< Luka 4 >

1 Che Yesu ŵatyosile mu lusulo lwa Yolodani ali aguumbele Mbumu jwa Akunnungu ni ŵalongweswe ni Mbumu kwaula mwipululu.
Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.
2 Kweleko ŵalinjikwe ni Shetani kwa moŵa alobaini. Katema kose ko, nganalya chachili chose ni pagamasile moŵa go, jakwete sala.
Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.
3 Shetani ŵaasalile, “Iŵaga mmwejo ni Mwana jwa Akunnungu, nlisalile ali liganga li ligalauche liŵe nkate.”
Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.”
4 Che Yesu ŵaajanjile, “Ilembekwe mu Malembelo ga Akunnungu, ‘Mundu ngakulama kwa kulya nkate pe.’”
Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’”
5 Shetani ŵankwesisye Che Yesu kwinani ni kunlosya kwanakamo mwenye syose sya pa chilambo.
Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya.
6 Shetani ŵansalile Che Yesu kuti, “Chinampe ulamusi wa ipanje yose ni ukulu wakwe, pakuŵa yose yi ambele une, ngukombola kumpa mundu jwalijose jungunsaka.
Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha.
7 Ni yose yi chinampe ni kuŵa yenu iŵaga chimundindiŵalile ni kumbopelela.”
Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.”
8 Che Yesu ŵajanjile, “Ilembekwe mu Malembelo ga Akunnungu, ‘Chimwatindiŵalile Ambuje Akunnungu ŵenu ni kwapopelela ŵawowo pewo.’”
Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’”
9 Shetani ŵanjigele Che Yesu mpaka ku Yelusalemu ni ŵanjimiche penani pa lusonga lwa Nyuumba ja Akunnungu ni kwasalila kuti “Iŵaga mmwejo nli Mwana jwa Akunnungu, nlipatusye paasi.
Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala.
10 Pakuŵa ilembekwe, ‘Chachatuma achikatumetume ŵao ŵa kwinani angose.’
Nʼihi na e dere ya, “‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma;
11 Ni sooni, ‘Channyakule mmakono mwao, ntakuligomba lukongolo lwenu paliganga.’”
ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
12 Nambo Che Yesu ŵajanjile, “Ilembekwe mu Malembelo ga Akunnungu, ‘Kasimwalinga Ambuje Akunnungu ŵenu.’”
Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa.”
13 Shetani paŵamasile kwalinga ŵannesile kwa katema.
Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara.
14 Che Yesu ŵausile ku chilambo cha ku Galilaya achilongoswaga ni machili ga Mbumu jwa Akunnungu ni ngani syao syajenele mu Galilaya ni mu misi jose jajiŵandikene.
Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile.
15 Nombe ŵaliji nkwajiganya ŵandu mu majumba gao ga kupopelela ni wose ŵaliji nkwalapa ŵelewo.
O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya.
16 Che Yesu ŵajawile ku Nasaleti, musi wawakulile ni Lyuŵa lya Kupumulila, ŵajinjile mu nyuumba ja kupopelela mpela iyatite pakuŵa chisyoŵelo. Ŵajimi kuti agasyome Malembelo ga Akunnungu.
Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ.
17 Ŵapochele chitabu chi che Isaya jwakulondola jwa Akunnungu ni ŵaunukwile, ŵasosile ni kupasimana papalembekwe yati
E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị,
18 “Mbumu jwa Ambuje ali pamo ni une, pakuŵa asagwile kuti nalichile Ngani Jambone kwa ŵandu ŵakulaga. Andumile kukwatangachisya ŵataŵikwe kugopolekwa kwao, ni ŵangalola akombole kulola, ni kukwawombola ŵakukotochelwa.
“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
19 Ni kwenesya chaka cha Ambuje chakulosya umbone kwa ŵandu ŵakwe.”
Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.”
20 Nipele ŵaunichile chitabu chila ni ŵampele katumetume, ŵatemi ni ŵandu wose ŵaŵaliji mu nyuumba ja kupopelela ŵannolechesye kwa nnope.
O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya.
21 Nombewo ŵaasalile, “Lelo Malembelo ga Akunnungu ga gaŵele isyene pamumbilikene ndi ngusyoma.”
Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.”
22 Wose ŵanonyelwe nawo ni ŵagasimosile maloŵe gambone gaŵaŵechete. Ŵausyanaga, “Ana, aju ngaŵa mwana ju che Yusufu?”
Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”
23 Che Yesu ŵaasalile, “Ngumanyilila chimusalile chitagu chi, ‘Jwantela nlilamye mwasyene.’ Ni sooni chinchiti, ‘Ituipilikene kuti mpanganyisye ku Kapelenaumu mpanganye nombe pamusi pano.’”
Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’”
24 Ŵapundile kuŵecheta, “Ngunsalila isyene, ngapagwa jwakulondola jwa Akunnungu jwakukundikwa mu chilambo chakwe.
Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya.
25 Nambo mpilikane! Isyene ngunsalila ŵapali achakongwe ŵakuwililwa ni achiŵankwawo ŵajinji mu chilambo cha Isilaeli katema ka che Elia. Kele katema ko nganijinyaga ula kwa yaka itatu ni miesi sita ni kwaliji ni sala jekulungwa pa chilambo chose.
Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii.
26 Namose yeleyo che Elia nganalajiswa kwa jwalijose jwakuwililwa ni ŵankwakwe ikaŵe kwa jwankongwe jwa kuwililwa jwa ku Salepita chilambo cha ku Sidoni.
Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn.
27 Ni sooni paliji ni ŵamatana ŵajinji chilambo cha ku Isilaeli katema ka jwakulondola jwa Akunnungu che Elisha. Nipele, nganapagwa jwalijose juŵaswejele ikaŵe che Naamani pe jwa ku Silia.”
Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.”
28 Wose ŵaŵaliji mu nyuumba ja kupopelela jila paŵapikene yeleyo ŵatumbile nnope.
Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu.
29 Ŵajimi ni kwatyosya paasa musi wao wautaŵikwe pachanya chitumbi ni ŵampeleche mungulugulu chitumbi akombole kwatutila paasi.
Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ.
30 Nambo Che Yesu ŵapelete mbindikati jao ni kwaula.
Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
31 Che Yesu ŵajawile ku Kapelenaumu chilambo cha ku Galilaya ni kwajiganya ŵandu pa Lyuŵa lya Kupumulila.
O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe.
32 Ŵasimosile majiganyo gao pakuŵa utenga wao waliji ni ulamusi.
Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike.
33 Ni mu nyuumba ja kupopelela jila mwaliji ni mundu juŵaliji ni lisoka, ŵanyanyisye achitiji,
Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu,
34 “Okwe, Che Yesu jwa ku Nasaleti nkwete ichichi nowe? Ana nnyiche kukutujonanga? Ngummanyilila kuti mmwe nli ŵaani, mmwejo ni Ŵaswela ŵa Akunnungu!”
“Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!”
35 Che Yesu ŵalikalipile lisoka achitiji, “Mmyalale! Munkopoche mundu ju!” Nipele lisoka lyo lyangwisisye mundu jo paujo pa ŵandu ni kunkopoka pangampoteka.
Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ.
36 Ŵandu wose ŵasimosile ni kuŵechetesyana, “Gelega gali majiganyo chi? Mundu ju akwete ulamusi ni machili ga kugasalila masoka gakopoche nombego gakukopoka!”
Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!”
37 Ngani si Che Yesu syajenele panapose pachilambo pala.
Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu.
38 Che Yesu ŵakopweche mu nyuumba ja kupopelela jila ni kwaula kumusi ku che Simoni. Ŵaŵendile kuti ŵalamye akwegwao che Simoni pakuŵa ŵalwalaga chiboko.
Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka.
39 Nipele Che Yesu ŵaiche ni kwajinamila, ŵachikalipile chiboko nombecho channesile, papopo jwankongwe jo ŵajimwiche ni kwatelechela.
O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa.
40 Palyaiche ligulo, ŵandu wose ŵaŵalwalaga ilwele yakupisyangana ŵaichisye ku Che Yesu nombewo ŵasajiche makono gao pa kila jumo ni kwalamya.
Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha.
41 Nombe masoka gaakopweche ŵandu ŵajinji, ganyanyisye gachitiji, “Alakwe nli Mwana jwa Akunnungu!” Nambo Che Yesu nganagalechelela gaŵechete, pakuŵa gaamanyilile kuti ŵelewo ali Kilisito Nkulupusyo.
Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst.
42 Kundaŵi jakwe, Che Yesu ŵajawile pachisyepela. Ŵandu ŵala ŵaliji nkwasosasosa. Paŵaichilile paŵaliji ŵalinjile kunsiŵila kuti anatyoche.
Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha.
43 Nambo ŵelewo ŵaasalile kuti, “Ngusachilwa kulalichila Ngani Jambone ja umwenye wa Akunnungu mu misi jine nombe pakuŵa ndumigwe kwa ligongo lyo.”
Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.”
44 Ŵapundile kulalichila Ngani Jambone mmajumba ga kupopelela ga ku Yudea.
Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.

< Luka 4 >