< Mudre Izreke 18 >
1 Vlastitoj požudi popušta onaj tko zastranjuje, i svađa se usprkos svakom razboru.
Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
2 Bezumnomu nije mio razum; stalo mu je dati srcu oduška.
Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
3 Kad dolazi opačina, dolazi i prezir i bruka sa sramotom.
Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
4 Duboke su vode riječi iz usta nečijih, izvor mudrosti bujica što se razlijeva.
Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
5 Ne valja se obazirati na opaku osobu, da se pravedniku nanese nepravda na sudu.
Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
6 Bezumnikove se usne upuštaju u svađu i njegova usta izazivlju udarce.
Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
7 Bezumnomu su propast vlastita usta i usne su mu zamka životu.
Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
8 Klevetnikove su riječi kao poslastice: spuštaju se u dno utrobe.
Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
9 Tko je nemaran u svom poslu, brat je onomu koji rasipa.
Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
10 Tvrda je kula ime Jahvino: njemu se pravednik utječe i nalazi utočišta.
Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
11 Bogatstvo je bogatašu njegova tvrđava i kao visok zid u mašti njegovoj.
Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
12 Pred slomom se oholi srce čovječje, a pred slavom ide poniznost.
Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
13 Tko odgovara prije nego što sasluša, na ludost mu je i sramotu.
Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
14 Kad je čovjek bolestan, njegov ga duh podiže, a ubijen duh tko će podići?
Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
15 Razumno srce stječe znanje i uho mudrih traži znanje.
Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
16 Dar čovjeku otvara put i vodi ga pred velikaše.
Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
17 Prvi je pravedan u svojoj parnici, a kad dođe njegov protivnik, opovrgne ga.
Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.
18 Ždrijeb poravna svađe, pa i među moćnicima odlučuje.
Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.
19 Uvrijeđen brat jači je od tvrda grada i svađe su kao prijevornice na tvrđavi.
Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
20 Svatko siti trbuh plodom usta svojih, nasićuje se rodom usana svojih.
Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.
21 Smrt i život u vlasti su jeziku, a tko ga miluje, jede od ploda njegova.
Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
22 Tko je našao ženu, našao je sreću i stekao milost od Jahve.
Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
23 Ponizno moleći govori siromah, a grubo odgovara bogataš.
Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.
24 Ima prijatelja koji vode u propast, a ima i prijatelja privrženijih od brata.
Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.