< Psalmi 7 >
1 Tužaljka. Davidova. Ispjeva je Jahvi zbog Kuša Benjaminovca. O Jahve, Bože moj, tebi se utječem, od svih progonitelja spasi me, oslobodi,
Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin. Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
2 da mi dušu ne zgrabe kao lav što razdire, a nema tko da izbavi.
ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
3 Jahve, Bože moj, ako to učinih, ako je nepravda na rukama mojim,
O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
4 ako zlom uzvratih prijatelju, ili oplijenih nepravedna tužitelja:
Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
5 neka mi dušmanin progoni dušu i zgrabi je, neka mi život u zemlju satre i jetru u prašinu baci.
Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. (Sela)
6 Ustani, Jahve, u svom gnjevu, digni se na bijes tlačitelja mojih. Probudi se! Sud mi sazovi!
Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
7 Neka te okruži skupština narodna, nad njom sjedni visoko!
Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
8 O Jahve, dosudi mi pravo po pravosti mojoj i po nevinosti koja je u meni.
Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
9 Dokrajči bezakonje zlotvora, pravedna podigni, pravedni Bože koji proničeš srca i bubrege.
O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
10 Meni je štit Bog koji spasava čestita srca.
Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
11 Bog je pravedan sudac, on povazdan prijeti:
Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
12 ako se ne obrate, mač će naoštriti, luk će svoj zapet' i pravo smjerit'.
Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
13 Spremit će za njih smrtonosno oružje, strijele će svoje užariti.
Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
14 Eto, zlotvor zače nepravdu, otrudnje pakošću i podlost rodi.
Onye ọbụla dị ime ajọ ihe, na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
15 Iskopa jamu i prodube; sam u jamu svoju pade!
Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru.
16 Pakost će njegova pasti njemu na glavu, njemu na tjeme okrenut se nasilje njegovo.
Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.
17 A ja ću hvaliti Jahvu zbog pravde njegove i pjevat ću imenu Jahve višnjega.
Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.