< Djela apostolska 28 >

1 Jednom spašeni, doznasmo da se otok zove Malta.
Mgbe a pụtara nʼọnụ mmiri ahụ nʼudo, anyị chọpụtara na aha agwa etiti ahụ bụ Malta.
2 Urođenici nam iskazivahu nesvakidašnje čovjekoljublje. Zapališe krijes i okupiše nas oko njega jer je počela kiša i bilo zima.
Ndị obodo ahụ gosiri anyị obiọma nʼụzọ pụrụ iche. Ha kwanyere anyị ọkụ ma nabatakwa anyị nʼihi na mmiri nọ na-ezo, oyi na-atụkwa.
3 Pavao nakupi naramak granja i baci na krijes kadli zbog vrućine izađe zmija i pripije mu se za ruku.
Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya.
4 Kad su urođenici vidjeli gdje mu životinja visi o ruci, govorili su među sobom: “Ovaj je čovjek zacijelo ubojica: umakao je moru i Pravda mu ne da živjeti.”
Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.”
5 Ali on otrese životinju u vatru i ne bi mu ništa;
Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya.
6 a oni očekivahu da će oteći i umah se srušiti mrtav. Pošto su dugo čekali i vidjeli da mu se ništa neobično nije dogodilo, promijeniše mišljenje te stadoše govoriti da je bog.
Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.
7 U okolici onoga mjesta bilo je imanje prvaka otoka, imenom Publija. On nas je primio i tri dana uljudno gostio.
Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ.
8 A Publijeva je oca uhvatila ognjica i srdobolja pa je ležao. Pavao uđe k njemu, pomoli se, stavi na nj ruke i izliječi ga.
Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma.
9 Nakon toga su dolazili i drugi koji na otoku bijahu bolesni te ozdravljali.
Mgbe nke a mechara, ndị niile nwere nrịa nrịa nʼagwa etiti ahụ bịakwara, a gwọkwara ha.
10 Oni nas mnogim počastima počastiše i na odlasku nam priskrbiše što je potrebno.
Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ.
11 Nakon tri mjeseca otplovismo aleksandrijskom lađom koja je prezimila na otoku i imala za znak Dioskure.
Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus.
12 Doplovismo u Sirakuzu i ostadosmo ondje tri dana.
Anyị bịaruru obodo Sirakọs ebe anyị nọrọ ụbọchị atọ.
13 Odande ploveći uz obalu, stigosmo u Regij. Sutradan okrenu južnjak te za dva dana stigosmo u Puteole.
Site nʼebe ahụ, anyị gara gburugburu tutu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere, ikuku bidoro ife site na ndịda. Nʼụbọchị nke abụọ ya, anyị rutere Pọteọlị.
14 Ondje nađosmo braću koja nas zamoliše da ostanemo u njih sedam dana. Tako stigosmo u Rim.
Nʼebe a anyị chọpụtara ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nʼebe a, anyị rutere Rom.
15 Kada su tamošnja braća čula za nas, iziđoše nam u susret do Apijeva trga i Triju gostionica. Kad ih Pavao ugleda, zahvali Bogu i ohrabri se.
Mgbe ụmụnna anyị nọ nʼebe ahụ nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara zute anyị nʼụzọ Apiọs na nʼụlọ ndị Ije atọ. Mgbe Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma bụrụ onye a gbara ume.
16 A kad uđosmo u Rim, Pavlu su dopustili stanovati zasebno, zajedno s vojnikom koji ga je čuvao.
Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche.
17 Nakon tri dana sazva on židovske prvake. Kad se sabraše, reče im: “Ja, braćo, ne učinih ništa protiv naroda ni običaja otačkih, a ipak me okovana u Jeruzalemu predadoše u ruke Rimljana.
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom.
18 Oni me nakon istrage htjedoše pustiti jer nije na meni bilo ništa čime bih bio zaslužio smrt.
Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ.
19 Kako se Židovi tome opriješe, bio sam prisiljen prizvati se na cara; ne dakle stoga što bih imao bilo za što tužiti svoj narod.
Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m.
20 S toga dakle razloga zamolih vidjeti vas i obratiti vam se jer zbog nade Izraelove nosim ove verige.”
Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.”
21 Oni mu odvrate: “Mi o tebi nismo primili nikakva pisma iz Judeje niti nam je tko od pristigle braće o tebi što zlo javio ili rekao.
Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị.
22 Nego htjeli bismo od tebe čuti što misliš jer o toj sljedbi znamo samo da joj se posvuda proturječi.”
Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.”
23 Nato urekoše dan pa dođoše mnogi k njemu u stan. Izlagao im je i svjedočio o kraljevstvu Božjemu te ih od jutra do večeri iz Mojsijeva Zakona i Proroka uvjeravao o Isusu.
Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị.
24 I jedne uvjeriše njegove riječi, a drugi nisu vjerovali.
Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha.
25 Nesložni tako među sobom, stadoše se razilaziti kadli im Pavao reče još jednu riječ: “Lijepo Duh Sveti po Izaiji proroku reče ocima vašim:
Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha,
26 Idi k tomu narodu i reci mu: Slušat ćete, slušati - i nećete razumjeti; gledat ćete, gledati - i nećete vidjeti!
“‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.”
27 Jer usalilo se srce naroda ovoga: uši začepiše, oči zatvoriše da očima ne vide, ušima ne čuju, srcem ne razumiju te se ne obrate pa ih izliječim.
Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’
28 Neka vam je dakle svima znano: poganima je poslano ovo spasenje Božje; oni će poslušati!”
“Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.”
Mgbe o kwusiri nke a, ndị Juu ahụ lara na-arụrịta ụka nke ukwu nʼetiti onwe ha.
30 Pavao osta pune dvije godine u svom unajmljenom stanu gdje je primao sve koji su dolazili k njemu,
O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya,
31 propovijedao kraljevstvo Božje i naučavao o Gospodinu Isusu Kristu sa svom slobodom, nesmetano.
o ji mkwuwa okwu na-ekwusa ihe banyere alaeze Chineke na-akụzikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọbụla gbalịrị igbochi ya.

< Djela apostolska 28 >