekwala onwe ya.
8 Dano joj je odjenuti se u lan tanan, blistav i čist!” A lan - pravedna su djela svetih.
E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.)
9 I reče mi: “Piši! Blago onima koji su pozvani na svadbenu gozbu Jaganjčevu!” I reče mi: “Ove su riječi istinite, Božje.”
Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.”
10 Padoh mu pred noge da mu se poklonim. A on će mi: “Nipošto! Sluga sam kao i ti i braća tvoja koja imaju svjedočanstvo Isusovo. Bogu se pokloni!” Jer svjedočanstvo Isusovo duh je proročki.
Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”
11 I vidjeh: nebo otvoreno - i gle, konj bijelac, a na nj sjeo On, zvani Vjerni i Istiniti, a sudi i vojuje po pravdi;
Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha.
12 oči mu plamen ognjeni, na glavi mu mnoge krune; nosi napisano ime kojeg nitko ne zna doli on sam;
Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu.
13 ogrnut je ogrtačem krvlju natopljenim; ime mu: Riječ Božja.
E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
14 Prate ga na bijelcima Vojske nebeske, odjevene u lan tanan, bijel i čist.
Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya.
15 Iz usta mu izlazi oštar mač kojim će posjeći narode. Vladat će njima palicom gvozdenom. On gazi u kaci gnjevne srdžbe Boga Svevladara.
Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
16 Na ogrtač, o boku, napisano mu ime: “Kralj kraljeva i Gospodar gospodara.”
Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya: Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.
17 I vidjeh jednog anđela: stajaše na suncu vičući iza glasa svim pticama što nebom lete: “Ovamo! Skupite se na veliku gozbu Božju
Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke.
18 da se najedete mesa kraljeva, i mesa vojvoda, i mesa mogućnika, i mesa konja i konjanika njihovih, i mesa svih mogućih ljudi, slobodnjaka i robova, malih i velikih!”
Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.”
19 I vidjeh: Zvijer i kraljevi zemlje i vojske njihove skupiše se u boj da se zarate s Onim što sjedi na konju i s vojskom njegovom.
Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya.
20 I Zvijer bi uhvaćena, a s njom i Lažni prorok koji je u njenoj nazočnosti činio znamenja i njima zavodio one što su primili žig Zvijeri i klanjali se njezinu kipu. Živi su oboje bačeni u ognjeno jezero što gori sumporom. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. (Limnē Pyr g3041 g4442)
21 A drugi su posječeni mačem što iziđe iz usta Onoga koji sjedi na konju i sve se ptice nasitiše mesa njihova.
Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.

< Otkrivenje 19 >