< ⲚⲒⲔⲞⲢⲒⲚⲐⲒⲞⲤ Ⲃ ̅ 1 >
1 ⲁ̅ ⲡⲁⲩⲗⲟⲥ ⲡⲁⲡⲟⲥⲧⲟⲗⲟⲥ ⲙⲡⲉⲭⲥ ⲓⲏⲥ ϩⲓⲧⲙ ⲡⲟⲩⲱϣ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲙⲛ ⲧⲓⲙⲟⲑⲉⲟⲥ ⲡⲥⲟⲛ ⲉⲩⲥϩⲁⲓ ⲛⲧⲉⲕⲕⲗⲏⲥⲓⲁ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲧⲁⲓ ⲉⲧϣⲟⲟⲡ ϩⲛ ⲕⲟⲣⲓⲛⲑⲟⲥ ⲙⲛ ⲛⲉⲧⲟⲩⲁⲁⲃ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⲉⲧϣⲟⲟⲡ ϩⲛ ⲧⲁⲭⲁⲓⲁ ⲧⲏⲣⲥ
Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke, Na-edegara chọọchị Chineke nke dị na Kọrint, na ndị nsọ niile ndị nọ nʼala Akaịa akwụkwọ:
2 ⲃ̅ ⲧⲉⲭⲁⲣⲓⲥ ⲛⲏⲧⲛ ⲙⲛ ϯⲣⲏⲛⲏ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲙ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲡⲉⲛⲉⲓⲱⲧ ⲁⲩⲱ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲙ ⲡϫⲟⲉⲓⲥ ⲓⲏⲥ ⲡⲉⲭⲥ
Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
3 ⲅ̅ ϥⲥⲙⲁⲙⲁⲁⲧ ⲛϭⲓ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲁⲩⲱ ⲡⲉⲓⲱⲧ ⲙⲡⲉⲛϫⲟⲉⲓⲥ ⲓⲏⲥ ⲡⲉⲭⲥ ⲡⲉⲓⲱⲧ ⲛⲙⲙⲛⲧϣⲁⲛϩⲧⲏϥ ⲁⲩⲱ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲛⲥⲟⲡⲥ ⲛⲓⲙ
Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile.
4 ⲇ̅ ⲡⲉⲧⲥⲟⲡⲥ ⲙⲙⲟⲛ ϩⲛ ⲛⲉⲛⲑⲗⲓⲯⲓⲥ ⲧⲏⲣⲟⲩ ϫⲉ ⲉⲛⲉϣϭⲙϭⲟⲙ ϩⲱⲱⲛ ⲉⲥⲉⲡⲥ ⲛⲉⲧϩⲛ ⲑⲗⲓⲯⲓⲥ ⲛⲓⲙ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲙ ⲡⲥⲟⲡⲥ ⲉⲧⲟⲩⲥⲟⲡⲥ ⲙⲙⲟⲛ ⲙⲙⲟϥ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲙ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ
Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke.
5 ⲉ̅ ϫⲉ ⲛⲑⲉ ⲉⲧⲉⲣⲉⲙⲙⲟⲕϩⲥ ⲙⲡⲉⲭⲥ ⲟϣ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲉⲣⲟⲛ ⲧⲁⲓ ⲟⲛ ⲧⲉ ⲑⲉ ϩⲓⲧⲙ ⲡⲉⲭⲥ ϥⲣϩⲟⲩⲟ ⲛϭⲓ ⲡⲉⲛⲕⲉⲥⲟⲡⲥ
Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst.
6 ⲋ̅ ⲉⲓⲧⲉ ⲇⲉ ⲥⲉⲑⲗⲓⲃⲉ ⲙⲙⲟⲛ ⲉⲩⲑⲗⲓⲃⲉ ⲙⲙⲟⲛ ϩⲁ ⲡⲉⲧⲛⲥⲟⲡⲥ ⲙⲛ ⲡⲉⲧⲛⲟⲩϫⲁⲓ ⲉⲓⲧⲉ ⲥⲉⲥⲟⲡⲥ ⲙⲙⲟⲛ ⲉⲩⲥⲟⲡⲥ ⲙⲙⲟⲛ ϩⲁ ⲡⲉⲧⲛⲥⲟⲡⲥ ⲡⲁⲓ ⲉⲧⲉⲛⲉⲣⲅⲓ ϩⲛ ⲑⲩⲡⲟⲙⲟⲛⲏ ⲛⲛⲓϩⲓⲥⲉ ⲛⲟⲩⲱⲧ ⲛⲁⲓ ϩⲱⲱⲛ ⲉⲧⲛϣⲱⲡ ⲙⲙⲟⲟⲩ ⲁⲩⲱ ⲧⲉⲛϩⲉⲗⲡⲓⲥ ⲧⲁϫⲣⲏⲩ ϩⲁⲣⲱⲧⲛ
Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.
7 ⲍ̅ ⲉⲛⲥⲟⲟⲩⲛ ⲇⲉ ⲛⲑⲉ ⲛⲧⲉⲧⲛ ϩⲉⲛⲕⲟⲓⲛⲱⲛⲟⲥ ⲉⲛⲉⲙⲕⲟⲟϩ ⲧⲁⲓ ⲟⲛ ⲧⲉ ⲑⲉ ⲙⲡⲕⲉⲥⲟⲡⲥ
Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.
8 ⲏ̅ ⲛⲧⲛⲟⲩⲱϣ ⲅⲁⲣ ⲁⲛ ⲉⲧⲣⲉⲧⲛⲣⲁⲧⲥⲟⲟⲩⲛ ⲛⲉⲥⲛⲏⲩ ⲛⲧⲉⲛⲑⲗⲓⲯⲓⲥ ⲧⲁⲓ ⲉⲛⲧⲁⲥϣⲱⲡⲉ ⲙⲙⲟⲛ ϩⲛ ⲧⲁⲥⲓⲁ ϫⲉ ⲁⲩⲃⲁⲣⲓ ⲙⲙⲟⲛ ⲛϩⲟⲩⲟ ⲡⲁⲣⲁⲧⲉⲛϭⲟⲙ ϩⲱⲥⲧⲉ ⲉⲧⲣ ⲉⲛⲟⲩⲉ ⲉⲡⲕⲉⲱⲛϩ
Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ.
9 ⲑ̅ ⲁⲗⲗⲁ ⲁⲛⲟⲛ ϩⲣⲁⲓ ⲛϩⲏⲧⲛ ⲁⲛⲕⲁ ⲡⲙⲟⲩ ϩⲁ ⲉⲓⲁⲧⲛ ϫⲉⲕⲁⲥ ⲉⲛⲛⲉⲛϣⲱⲡⲉ ⲉⲣⲉϩⲧⲏⲛ ⲕⲏ ⲉⲣⲟⲛ ⲁⲗⲗⲁ ⲉⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲡⲁⲓ ⲉⲧⲧⲟⲩⲛⲟⲥ ⲛⲛⲣⲉϥⲙⲟⲟⲩⲧ
Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie.
10 ⲓ̅ ⲡⲁⲓ ⲉⲛⲧⲁϥⲧⲟⲩϫⲟⲛ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲙ ⲡⲉⲓⲙⲟⲩ ⲛⲧⲉⲉⲓϭⲟⲧ ⲁⲩⲱ ⲟⲛ ϥⲛⲁⲧⲟⲩϫⲟⲛ ⲡⲁⲓ ⲉⲛⲧⲁⲛⲛⲁϩⲧⲉ ⲉⲣⲟϥ ϫⲉ ⲉⲧⲉⲓ ⲟⲛ ϥⲛⲁⲧⲟⲩϫⲟⲛ
Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị,
11 ⲓ̅ⲁ̅ ⲉⲧⲉⲧⲛⲟ ⲛϣⲃⲣⲣϩⲱⲃ ϩⲁⲣⲟⲛ ϩⲙ ⲡⲥⲟⲡⲥ ϫⲉⲕⲁⲥ ϩⲙ ⲡϩⲟ ⲛϩⲁϩ ⲡⲉϩⲙⲟⲧ ⲉⲛⲧⲁϥⲡⲱϩ ϣⲁⲣⲟⲛ ⲉⲩⲉϣⲡϩⲙⲟⲧ ϩⲁⲣⲟϥ ϩⲓⲧⲛ ϩⲁϩ ϩⲁⲣⲟⲛ
dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị.
12 ⲓ̅ⲃ̅ ⲡⲉⲛϣⲟⲩϣⲟⲩ ⲅⲁⲣ ⲡⲁⲓ ⲡⲉ ⲧⲙⲛⲧⲙⲛⲧⲣⲉ ⲛⲧⲉⲛⲥⲩⲛⲓⲇⲏⲥⲓⲥ ϫⲉ ϩⲣⲁⲓ ϩⲛ ⲟⲩⲟⲩⲟⲡ ⲙⲛ ⲟⲩⲧⲃⲃⲟ ⲛⲧⲉ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ϩⲛ ⲟⲩⲥⲟⲫⲓⲁ ⲁⲛ ⲛⲥⲁⲣⲕⲓⲕⲟⲛ ⲁⲗⲗⲁ ϩⲛ ⲟⲩⲭⲁⲣⲓⲥ ⲛⲧⲉ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲁⲛⲙⲟⲟϣⲉ ϩⲙ ⲡⲕⲟⲥⲙⲟⲥ ⲛϩⲟⲩⲟ ⲇⲉ ϩⲁⲧⲉⲧⲏⲩⲧⲛ
Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ.
13 ⲓ̅ⲅ̅ ⲛϩⲉⲛⲕⲟⲟⲩⲉ ⲅⲁⲣ ⲁⲛ ⲛⲉϯⲥϩⲁⲓ ⲙⲙⲟⲟⲩ ⲛⲏⲧⲛ ⲁⲗⲗⲁ ⲛⲉⲧⲉⲧⲛⲱϣ ⲙⲙⲟⲟⲩ ⲛⲉ ⲁⲩⲱ ⲛⲉⲧⲉⲧⲛⲥⲟⲟⲩⲛ ⲙⲙⲟⲟⲩ ϯϩⲉⲗⲡⲓⲍⲉ ⲇⲉ ϫⲉ ⲧⲉⲧⲛⲁⲥⲟⲟⲩⲛ ϣⲁⲃⲟⲗ
Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma.
14 ⲓ̅ⲇ̅ ⲕⲁⲧⲁ ⲑⲉ ⲟⲛ ⲉⲛⲧⲁⲧⲉⲧⲛⲥⲟⲩⲱⲛⲛ ⲁⲡⲟ ⲙⲉⲣⲟⲩⲥ ϫⲉ ⲁⲛⲟⲛ ⲡⲉⲧⲛϣⲟⲩϣⲟⲩ ⲕⲁⲧⲁ ⲑⲉ ⲉⲛⲧⲉⲧⲛⲡⲱⲛ ϩⲙ ⲡⲉϩⲟⲟⲩ ⲙⲡⲉⲛϫⲟⲉⲓⲥ ⲓⲏⲥ
Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs.
15 ⲓ̅ⲉ̅ ⲁⲩⲱ ϩⲙ ⲡⲉⲉⲓⲛⲁϩⲧⲉ ⲛⲉⲓⲟⲩⲱϣ ⲛϣⲟⲣⲡ ⲉⲉⲓ ϣⲁⲣⲱⲧⲛ ϫⲉ ⲉⲧⲉⲧⲛⲉϫⲓ ⲙⲡⲙⲉϩ ⲥⲛⲁⲩ ⲛϩⲙⲟⲧ
Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ.
16 ⲓ̅ⲋ̅ ⲁⲩⲱ ⲉⲃⲱⲕ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲉⲧⲏⲩⲧⲛ ⲉⲧⲙⲁⲕⲉⲇⲟⲛⲓⲁ ⲁⲩⲱ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲛ ⲧⲙⲁⲕⲉⲇⲟⲛⲓⲁ ⲉⲉⲓ ϣⲁⲣⲱⲧⲛ ⲛⲥⲉⲑⲡⲟⲓ ϩⲓⲧⲉⲧⲏⲩⲧⲛ ⲉϯⲟⲩⲇⲁⲓⲁ
Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa.
17 ⲓ̅ⲍ̅ ⲡⲁⲓ ϭⲉ ⲉⲁⲓⲟⲩⲁϣϥ ⲙⲏⲧⲓ ⲁⲓⲭⲣⲱ ϩⲛ ⲟⲩⲁⲥⲁⲓ ⲏ ⲛⲉϯⲙⲉⲉⲩⲉ ⲉⲣⲟⲟⲩ ⲙⲏ ⲉⲉⲓⲙⲉⲉⲩⲉ ⲉⲣⲟⲟⲩ ⲕⲁⲧⲁ ⲥⲁⲣⲝ ϫⲉⲕⲁⲥ ⲉϥⲉϣⲱⲡⲉ ⲛⲧⲟⲟⲧ ⲛϭⲓ ⲡⲥⲉ ⲛⲥⲉ ⲁⲩⲱ ⲡⲙⲙⲟⲛ ⲛⲙⲙⲟⲛ
E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ?
18 ⲓ̅ⲏ̅ ⲟⲩⲡⲓⲥⲧⲟⲥ ⲇⲉ ⲡⲉ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ϫⲉ ⲡⲉⲛϣⲁϫⲉ ⲉⲛⲧⲁϥⲡⲱϩ ϣⲁⲣⲱⲧⲛ ⲛⲟⲩⲥⲉ ⲁⲛ ⲡⲉ ⲙⲛ ⲟⲩⲙⲙⲟⲛ
Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.”
19 ⲓ̅ⲑ̅ ⲡϣⲏⲣⲉ ⲅⲁⲣ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲓⲏⲥ ⲡⲉⲭⲥ ⲡⲉⲛⲧⲁⲩⲧⲁϣⲉⲟⲉⲓϣ ⲙⲙⲟϥ ⲛϩⲏⲧⲧⲏⲩⲧⲛ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲟⲟⲧⲛ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓⲧⲟⲟⲧ ⲙⲛ ⲥⲓⲗⲟⲩⲁⲛⲟⲥ ⲙⲛ ⲧⲓⲙⲟⲑⲉⲟⲥ ⲙⲡϥϣⲱⲡⲉ ⲛⲥⲉ ⲁⲩⲱ ⲙⲙⲟⲛ ⲁⲗⲗⲁ ⲥⲉ ⲡⲉⲛⲧⲁϥϣⲱⲡⲉ ⲛϩⲏⲧϥ
Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.”
20 ⲕ̅ ⲛⲉⲣⲏⲧ ⲅⲁⲣ ⲧⲏⲣⲟⲩ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲥⲉ ⲡⲉⲧϣⲱⲡⲉ ⲛϩⲏⲧϥ ⲉⲧⲃⲉ ⲡⲁⲓ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓ ⲧⲟⲟⲧϥ ⲡⲉ ⲡϩⲁⲙⲏⲛ ⲉⲡϯ ⲉⲟⲟⲩ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲉⲃⲟⲗ ϩⲓ ⲧⲟⲟⲧⲛ
Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.
21 ⲕ̅ⲁ̅ ⲡⲉⲧⲧⲁϫⲣⲟ ⲇⲉ ⲙⲙⲟⲛ ⲛⲙⲙⲏⲧⲛ ⲉϩⲟⲩⲛ ⲉⲡⲉⲭⲥ ⲁⲩⲱ ⲡⲉⲛⲧⲁϥⲧⲁϩⲥⲛ ⲡⲉ ⲡⲛⲟⲩⲧⲉ
Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ.
22 ⲕ̅ⲃ̅ ⲡⲁⲓ ⲉⲛⲧⲁϥⲥⲫⲣⲁⲅⲓⲍⲉ ⲙⲙⲟⲛ ⲁⲩⲱ ⲉⲛⲧⲁϥϯ ⲛⲁⲛ ⲙⲡⲁⲣⲏⲃ ⲙⲡⲉ ⲡⲛⲁ ϩⲣⲁⲓ ϩⲛ ⲛⲉⲛϩⲏⲧ
Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
23 ⲕ̅ⲅ̅ ⲁⲛⲟⲕ ⲇⲉ ϯⲉⲡⲓⲕⲁⲗⲉⲓ ⲙⲡⲛⲟⲩⲧⲉ ⲙⲙⲛⲧⲣⲉ ⲉϫⲛ ⲧⲁⲯⲩⲭⲏ ϫⲉ ⲉⲓϯⲥⲟ ⲉⲣⲱⲧⲛ ⲙⲡⲓⲉⲓ ϭⲉ ⲉⲕⲟⲣⲓⲛⲑⲟⲥ
Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint.
24 ⲕ̅ⲇ̅ ⲟⲩⲭ ⲟⲧⲉⲓ ϫⲉ ⲉⲛⲟ ⲛϫⲟⲉⲓⲥ ⲉⲧⲉⲧⲛⲡⲓⲥⲧⲓⲥ ⲁⲗⲗⲁ ⲁⲛⲟⲛ ⲛⲉ ⲛⲉϣⲃⲣⲣϩⲱⲃ ⲙⲡⲉⲧⲛⲣⲁϣⲉ ⲉⲧⲉⲧⲛⲁϩⲉⲣⲁⲧ ⲧⲏⲩⲧⲛ ⲅⲁⲣ ϩⲛ ⲧⲡⲓⲥⲧⲓⲥ
Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm.