< Maliko 16 >

1 Palyapite Lyuŵa lya Kupumulila, che Maliamu jwa musi wa ku Magidala ni che Salome ni che Maliamu achikulugwe che Yakobo ŵagasumile mauta gakununjila. Ŵajawile kukuchipakasya chiilu chi Che Yesu.
Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ.
2 Kundaŵi pe, lyuŵa lyaandanda lya chijuma, lyuŵa lininkukopoka ŵaiche kumalembe.
Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ.
3 Nombewo paŵaliji mwitala ŵausyanaga, “Ana ŵaani juchakatugalambulile liganga pannango wa lilembe?”
Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?”
4 Nambo paŵalolechesye, ŵaliweni liganga lyekulungwa nnope lila lili lyegalambulile pambali.
Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ.
5 Pele ŵajinjile mwilembe, ŵammweni jwanchanda jwawete chiwalo cheswela ali atemi kundyo ni ŵasimosile nnope.
Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu.
6 Nambo jwanchanda jula ŵaasalile, “Kasinsimonga, nguimanyilila kuti nkunsosa Che Yesu jwa ku Nasaleti juŵammambile pa nsalaba. Nganapagwa pelepa, asyuchile. Nnole peuto paŵangoneche.
Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.
7 Nambo ŵanyamwe njaule nkasalile che Petulo ni ŵakulijiganya ŵane kuti, ‘Che Yesu alongolele kwaula ku Galilaya. Kweleko chinkaawone mpela iŵatite pakunsalila.’”
Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’”
8 Nipele, ŵatyosile kumalembe ali nkuutuka ni ali nkutetemela kwa lipamba ni kusimonga. Nganasala chindu chachili chose kwa mundu, pakuŵa ŵaliji nkogopanga kwannope.
Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
9 (note: The most reliable and earliest manuscripts do not include Mark 16:9-20.) Che Yesu paŵasyuchile, kundaŵi pe, lyuŵa lyaandanda lya chijuma ŵankopochele kaje che Maliamu jwa musi wa ku Magidala, ajula jwaŵankopwesye masoka nsano ni gaŵili.
(note: The most reliable and earliest manuscripts do not include Mark 16:9-20.) Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.
10 Che Maliamu jwa musi wa ku Magidala, ŵajawile ni kwasalila aŵala ŵakulijiganya ŵa Che Yesu, katema ko ŵanyawo ŵaliji nkulila ni kulila kwa malumbo.
Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ.
11 Nambo paŵapilikene kuti Che Yesu asyuchile ni kuti che Maliamu jwa musi wa Kumagidala ammweni, nganiŵakulupilila.
Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị.
12 Kanyuma kakwe Che Yesu ŵakopochele ŵakulijiganya ŵao ŵaŵili ŵaŵaliji nkwaula mmisinda. Ni ŵakulijiganya wo, kundanda nganiŵaamanyilila.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo.
13 Nombewo ŵausile kukwasalila ŵakulijiganya achinjao, ni ŵanyawo nombe, nganiŵakulupilila iyoyo.
Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị.
14 Mbesi jakwe Che Yesu ŵaakopochele ŵakulijiganya ŵao likumi ni jumo paŵaliji nkulya. Nipele, ŵaakalipile kwa ungakulupilila ni kukakatima kwa mitima jao, pakuŵa nganiŵakulupilila aŵala ŵaŵaweni ŵelewo pakumala kusyuka.
Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite.
15 Ni ŵaasalile, “Njaulanje pachilambo pose nkalalichile Ngani Jambone kwa ŵandu wose.
Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma.
16 Mundu jwalijose juchakulupilile ni kubatiswa, Akunnungu chankulupusye. Nambo mundu jwangakukulupilila, Akunnungu chanlamule.
Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe.
17 Ni wose ŵachakulupilile chaitendekanye imanyisyo yanti, chagakoposye masoka kwa liina lyangu ni kuŵecheta chiŵecheto chasambano.
Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche.
18 Akamulangaga majoka pane kung'wa chindu chachilichose chakuulaga, ngachaulaga. Chaachasajichila makono ŵakulwala, ni Akunnungu chiŵaalamye.”
Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.”
19 Nipele, Ambuje Che Yesu paŵamasile kuŵecheta nawo, ŵajigalikwe kwaula kwinani, ni ŵatemi kunkono wa kundyo wa Akunnungu.
Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke.
20 Nombe ŵakulijiganya ŵala, ŵajawile kukulalichila Ngani Jambone palipose. Ambuje ŵapangenye masengo pamo nawo ni kutendekanya imanyisyo yejinji, kulosya kuti utenga waukwagamba ŵelewo, uli isyene.
Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.

< Maliko 16 >