< Luka 5 >

1 Lyuŵa limo Che Yesu ŵajimi mungulugulu litanda lya Genesaleti ni ŵandu ŵajinji ŵansyungwile ni kwaŵijikanya ali nkupilikanila liloŵe lya Akunnungu.
Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke.
2 Ŵasiweni ngalaŵa siŵili mungulugulu litanda ni ŵakukoka somba ali akopweche, ali nkusaula nyau syao.
Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ.
3 Che Yesu ŵajinjile mu ngalaŵa jimo jijaliji ji che Simoni, ŵaaŵendile che Simoni ajisojechesye mmeesi, kwakutalichila kanandi kutyochela mungulugulu litanda. Ŵaujiganyisye mpingo wa ŵandu ali atemi mu ngalaŵa.
Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe.
4 Paŵamasile kwiganya ŵaasalile che Simoni, “Njitute ngalaŵa kwaula pa meesi ga kwendesya mu litanda, nsiponye nyau syenu ni kukoka somba.”
Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.”
5 Che Simoni ŵajanjile kuti, “Ambuje, tulajilile kukoka somba chilo chose pangapata chindu, nambo pakuŵa nsaasile chinasiponye nyau.”
Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.”
6 Paŵapanganyisye yeleyo ŵakokwele somba syesijinji nnope ni nyau syao syatandite kukutuka.
Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị.
7 Ŵaaŵilasile achinjao ŵaŵaliji mu ngalaŵa jiine aichanje kukwakamusya. Ŵaiche ni ŵagumbesye somba ngalaŵa siŵili ni ngalaŵa syo syatandite kutitimila.
Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu.
8 Che Simoni Petulo paŵaiweni yeleyo, ŵatindiŵele paujo pa Che Yesu achitiji, “Ambuje, ntyoche paujo pangu pakuŵa uneji ndili mundu jwa sambi!”
Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.”
9 Che Simoni pamo ni achinjakwe ŵasimosile ligongo lya winji wa somba syapatile sila.
Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.
10 Iyoyo peyo che Yakobo ni che Yohana ŵanache ŵa che Sebedayo, ŵakukoka achinjakwe che Simoni nombewo ŵasimosile. Che Yesu ŵaasalile che Simoni, “Nkajogopa, kutandilila sambano chimme ŵakwaikanawo ŵandu kwa Ambuje.”
Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.”
11 Nipele paŵamasile kusiichisya ngalaŵa sila mungulugulu litanda, ŵalesile yose ni ŵakuiye Che Yesu.
Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.
12 Che Yesu paŵaliji musi umo mu misi ja kweleko, paliji ni jwannume juŵaliji ni matana chiilu chose, nombejo paŵammweni Che Yesu ŵagonile manguku ni kwachondelela aninkuti, “Ambuje mwasakaga muswejesye.”
Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
13 Che Yesu ŵajongwele nkono ni ŵankwaiye ni kuti, “Ngusaka, nswejele!” Papopo mundu jo ŵalamile matana.
Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya.
14 Nombe Che Yesu ŵansalile, “Munansalile mundu jwalijose nambo njaule nkalilosye kwa jwambopesi, nkatyosye mbopesi kwa ligongo lya kuswejela kwenu mpela iŵatite pakusala che Musa uŵe umboni kuti nnamile.”
O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
15 Nambo ngani syasikwagamba Che Yesu syapundile kwenela pana pose ni mipingo ja ŵandu jasongangene kukwapikanila ni kulamiswa ilwele yao.
Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa.
16 Nambo Che Yesu ŵalisapwile pajika pe ni kupopela.
Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.
17 Lyuŵa limo, Che Yesu ŵaliji nkwiganya, Mafalisayo ni ŵakwiganya malajisyo kutyochela misi jose ja ku Yudea ni ku Galilaya ni ku Yelusalemu ŵatemi papopo. Nipele machili ga Ambuje galiji pamo ni Che Yesu ligongo lya kwalamya ŵandu ŵa kulwala.
Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa.
18 Ŵaiche ŵandu ŵampepe ali anjigele mundu jwakutatala ali agonile mu chitagala, ŵalinjile kwajinjisya nkati achisakaga kwaŵika paujo pa Che Yesu.
Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya.
19 Nambo ŵalepele kwinjila nkati ligongo lya winji wa ŵandu. Nipele ŵakwesile pachanya nyuumba, ŵapowele chipagala ni kwatulusya pamo ni chitagala mbindikati ja ŵandu paujo pa Che Yesu.
Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.
20 Nombe Che Yesu paŵachiweni chikulupi chao ŵansalile, “Ambusanga, nlecheleswe sambi syenu.”
Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.”
21 Mafalisayo ni ŵakwiganya Malajisyo ŵatandite kuliusyanga achitiji, “Aŵa ni ŵaani ŵakwatukana Akunnungu? Ngapagwa mundu jwakukombola kulechelesya sambi ikaŵe Akunnungu pe!”
Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, “Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?”
22 Nambo Che Yesu ŵasimanyi ng'anisyo syao ni ŵausisye kuti “Kwachichi nkuliusya yeleyi mmitima jenu?
Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu?
23 Chaapi chili chakwepepala nnope, kusala, ‘Sambi syenu silecheleswe,’ pane kusala, ‘Njimuche njaule?’
Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije?
24 Nipele ngusaka mmanyilile kuti Mwana jwa Mundu akwete ulamusi wa kwalechelesya ŵandu sambi syao pachilambo pano.” Pelepo ŵansalile mundu jwakutatala jo, “Njimuche, njigale chitagala chenu, njaule kumangwenu.”
Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!”
25 Papopo mundu jula ŵajimwiche paujo pao ni kunyakula chitagala chao chiŵagonele ni kwaula kumangwao achakusyaga Akunnungu.
Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya.
26 Ŵanawose ŵasimosile ni kukamulwa ni lipamba, ŵaakusisye Akunnungu achitiji “Lelo tuiweni yakusimonjeka.”
Ihe ndị a juru onye ọbụla anya, ha tokwara Chineke. Oke egwu jupụtakwara ha nʼahụ, ha sịrị, “Anyị ahụla ihe ebube taa.”
27 Paŵamasile gelego, Che Yesu ŵakopweche paasa ni ŵammweni mundu jumpepe jwakukumbikanya nsongo liina lyakwe che Lawi ali atemi mu nyuumba ja kulipila nsongo ni Che Yesu ŵansalile, “Munguye une!”
Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.”
28 Nombe che Lawi ŵajimi, ŵalesile yose ni kwakuya.
Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya.
29 Che Lawi ŵaalaliche Che Yesu aiche kulya mu nyuumba jao. Mpingo wa ŵandu ŵakukumbikanya nsongo ni ŵandu ŵane ŵatemi kulya pamo nawo.
Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ.
30 Mafalisayo ni ŵakwiganya Malajisyo ŵaali mu mpingo wao ŵaalalamichile ŵakulijiganya ŵa Che Yesu aninkuti, “Kwachichi nkulya ni kung'wa pamo ni ŵakukumbikanya nsongo ni ŵaali ni sambi?”
Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?”
31 Che Yesu ŵajanjile, “Ŵangakulwala ngakwalajila ŵantela ikaŵe ŵakulwala.
Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike.
32 Nganiika kukwaŵilanga ŵandu ŵakupanganya yaili yambone paujo pa Akunnungu nambo ŵaali ni sambi kuti aleche sambi.”
Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”
33 Ŵandu ŵane ŵa mumpingo ula ŵaasalile Che Yesu, “Ŵakulijiganya ŵa che Yohana Ŵakubatisya akutaŵa kaŵilikaŵili ni kupopela ni ŵakulijiganya ŵa Mafalisayo akupanganya iyoyo peyo. Nambo ŵakulijiganya ŵenu akulya ni kung'wa.”
Ha sịrị, “Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ, na-ekpe ekpere oge niile, ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri, na-aṅụkwa.”
34 Che Yesu ŵajanjile, “Uli, ana nkuganisya kuti nkukombola kwatendekasya achambusanga ŵa mlombela ataŵe akuno ali pamo nawo?
Jisọs sịrị ha, “Ndị a kpọrọ oriri nʼọlụlụ di na nwunye, ha ga-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ?
35 Nambo chikaiche katema pachajigalikwe mlombela jo pasikati jao, gele moŵa go chachitaŵa.”
Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.”
36 Che Yesu ŵatanjile achi chitagu chi, “Ngapagwa mundu jwakupapula chigamba mu nguo jasambano ni kutotela mu nguo jewisale atamuno atendaga yeleyo chajijonanje nguo jasambano jo ni sooni, chele chigamba cha nguo jasambano cho ngachijilana ni jewisale jo.
Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba.
37 Sooni ngapagwa mundu jwakutaga divai jasambano mu misaku jewisale jekolochekwe ni mapende pakuŵa jele divai jasambano jo chijipapule misaku ni divai chijimwasiche ni misaku jo chijijonasiche.
Nʼụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị agbanye mmanya ọhụrụ dị ike nʼime karama akpụkpọ ochie. Nʼihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama ahụ a laa nʼiyi.
38 Nambo divai jasambano jikutajikwa mu misaku jasambano.
Ma ọ dị mma ịgbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.
39 Ngapagwa jwakusaka kung'wa divai jasambano ali ang'wele jakalakala pakuŵa akuti, ‘Jele jakalakala jo ni jambone nnope.’”
O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nʼihi na ọ ga-asị, ‘Nke ochie ahụ ka mma.’”

< Luka 5 >