< Psalmi 37 >
1 Davidov. ALEF Nemoj se žestiti na opake, zavidjet nemoj pakosnicima:
Abụ Ọma Devid. Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;
2 kao trava brzo se osuše, k'o mlada zelen brzo uvenu.
nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.
3 BET U Jahvu se uzdaj i čini dobro, da smiješ stanovati u zemlji i živjeti u miru.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
4 Sva radost tvoja neka bude Jahve: on će ispuniti želje tvoga srca!
Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
5 GIMEL Prepusti Jahvi putove svoje, u njega se uzdaj i on će sve voditi.
Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
6 Pravda će tvoja zasjati k'o svjetlost i tvoje pravo k'o sunce podnevno.
Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
7 DALET Smiri se pred Jahvom i njemu se nadaj, ne žesti se na onog koji ima sreće, na čovjeka koji spletke kuje.
Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
8 HE Stišaj svoj gnjev i ostavi se srdžbe, ne žesti se da zlo ne učiniš.
Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
9 Jer će biti satrti zlikovci, a koji se u Jahvu uzdaju, baštinit će zemlju.
Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.
10 VAU Još malo i nestat će bezbožnika: mjesto ćeš njegovo tražiti, a njega više nema.
Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha.
11 Zemlju će posjedovati krotki, obilje mira oni će uživat'.
Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.
12 ZAJIN Bezbožnik smišlja zlo pravedniku i zubima škrguće na njega.
Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, na-ata ikekere eze megide ha;
13 A Gospod se njemu smije jer vidi da dan njegov dolazi.
ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa.
14 HET Mač potežu bezbošci i zapinju lukove da obore jadnika i siromaha, da pokolju one koji hode pravim putem.
Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, kwee ụta ha ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, igbu ndị ụzọ ha ziri ezi.
15 Mačem će vlastito srce probiti, slomit će se njihovi lukovi.
Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha.
16 TET Bolje je i malo u pravednika no golemo blago u zlotvora:
Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;
17 jer će se ruke zlotvora slomiti, a Jahve je oslon pravedniku.
nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.
18 JOD Jahve se brine za život čestitih, dovijeka će trajati baština njihova.
Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
19 Neće se postidjeti u vrijeme nevolje, bit će siti u danima gladi.
Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.
20 KAF A bezbožnici će propasti, dušmani Jahvini povenut će k'o ures livada, poput dima se rasplinuti.
Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ.
21 LAMED Bezbožnik zaima, ali ne vraća, pravednik se sažaljeva i daje.
Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
22 Oni koje Jahve blagoslovi baštinit će zemlju, a koje prokune bit će zatrti.
Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ.
23 MEM Jahve vodi i učvršćuje korake čovjeku i mio mu je put njegov.
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
24 Ako i posrne, ne pada jer ga Jahve drži za ruku.
ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya.
25 NUN Mlad bijah i ostarjeh, al' ne vidjeh pravednika napuštena ili da mu djeca kruha prose.
Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
26 Uvijek je milosrdan i u zajam daje, na njegovu je potomstvu blagoslov.
Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, ụmụ ha ga-abụ ngọzị.
27 SAMEK Zla se kloni i čini dobro, i ostat ćeš dovijeka.
Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.
28 Jer Jahve ljubi pravdu i pobožnika svojih ne ostavlja. AJIN Zauvijek će biti zatrti zlikovci, istrijebit će se potomstvo bezbožnika.
Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;
29 Zemlju će posjedovati pravednici i živjet će na njoj dovijeka.
ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi.
30 PE Pravednikova usta mudrost kazuju, a jezik njegov govori pravo.
Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi.
31 Zakon mu je Božji u srcu, ne kolebaju se koraci njegovi.
Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.
32 SADE Bezbožnik vreba pravednoga i smišlja da ga usmrti.
Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;
33 Jahve ga neće ostaviti u njegovoj vlasti i neće dopustiti da ga na sudu osude.
ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.
34 KOF U Jahvu se uzdaj i drži se puta njegova: on će te uzvisit' i baštinit ćeš zemlju; radostan ćeš gledati propast bezbožnih.
Chere Onyenwe anyị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
35 REŠ Vidjeh obijesna zlotvora gdje se k'o cedar krošnjat širi.
Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,
36 Prođoh, i gle - nema ga više; potražih ga i ne nađoh.
ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.
37 ŠIN Promatraj čestita i gledaj neporočna: mirotvorac ima potomstvo.
Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; ọganihu dịịrị onye udo.
38 A grešnici bit će svi iskorijenjeni, istrijebit će se zlikovačko sjeme.
Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume.
39 TAU Od Jahve dolazi spas pravednicima, on im je zaklon u vrijeme nevolje.
Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
40 Jahve im pomaže, on ih izbavlja: on će ih izbaviti od zlotvora i spasiti, jer u njemu traže okrilje.
Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.