< Ϯ⳰ⲀⲠⲞⲔⲀⲖⲨⳘⲮⲒⲤ 20 >
1 ⲁ̅ ⲁⲓⲛⲁⲩ ⲉⲩⲁⲅⲅⲉⲗⲟⲥ ⲉϥⲛⲏⲩ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲛ ⲧⲡⲉ ⲉⲣⲉⲛϣⲟϣⲧ ⲙⲡⲛⲟⲩⲛ ⲛⲧⲟⲟⲧϥ ⲙⲛ ⲟⲩⲛⲟϭ ⲛϩⲁⲗⲩⲥⲓⲥ ϩⲛ ⲧⲉϥϭⲓϫ (Abyssos )
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. (Abyssos )
2 ⲃ̅ ⲁⲩⲱ ⲁϥⲁⲙⲁϩⲧⲉ ⲙⲡⲉⲇⲣⲁⲕⲱⲛ ⲡϩⲟϥ ⲛⲁⲣⲭⲁⲓⲟⲥ ⲉⲧⲉⲡⲁⲓ ⲡⲉ ⲡⲇⲓⲁⲃⲟⲗⲟⲥ ⲡⲥⲁⲧⲁⲛⲁⲥ ⲁⲩⲱ ⲁϥⲙⲟⲣϥ ⲛϣⲟ ⲛⲣⲟⲙⲡⲉ
O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ.
3 ⲅ̅ ⲁϥⲛⲟϫϥ ⲉⲡⲉⲥⲏⲧ ⲉⲡⲛⲟⲩⲛ ⲁϥϣⲧⲁⲙ ⲉⲣⲱϥ ⲁⲩⲱ ⲁϥⲧⲱⲱⲃⲉ ⲉⲣⲱϥ ϫⲉ ⲛⲛⲉϥⲡⲗⲁⲛⲁ ϭⲉ ⲛⲛϩⲉⲑⲛⲟⲥ ϣⲁⲛⲧⲉⲧϣⲟ ⲛⲣⲟⲙⲡⲉ ϫⲱⲕ ⲉⲃⲟⲗ ⲙⲛⲛⲥⲁ ⲛⲁⲓ ⲥⲉⲛⲁⲃⲟⲗϥ ⲉⲃⲟⲗ ⲛⲕⲉⲕⲟⲩⲓ ⲛⲟⲩⲟⲉⲓϣ (Abyssos )
Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge. (Abyssos )
4 ⲇ̅ ⲙⲛⲛⲥⲁ ⲛⲁⲓ ⲁⲓⲛⲁⲩ ⲉϩⲉⲛⲑⲣⲟⲛⲟⲥ ⲁⲩⲱ ⲁⲩϩⲙⲟⲟⲥ ϩⲓϫⲱⲟⲩ ⲁⲩϯ ⲛⲁⲩ ⲛⲟⲩϩⲁⲡ ⲁⲩⲱ ⲁⲓⲛⲁⲩ ⲉⲧⲉⲯⲩⲭⲏ ⲛⲛⲉⲛⲧⲁⲩⲙⲟⲟⲩⲧⲟⲩ ⲉⲧⲃⲉ ⲙⲛⲧⲙⲛⲧⲣⲉ ⲛⲓⲥ ⲁⲩⲱ ⲉⲧⲃⲉ ⲡϣⲁϫⲉ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲁⲩⲱ ⲛⲉⲧⲉⲙⲡⲟⲩⲱϣⲧ ⲙⲡⲉⲑⲏⲣⲓⲟⲛ ⲙⲛ ⲧⲉϥϩⲓⲕⲱⲛ ⲁⲩⲱ ⲛⲉⲧⲉⲙⲡⲟⲩϫⲓ ⲙⲡⲉϥⲙⲁⲉⲓⲛ ⲉϫⲛ ⲧⲉⲩⲧⲉϩⲛⲉ ⲏ ⲉϫⲛ ⲛⲉⲩϭⲓϫ ⲁⲩⲱⲛϩ ⲁⲩⲱ ⲁⲩⲣ ⲣⲣⲟ ⲙⲛ ⲡⲉⲭⲣⲥ ⲛϣⲟ ⲛⲣⲟⲙⲡⲉ
Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ.
5 ⲉ̅ ⲡⲕⲉⲥⲉⲡⲏ ⲇⲉ ⲛⲛⲉⲧⲙⲟⲟⲩⲧ ⲙⲡⲟⲩⲱⲛϩ ϣⲁⲛⲧⲟⲩϫⲱⲕ ⲉⲃⲟⲗ ⲛϭⲓ ⲧϣⲟ ⲛⲣⲟⲙⲡⲉ ⲧⲁⲓ ⲧⲉ ⲧϣⲟⲣⲡ ⲛⲁⲛⲁⲥⲧⲁⲥⲓⲥ
Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.
6 ⲋ̅ ⲛⲁⲓⲁⲧϥ ⲁⲩⲱ ϥⲟⲩⲁⲁⲃ ⲛϭⲓ ⲡⲉⲧⲉⲟⲩⲛⲧϥ ⲟⲩⲙⲉⲣⲟⲥ ϩⲛ ⲧϣⲟⲣⲡ ⲛⲁⲛⲁⲥⲧⲁⲥⲓⲥ ϫⲉ ⲙⲛⲧⲉ ⲡⲙⲉϩⲥⲛⲁⲩ ⲙⲙⲟⲩ ⲉⲝⲟⲩⲥⲓⲁ ⲉϩⲣⲁⲓ ⲉϫⲙ ⲡⲁⲓ ⲁⲗⲗⲁ ⲉⲩⲛⲁϣⲱⲡⲉ ⲛⲟⲩⲏⲏⲃ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲙⲛ ⲡⲉϥⲭⲣⲥ ⲁⲩⲱ ⲥⲉⲛⲁⲣ ⲣⲣⲟ ⲛⲙⲙⲁϥ ⲛⲧϣⲟ ⲛⲣⲟⲙⲡⲉ
Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.
7 ⲍ̅ ϩⲟⲧⲁⲛ ⲇⲉ ⲉⲩϣⲁⲛϫⲱⲕ ⲉⲃⲟⲗ ⲛϭⲓ ⲧϣⲟ ⲛⲣⲟⲙⲡⲉ ⲥⲉⲛⲁⲃⲱⲗ ⲉⲃⲟⲗ ⲙⲡⲥⲁⲧⲁⲛⲁⲥ ϩⲛ ϩⲉⲛⲙⲣⲣⲉ
Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta.
8 ⲏ̅ ⲛϥⲉⲓ ⲉⲃⲟⲗ ⲉⲡⲗⲁⲛⲁ ⲛⲧⲟⲓⲕⲟⲩⲙⲉⲛⲏ ⲉⲥⲱⲟⲩϩ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲛⲅⲱⲅ ⲙⲛ ⲙⲁⲅⲱⲅ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲙ ⲡⲉϥⲧⲟⲟⲩ ⲛⲕⲟⲟϩ ⲙⲡⲕⲁϩ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲉⲡⲡⲟⲗⲉⲙⲟⲥ ⲉⲩⲟ ⲛⲑⲉ ⲙⲡϣⲱ ⲛⲑⲁⲗⲁⲥⲥⲁ
Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.
9 ⲑ̅ ⲁⲩⲱ ⲁⲩⲉⲓ ⲉϩⲣⲁⲓ ⲉϫⲙ ⲡⲡⲱϫϭ ⲙⲡⲕⲁϩ ⲁⲩⲕⲱⲧⲉ ⲉⲧⲡⲁⲣⲉⲙⲃⲟⲗⲏ ⲛⲛⲉⲧⲟⲩⲁⲁⲃ ⲙⲛ ⲧⲡⲟⲗⲓⲥ ⲙⲡⲙⲉⲣⲓⲧ ⲁⲩⲕⲱϩⲧ ⲉⲓ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲛ ⲧⲡⲉ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲙ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲁⲩⲱ ⲁϥⲟⲩⲟⲙⲟⲩ
Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.
10 ⲓ̅ ⲡⲇⲓⲁⲃⲟⲗⲟⲥ ⲇⲉ ⲉⲧⲡⲗⲁⲛⲁ ⲙⲙⲟⲟⲩ ⲁⲩⲛⲟϫϥ ⲉⲧⲗⲓⲙⲛⲏ ⲛⲕⲱϩⲧ ϩⲓ ⲑⲏⲛ ⲡⲙⲁ ⲛⲧⲁⲩⲛⲟⲩϫ ⲙⲡⲉⲑⲏⲣⲓⲟⲛ ⲉⲣⲟϥ ⲙⲛ ⲡⲉⲡⲣⲟⲫⲏⲧⲏⲥ ⲛⲛⲟⲩϫ ⲁⲩⲱ ⲥⲉⲛⲁⲃⲁⲥⲁⲛⲓⲍⲉ ⲙⲙⲟⲟⲩ ⲛⲧⲉⲩϣⲏ ⲙⲛ ⲡⲉϩⲟⲟⲩ ⲛⲥⲉⲧⲙϫⲓ ⲙⲧⲟⲛ ϣⲁ ⲉⲛⲉϩ (aiōn , Limnē Pyr )
Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn , Limnē Pyr )
11 ⲓ̅ⲁ̅ ⲁⲓⲛⲁⲩ ⲉⲩⲛⲟϭ ⲛⲑⲣⲟⲛⲟⲥ ⲉϥⲟⲩⲟⲃϣ ⲁⲩⲱ ⲡⲉⲧϩⲙⲟⲟⲥ ϩⲓϫⲱϥ ⲁⲡⲕⲁϩ ⲡⲱⲧ ⲙⲛ ⲧⲡⲉ ϩⲁ ⲧⲉϥϩⲏ ⲁⲩⲱ ⲙⲡⲟⲩϩⲉ ⲉⲙⲁ ⲛⲁⲩ
Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha.
12 ⲓ̅ⲃ̅ ⲁⲩⲱ ⲁⲓⲛⲁⲩ ⲉⲛⲉⲧⲙⲟⲟⲩⲧ ⲛⲛⲟϭ ⲙⲛ ⲛⲕⲟⲩⲓ ⲉⲩⲁϩⲉⲣⲁⲧⲟⲩ ⲙⲡⲙⲧⲟ ⲉⲃⲟⲗ ⲙⲡⲉⲑⲣⲟⲛⲟⲥ ⲁⲩⲡⲉⲣϣ ϩⲉⲛϫⲱⲱⲙⲉ ⲉⲃⲟⲗ ⲁⲩⲱ ⲁⲩⲟⲩⲱⲛ ⲛⲕⲉϫⲱⲱⲙⲉ ⲉⲡⲁ ⲡⲱⲛϩ ⲡⲉ ⲁⲩⲕⲣⲓⲛⲉ ⲛⲛⲉⲧⲙⲟⲟⲩⲧ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲛ ⲛⲉⲧⲥⲏϩ ⲉⲛϫⲱⲱⲙⲉ ⲕⲁⲧⲁ ⲛⲉⲩϩⲃⲏⲩⲉ
Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.
13 ⲓ̅ⲅ̅ ⲁⲑⲁⲗⲁⲥⲥⲁ ϯ ⲛⲛⲉⲧⲙⲟⲟⲩⲧ ⲉⲧⲛϩⲏⲧⲥ ⲁⲩⲱ ⲡⲛⲟⲩⲛ ⲙⲛ ⲁⲙⲛⲧⲉ ⲁⲩϯ ⲛⲛⲉⲧⲙⲟⲟⲩⲧ ⲉⲧⲛϩⲏⲧⲟⲩ ⲁⲩⲱ ⲁⲩⲕⲣⲓⲛⲉ ⲙⲡⲟⲩⲁ ⲡⲟⲩⲁ ⲕⲁⲧⲁ ⲛⲉⲩϩⲃⲏⲩⲉ (Hadēs )
Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. (Hadēs )
14 ⲓ̅ⲇ̅ ⲁⲩⲱ ⲡⲛⲟⲩⲛ ⲙⲛ ⲁⲙⲛⲧⲉ ⲁⲩⲛⲟϫⲟⲩ ⲉϩⲣⲁⲓ ⲉⲧⲗⲓⲙⲛⲏ ⲛⲥⲁⲧⲉ ⲡⲁⲓ ⲡⲉ ⲡⲙⲟⲩ ⲙⲙⲉϩⲥⲛⲁⲩ ⲉⲧⲉⲧⲗⲓⲙⲛⲏ ⲧⲉ ⲛⲥⲁⲧⲉ (Hadēs , Limnē Pyr )
Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. (Hadēs , Limnē Pyr )
15 ⲓ̅ⲉ̅ ⲁⲩⲱ ⲡⲉⲧⲉⲙⲡⲟⲩϩⲉ ⲉⲣⲟϥ ⲉϥⲥⲏϩ ϩⲙ ⲡϫⲱⲱⲙⲉ ⲙⲡⲱⲛϩ ⲁⲩⲛⲟϫⲟⲩ ⲉⲧⲗⲓⲙⲛⲏ ⲛⲥⲁⲧⲉ (Limnē Pyr )
Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ. (Limnē Pyr )