< Ezekiel 22 >
1 I dođe mi riječ Jahvina:
Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị:
2 “Sine čovječji, hoćeš li suditi, hoćeš li suditi gradu krvničkom? Pokaži mu sve gnusobe njegove!
“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe ya ikpe? Ị ga-ekpe obodo ọbara a ikpe? Mgbe ahụ, ị ga-eguzogide ya ihu nʼihu mee ka ọ mara ihe arụ niile o mere.
3 Reci: 'Ovako govori Jahve Gospod: Grade što u sebi krv toliku prolijevaš i što svuda sebi kumire praviš da se okaljaš, kucnu čas tvoj:
‘Ị ga-asị, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gị obodo nke na-ewetara onwe gị mbibi nʼihi ọbara niile a na-awụsi nʼetiti gị, na arụsị niile i ji na-emerụ onwe gị.
4 krvlju što je proli ti sagriješi i kumirima koje napravi ti se okalja, skrativši tako dane svoje i ubrzavši svoje godine. I zato ću te sada učiniti sramotom među narodima, ruglom po svim zemljama.
Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche.
5 I koji su ti blizu i koji su ti daleko, podrugivat će se tebi: 'O sramotno ime, grade pokvareni!'
Ndị nọ gị nso na ndị nọ gị ebe dị anya ga-achị gị ọchị, gị obodo rụrụ arụ, na nke jupụtara nʼọgbaaghara.
6 Eto, knezovi izraelski - svaki na svoju ruku - u tebi krv prolijevaju.
“‘Lee ka ndịisi Izrel nọ nʼime gị si e ji ike ha nwere na-awụsi ọbara.
7 I u tebi se više ne poštuje ni otac ni majka, došljake tlače, siročad i udovice u tebi zlostavljaju!
A na-elelị nne na nna nʼime gị. Ndị mbịarambịa ka e ji anya ike na-emegbu. Ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ ka a na-akpagbu, na-emejọkwa.
8 Svetinje moje prezireš, subote oskvrnjuješ.
I lelịala ihe nsọ m niile, merụọkwa ụbọchị izuike m niile.
9 U tebi su klevetnici zbog kojih se krv prolijeva; u tebi se po gorama blaguje, posred tebe čine sramote.
Ndị nkwutọ, ndị na-awụsi ọbara nọ nʼime gị. Ndị na-eri nri nʼihu arụsị niile dị nʼelu ugwu, na ndị na-eme omume rụrụ arụ nọkwa nʼime gị.
10 U tebi se raskriva sramota očeva, u tebi siluju žene dok su nečiste.
Nʼime gị ka ndị na-akwaso nwunye nna ha iko dị, nʼime gị ka ndị na-awakpo ụmụ nwanyị mgbe ha nọ na nsọ ha, bụ mgbe ha nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
11 Jedan čini gadost sa ženom susjeda svoga, drugi djelom sramotnim oskvrnjuje snahu svoju, a treći u tebi siluje sestru, kćerku oca svoga.
Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ.
12 Ima ih koji i mito primaju da krv proliju. Uzimaš ujam i pridatak, od bližnjega silom otimaš, a mene zaboravljaš - riječ je Jahve Gospoda.
E nwekwara ndị na-anara ego gbuo mmadụ ibe ha nʼime gị. Gị onwe gị na-anarakwa ndị i binyere ego ụma buru ibu, na-esitekwa nʼaka ike na-anara ndị mmadụ ihe ha. I chefuokwala m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
13 Zato, evo, ja rukama plješćem nad plijenom što ga ti napljačka i nad krvlju što se lije u tebi.
“‘Lee, aghaghị m ịkụkọta ọbụ aka m abụọ nʼihi uru nke na-ezighị ezi ị na-eri, na ọbara niile nke ị wụsiri nʼetiti gị.
14 Jer, hoće li srce tvoje izdržati i hoće li ruke tvoje odoljeti u dane kad ja na te ustanem? Ja, Jahve, rekoh i učinit ću!
Obi gị ọ ga-esikwa ike? Ị ga-eguzokwa nʼụbọchị m ga-ekpe gị ikpe? Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola. Aga m emezukwa ya.
15 Zato ću te raspršiti među narode, rasijat' te po zemljama, da uklonim iz tebe svu nečistoću!
Aga m achụsa unu nʼetiti mba niile, fesaa unu nʼetiti mba niile. Aga m emekwa ka adịghị ọcha unu kwụsị.
16 I bit ćeš opet moja baština naočigled naroda. I znat ćeš da sam ja Jahve!'”
Mgbe e mere ka ị ghara ịdị nsọ nʼanya ndị mba dị iche iche, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
17 Dođe mi riječ Jahvina:
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
18 “Sine čovječji, dom Izraelov troska mi postade: bakar, srebro, kositar, željezo i olovo u peći - svi su oni troska!
“Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha.
19 Stoga ovako govori Jahve Gospod: 'Jer mi troska postadoste, skupit ću vas, evo, u Jeruzalemu.
Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na unu niile aghọọla ihe efu, aga m achịkọta unu nʼime Jerusalem.
20 Kao što se skuplja srebro, bakar, željezo, olovo i kositar u peći te se okolo oganj potpiri da se sve rastali, tako ću i ja vas skupiti u svojem gnjevu i u svojoj jarosti, složiti vas i rastaliti.
Dịka a na-achịkọta ọlaọcha, na ọla, na igwe, na opu, na gbamgbam, tinye ha nʼoke ọkụ ka ha gbazee, otu a ka m ga-esite nʼiwe m na ọnụma m chịkọtaa unu nʼime obodo ahụ gbazee unu.
21 Jest, skupit ću vas i potpiriti oko vas oganj svoje jarosti da se usred grada rastalite.
Aga m achịkọta unu, fụkwasị unu ọkụ nke ọnụma m, mee ka unu gbazee nʼime ya.
22 Kao što se srebro u peći topi, tako ćete se i vi u njemu rastopiti. I znat ćete da ja, Jahve, gnjev svoj na vas izlijevam!'”
Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị awụkwasịla unu iwe m.’”
23 Dođe mi riječ Jahvina:
Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
24 “Sine čovječji, reci još: 'Ti si zemlja još neočišćena, koju još ne opra kiša dana jarosnoga!
“Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’
25 Knezovi njezini, poput lavova što riču i plijen razdiru, ljude proždiru, otimlju im blago i dragocjenosti, množeći udovice usred nje.
E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya.
26 Svećenici njezini ne poštuju mog Zakona i oskvrnjuju moje svetinje, ne razlikujući sveto od nesvetoga, ne učeći se lučiti nečisto od čistoga. Zanemarili su subote moje, bez časti sam u njihovoj sredini.
Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha.
27 Starješine njezine, poput vukova što plijen razdiru i krv prolijevaju, upropašćuju ljude, lakomi na dobitak.
Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha.
28 A proroci njezini sve to premazuju bjelilom i prekrivaju ispraznim viđenjima i lažnim proricanjima zboreći: 'Ovako govori Jahve Gospod!' - a Jahve to ne reče.
Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,’ mgbe Onyenwe anyị na-ekwughị ihe ọbụla.
29 Imućnici pak čine svakojaka nasilja i otimačine, siromaha i bijednika ugnjetavaju, a došljaka bespravno tlače.
Ndị ala a na-eji aka ike na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere na-ezukwa ohi. Ha na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na-emegbukwa ndị ọbịa site nʼụzọ ekpeghị ikpe ziri ezi.
30 Tražio sam među njima nekoga da podigne zidine i stane na proboje preda me u obranu zemlje, da je ne zatrem, i ne nađoh nikoga.
“Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ.
31 I zato izlih na njih gnjev svoj pa ih zatrijeh ognjem svoje jarosti; putove im njihove na glavu oborih' - riječ je Jahve Gospoda.”
Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha ọnụma m, jirikwa iwe m dị ọkụ rechapụ ha. Aga m ebokwasịkwa ahụhụ niile nke mmehie ha, nʼisi ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”