< Maliko 14 >
1 Gasigalile moŵa gaŵili likanaŵe lyuŵa lya chindimba cha Pasaka ni chindimba cha mikate jangataga amila. Achakulu ŵambopesi ni ŵakwiganya Malajisyo ŵaliji nkusosa itajile pakwakamula Che Yesu, mwangamanyilila jwalijose ni kummulaga.
Abalị abụọ tupu e mee Mmemme Ngabiga na mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ aghụghọ ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya.
2 Ŵatite, “Tukatenda yeleyo katema ka chindimba cha Pasaka, kuti ŵandu akatindiganya.”
Ma ha kwuru sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme a, ka ọgbaaghara ghara ịdị.”
3 Che Yesu ŵaliji ku Besania, kumusi ku che Simoni juŵaliji jwamatana. Paŵalyaga, ŵaiche jwankongwe jumo juŵaliji ni chuupa chachikolochekwe ni liganga lyalikuŵilanjikwa alabasta, chachili ni mauta ga kununjila nnope ga ntengo wekulungwa gagakuŵilanjikwa nado. Ŵakasile chuupa cho, ni kwajitila mauta Che Yesu mu ntwe.
Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.
4 Ŵandu ŵampepe ŵaŵaliji pamo ni Che Yesu yachimile achitiji, “Kwachichi akugajonanga mauta ga ntengo ga?
Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a?
5 Ngati akasumisye mauta ga ni kupata mbiya syasijinji ni kwapa ŵandu ŵakulaga!” Nipele ŵankalipile kwannope jwankongwe jo.
A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike.
6 Nambo Che Yesu ŵaasalile, “Munneche! Nkunsauchisya ichichi? Jweleju ambanganyichisye chindu chambone.
Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ.
7 Ŵandu ŵakulaga chaŵe ni ŵanyamwe moŵa gose, iŵaga nkusaka kwakamuchisya nkukombola. Nambo une nguŵa ni ŵanyamwe moŵa gose.
Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.
8 Jweleju atesile yakombwele. Alongolele kuchijitilila mauta chiilu changu, kuchiŵika chile, gakanaŵe masiiko gangu.
O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya.
9 Isyene ngunsalila, kwakulikose pachilambo pachijilalichikwe Ngani Jambone ni achi chatesile jwankongwe ju chichisalichikwe kwakwakumbuchila.”
Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”
10 Nipele, che Yuda Isikaliote, jumo jwa achinduna kumi na mbili ŵala, ŵajawile kwa achakulu ŵambopesi kuti akombole kwagalauka Che Yesu.
Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka.
11 Achakulu ŵambopesi ŵasangalele pakupikana ngani jo, ni ŵannanjile kuti chiŵaape mbiya. Nipele che Yuda ŵasosile lipesa lyambone lya kungalauka Che Yesu.
Mgbe ha nụrụ nke a, ha ṅụrịrị ọṅụ kwee ya nkwa inye ya ego. Site nʼụbọchị ahụ, o bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara ya nye ha.
12 Pa lyuŵa lya kutanda lya chindimba cha mikate jangataga Amila, katema paŵasikitaga mwanangondolo jwa Pasaka, ŵakulijiganya ŵao ŵausisye, “Ana kwapi nkusaka tukachikolochesye chakulya cha Pasaka?”
Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?”
13 Nipele Che Yesu ŵaatumile ŵaŵili mwa ŵakulijiganya ŵao ni ŵaasalile, “Njaule mu musi, ni mwelemo chinkasimane ni jwannume ali atwichile lulo lwa meesi. Nkankuye
O zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Gaanụ nʼime obodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya.
14 mpaka nyuumba jichakajinjile, nkansalile nsyene nyuumba jo, ‘Jwakwiganya akummusya, chili kwapi chuumba muchingalile chakulya cha Pasaka pamo ni ŵakulijiganya ŵangu?’
Ebe ọbụla ọ banyere, sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ọbịa a kwadoro m, ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri ngabiga?
15 Nombejo chakannosye chuumba chachikulungwa cha penani chachili chile ni kupambwa. Nkatukulumichisye mwelemo.”
Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.”
16 Ŵakulijiganya ŵala ŵatyosile, ni kwaula mmusi, ŵaisimene yose ili mpela iŵatite pakusalilwa ni Che Yesu. Nombewo ŵakulumisye chakulya cha Pasaka.
Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ.
17 Kuli kuswele, Che Yesu ŵaiche pamo ni ŵakulijiganya ŵao kumi na mbili.
Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa.
18 Paŵaliji aninkulya, Che Yesu ŵatite, “Isyene ngunsalila, jumo mwa ŵanyamwe jwakulya pamo ni une, chang'alauche.”
Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”
19 Pelepo ŵakulijiganya ŵao ŵatandite kusupuka, ni ŵatandite kummusya jumojumo, “Ana ndili une?”
Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
20 Che Yesu ŵaasalile, “Jumo mwa ŵanyamwe kumi na mbili, jwakupamba nkate wakwe mu mbale pamo ni une.
Ọ sịrị ha, “Ọ bụ otu onye nʼime mmadụ iri na abụọ a. Onye mụ na ya na-amanyekọta aka nʼime otu efere.
21 Pakuŵa Mwana jwa Mundu chawe mpela iilembekwe Mmalembelo Gamaswela nkati ŵelewo. Nambo chalaje mundu jwakungalauka Mwana jwa Mundu! Ikaliji mmbaya mundu jo ngakapagwe!”
Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e dere banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
22 Paŵalyaga, Che Yesu ŵajigele nkate, ŵatogolele Akunnungu, ŵaugaŵenye ni kwapa ŵakulijiganya ŵao, achitiji, “Mpochele, nlyanje, chelechi ni chiilu changu.”
Dị ka ha na-eri nri, o weere achịcha, nye ekele, nyawa ya, nye ha sị, “Rienụ ya, nke a bụ ahụ m.”
23 Sooni ŵajigele chikombe cha divai, ŵatogolele Akunnungu, ni kwapa, ni wose ŵang'welele divai mu chikombe cho.
Mgbe ahụ, o buuru iko, nye ekele bunyekwa ha. Ha niile ṅụrụ site nʼotu iko ahụ.
24 Che Yesu ŵaasalile, “Jeleji ni miasi jangu ja lilangano lya Akunnungu, jajikwitika kwa ligongo lya kwalechelesya ŵandu ŵajinji.
Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke a na-awụfu nʼihi ọtụtụ mmadụ.
25 Isyene ngunsalila, ngung'wa sooni divai mpaka lyuŵa paching'we divai jasambano mu Umwenye wa Akunnungu.”
Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, agaghị m aṅụ mmanya vaịnị ọzọ tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe m ga-aṅụ ya ọhụrụ nʼalaeze Chineke.”
26 Paŵamasile kwimba lujimbo lwa kwatogolela Akunnungu, ŵatyosile kwaula ku Chikwesya chachigumbele itela ya Miseituni.
Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
27 Che Yesu ŵaasalile ŵakulijiganya ŵao, “Ŵanyamwe wose chimmutuche ni kuuneka, pakuŵa Mmalembelo Gamaswela Akunnungu akuti, ‘Chinambulaje jwakuchinga, ni ngondolo sisipwilingane.’
Jisọs sịrị ha, “Unu niile ga-agbahapụ m, nʼihi na e dere ya otu a sị, “‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa.’
28 Nambo pachinjisyuka, chinjinnongolela kwaula ku Galilaya.”
Ma mgbe e mesịrị ka m si nʼọnwụ bilie, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
29 Che Petulo ŵansalile, “Atamuno annekaga wose, une ngangunneka ng'oo!”
Pita kwuru, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị, agaghị m eme otu a.”
30 Che Yesu ŵansalile che Petulo, “Isyene ngunsalila, chilo cha lelo chino, tambala jikanaŵe kutongola kaŵili, chimungane katatu kuti ngankuumanyilila.”
Jisọs sịrị ya, “Ịgwa gị eziokwu, nʼụbọchị taa, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
31 Nambo che Petulo ŵapundile kulimbila kuti, “Atamuno iŵaga ngusachilwa kuwa pamo nomwe ngangunneka ng'oo!” Ni ŵakulijiganya ŵane ŵala ŵaŵechete iyoyo peyo.
O kwusịrị ike sị, “Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta, aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha niile kwuru.
32 Ŵaichenje pa ngunda wa mwana waukuŵilanjikwa Getesemane, Che Yesu ŵaasalile ŵakulijiganya ŵao, “Ntamanje apano katema pangwaula kukwapopela Akunnungu.”
Ha pụrụ garuo ebe a na-akpọ Getsameni. Nʼebe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa kpee ekpere.”
33 Nipele ŵaajigele che Petulo ni che Yakobo ni che Yohana, ŵatandite kusupuka kwannope ni kupotekwa mu ntima.
Ọ kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn tinyere onwe ya. Ọ malitere inwe ihe mwute dị ukwuu nakwa obi ịlọ mmiri.
34 Ni ŵaasalile, “Ngupotekwa kwannope mu ntima ni chipwetesi chachikukombola kumulaga. Ntamanje apano ni kuŵa meeso pe.”
Ọ sịrị ha, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọdụnụ nʼebe a na-eche nche.”
35 Nipele ŵajawile mmbujo kanandi, ni ŵagwile manguuku, ŵapopelele kuti, yakombolekaga anajinjile mu katema ka malagasyo ko.
Ọ gatụrụ nʼihu daa nʼala kpee ekpere, sị, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ka oge awa ahụ gabiga ya.
36 Ni ŵatite, “Atati wangu, yose ikukomboleka kukwenu. Mundyochesye chikombe cha malagasyo chi. Ngaŵa mpela ingusaka une, nambo mpela inkusaka mmwe.”
O kwuru sị, “Abba, Nna, ị pụrụ ime ihe niile. Napụ m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
37 Nipele, ŵausile kwa ŵakulijiganya ŵatatu ŵala, ni ŵaasimene agonile. Ŵammusisye che Petulo, “Che Simoni, uli ngonile? Nganinkombola kutama meeso pe namose saa jimo?”
Ọ bịara hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Saimọn, ị na-arahụ ụra? Ọ bụ na ị nweghị ike iche nche otu awa?
38 Nipele ŵaasalile, “Ntamanje meeso pe ni kupopela kuti nkajinjila nkulinjikwa. Pakuŵa ntima ukusaka kupanganya yambone, nambo chiilu chilepetele.”
Nọrọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa. Mmụọ dị ike ma anụ ahụ adịghị ike.”
39 Ŵajawile sooni kukupopela achiujilaga maloŵe gagogo pego.
Ọ pụkwara ọzọ, gaa kpee ekpere, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
40 Paŵausile sooni, ŵasimene ŵakulijiganya ŵala ali agonile, ligongo ŵatopelwe ni lugono. Nombewo nganachimanyilila chakwajanga Che Yesu.
Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ nke ukwuu. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya.
41 Kaatatu paŵaichilile ŵaasalile, “Ana ndi chigonele ni kupumulila? Sambano njimuche! Nnole, saa jiiche Mwana jwa Mundu akutajikwa mmakono ga ŵandu ŵaali ni sambi.
Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
42 Njimuchanje, twende. Nnole mundu jwakung'alauka aŵandichile.”
Bilienụ! Ka anyị gawa! Lee, onye na-arara m nye nọ nso.”
43 Che Yesu paŵaliji nkuŵecheta, che Yuda, jumo jwa achinduna kumi na mbili, ŵaiche. Ŵaiche ni mpingo wa ŵandu ŵaŵatumikwe ni achakulu ŵambopesi ni ŵakwiganya Malajisyo ni achachekulu, ali ajigele mapanga ni imbonga.
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
44 Che Yuda jwakugalauka jula ŵapele ŵanyawo chimanyisyo chi, “Ajula juchingankomasye kwa kwanonyela ni jujojo junkunsaka. Munkamule ni kunlindilila.”
Ma onye na-arara ya nye, nyere ha rịị ihe ịrịbama sị, “Onye ahụ nke m ga-esutu ọnụ bụ ya; jidenụ ya, kpụrụnụ ya gawa, ma jidesiekwanụ ya ike.”
45 Che Yuda paŵaiche pe, papopo ŵajaulile Che Yesu ni kwasalila, “Jwakwiganya!” Nipele ŵankomasisye kwa unonyelo.
Ngwangwa o jekwuuru Jisọs, sị ya, “Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
46 Nipele ŵandu ŵala ŵankamwile Che Yesu ni kuntaŵa.
Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike.
47 Nambo jumo jwa ŵeŵala uŵajimi pelepo pamo ni Che Yesu, ŵasolomwele lipanga lyakwe ni kumputila kapolo jwa Jwambopesi Jwankulu, ni ŵankapile liwiwi.
Ma otu onye nʼime ndị guzo nʼebe ahụ, mịpụtara mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
48 Che Yesu ŵaasalile, “Ana nnyiche ni mapanga ni imbonga kukungamula mpela ila une ndili jwachiswamba?
Jisọs sịrị ha, “Abụ m onyendu nke ndị na-enupu isi nke mere unu ji were mma agha na mkpọ bịa ijide m?
49 Moŵa gose naliji pamo ni ŵanyamwe njijiganyaga pa Nyuumba ja Akunnungu, nganimungamula. Nambo sambano ngaleche Malembelo ga Akunnungu gamalile.”
Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.”
50 Pelepo ŵakulijiganya ŵao wose ŵannesile ni kulukunula.
Mgbe ahụ, ha niile hapụrụ ya gbalaga.
51 Jwapali jwanchanda jumo juŵaliji nkwakuya Che Yesu ali aliŵagele shuka pe. Ni ŵanyawo ŵasachile kunkamula,
Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya,
52 nambo jwanchanda jula ŵapelete, ŵalesile shuka jila ni kutila matakope.
ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga.
53 Nipele, ŵampeleche Che Yesu ku nyuumba ja Jwambopesi Jwankulu, kuŵasongangene achakulu ŵambopesi wose ni achachekulu ni ŵakwiganya Malajisyo.
Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ.
54 Che Petulo ŵankuiye Che Yesu kwakutalichila, ŵajinjile mu lutenje lwa nyuumba ja Jwambopesi Jwankulu. Pelepo ŵatemi pamo ni ŵakulindilila achijotelaga mooto.
Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
55 Nipele, achakulu ŵambopesi ni ŵandu ŵane wose pa Nkungulu pala ŵasosile umboni wa kummechetela Che Yesu kuti ŵaulaje, nambo wasoŵile.
Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
56 Ŵandu ŵajinji ŵaŵechetele Che Yesu umboni wa unami, nambo umboni wao nganiujilana.
Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
57 Nipele ŵane wajimi ni kuŵecheta umboni wa unami, achitiji,
Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
58 “Twampilikene ali nkuŵecheta, ‘Une chinajigumule Nyuumba ja Akunnungu ji, jajitaŵikwe ni ŵandu ni kutaŵa kwa moŵa gatatu jine jangataŵikwa ni ŵandu.’”
“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’”
59 Namose yeleyo, umboni wao nganiujilana.
Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
60 Nipele Jwambopesi Jwankulu ŵajimi paujo pa ŵandu ni kwausya Che Yesu, “Uli, ngankwanga chachili chose kwa wele umboni ŵakumbechetela wo?”
Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?”
61 Nambo Che Yesu ŵaliji jii, nganaŵecheta chachili chose. Jwambopesi Jwankulu ŵammusisye sooni, “Ana mmweji ni Kilisito, Mwana jwa Akunnungu Ŵakulu?”
Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla. Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
62 Che Yesu ŵajanjile, “Elo, ndili une. Sooni, chinchimmona Mwana jwa Mundu ali atemi kundyo kwa Akunnungu ŵa machili, ali nkwika mmaunde ga kwinani.”
Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
63 Jwambopesi Jwankulu paŵapilikene yeleyo ŵapapwile mwinjilo wakwe achitiji, “Ngatukusaka sooni umboni wine nkati mundu ju!
Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ?
64 Mumpilikene yatite pakwatukana Akunnungu! Ŵanyamwe nkuti uli?” Wose ŵanlamwile aulajikwe.
Unu anụla okwu nkwulu si ya nʼọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha niile mara ya ikpe sị, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
65 Ŵandu ŵane ŵatandite kunsunila mata Che Yesu, ni ŵansiŵilile mmeeso ni ŵamputile ni kunsalila, “Nlondole, nduni jwamputile!” Iyoyo peyo ŵakulindilila ŵanjigele ni kumputa majanda.
Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe.
66 Che Petulo paŵaliji chiŵela mu lutenje, ŵaiche mwali jumo mwa achikatumetume ŵa Jwambopesi Jwankulu.
Dịka Pita nọ nʼobi ahụ, otu nʼime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ.
67 Paŵammweni che Petulo achijotelaga mooto, ŵankolondolele ni kunsalila, “Nombe mmwejo iyoyo mwaliji pamo ni Che Yesu jwa ku Nasaleti.”
Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o leziri ya anya nke ọma, sị, “Ị bụ otu nʼime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret ahụ.”
68 Nambo che Petulo ŵakanile achitiji, “Ngangwamanya namose nganguchimanyilila chinkuŵecheta cho.” Nipele ŵakopweche paasa, papopo tambala jatongwele.
Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
69 Mwali jula ŵammweni sooni che Petulo, ŵatandite kwasalila ŵandu uŵajimi pelepo, “Mundu ju ali jumo jwao.”
Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.”
70 Nambo che Petulo ŵakanile sooni. Pangakaŵa, ŵandu uŵajimi pelepo ŵaasalile che Petulo, “Isyene mmwe ndi jumo jwao, pakuŵa mmwejo nombe ndi mundu jwa ku Galilaya.”
Ma ọ gọkwara agọ ọzọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.”
71 Nambo che Petulo ŵatandite kusala, “Nweseche iŵaga ngusala unami, ngulumbilila kuti, isyene ngangummanyilila mundu ju junkungamba.”
Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.”
72 Papopo pepo tambala jatongwele kaaŵili. Che Petulo ŵalikumbuchile liloŵe li Che Yesu liŵaasalile, “Tambala jikanaŵe kutongola kaŵili, chimungane katatu.” Nipele ŵaligwisisye paasi ni kulila.
Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.