< Psalmi 91 >

1 Ti što prebivaš pod zaštitom Višnjega, što počivaš u sjeni Svemogućega,
Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
2 reci Jahvi: “Zaklone moj! Utvrdo moja! Bože moj u koga se uzdam!”
Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”
3 Jer on će te osloboditi od zamke ptičarske, od kuge pogubne.
Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.
4 Svojim će te krilima zaštititi i pod njegova ćeš se krila skloniti: Vjernost je njegova štit i obrana!
Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.
5 Nećeš se bojati strašila noćnoga ni strelice što leti danju,
Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị, maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,
6 ni kuge što se šulja kroz tmine, ni pošasti što hara o podne.
maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị, ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.
7 Pa nek' padaju tisuće kraj tebe, deseci tisuća s desne tvoje, tebi se neće primaći!
Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị, iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị, ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.
8 Tek što okom pogledaš, već ćeš vidjeti plaću grešnika.
Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.
9 Jer Jahve je zaklon tvoj, Višnjega odabra sebi za okrilje.
Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,
10 Neće te snaći nesreća, nevolja se neće prikučiti šatoru tvojemu.
mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.
11 Jer anđelima svojim zapovjedi da te čuvaju na svim putima tvojim.
Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.
12 Na rukama će te nositi da se ne spotakneš o kamen.
Ha ga-eji ọbụ aka ha, bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.
13 Nogom ćeš gaziti lava i ljuticu, zgazit ćeš lavića i zmiju.
Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ, zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.
14 Izbavit ću ga jer me ljubi, zakrilit ga jer poznaje ime moje.
“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru; aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.
15 Zazvat će me, a ja ću ga uslišiti, s njim ću biti u nevolji, spasit ću ga i proslaviti.
Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya. Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya, aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.
16 Nasitit ću ga danima mnogim, pokazat' mu spasenje svoje.”
Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya, gosikwa ya nzọpụta m.”

< Psalmi 91 >