< Masengo 7 >
1 Nipele, Jwambopesi Jwankulu ŵambusisye che Stefano, “Ana yelei ni iyoyo?”
Onyeisi nchụaja sịrị ya, “Ị nụrụ ihe ndị a, ọ bụ eziokwu?”
2 Che Stefano nombe ŵaajanjile, “Achalongo achinjangu ni achatati, mumbilikanile! Akunnungu Ŵakulu ŵaakopochele atati ŵetu che Iblahimu paŵaliji ku Mesopotamia akanaŵe kwaula kukutama ku Halani.
Ọ sịrị, “Ụmụnna m na ndị nna, geenụ m ntị. Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Ebraham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamịa, tupu ọ gaa biri na Haran.
3 Akunnungu ŵansalile che Iblahimu, ‘Ntyoche mchilambo chenu, mwaleche ŵandu ŵa lukosyo lwenu, njaule kuchilambo chatinganlanjile cho.’
Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’
4 Nipele, che Iblahimu ŵasamile chilambo cha Ŵakalidayo, ŵajawile kukutama ku Halani. Paŵawile atatigwe, Akunnungu ŵansamisye sooni ku Halani ni kwika kukutama ku chilambo chino munkutamanga ŵanyamwe sambano jino.
“Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a.
5 Akunnungu nganiŵapa che Iblahimu namose chipande cha chilambo chi kuti chiŵe chao, nambo ŵannanjile kwapa chilambo chi chiŵe chakwe nsyene ni cha uŵelesi wakwe, namuno katema ko ŵaliji akanaŵe kola mwanache.
O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa.
6 Akunnungu ŵansalile yeleyi, ‘Uŵelesi wenu chiutame mu chilambo cha chilendo, ni kweleko chachatenda achikapolo ni kwasausya yaka mia nne.
Ma Chineke gwara ya otu a, na, ‘Ụmụ ụmụ ya ga-ebi dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha, ndị ga-eji ha mere ohu, ma mejọọkwa ha narị afọ anọ.
7 Nambo Akunnungu akuti, uneji chinjalamula ŵandu ŵa chilambo uchachatenda achikapolo. Nipele chinjakoposya mchilambo cho ni kwaikanawo apano kuti ambopele.’
Mana aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ.’ Chineke kwukwara sị, ‘Mgbe nke a gasịrị, ha ga-esi na mba ahụ pụta, bịa fee m ofufe nʼebe a.’
8 Ni Akunnungu ŵatesile malangano ni che Iblahimu ga kuumbala gaŵe chimanyisyo cha kugakunda malangano gao. Nipele che Iblahimu ŵambumbesye che Isaka mwanagwe pa lyuŵa lya ncheche ni ncheche pakumala kupagwa. Ni che Isaka nombe ŵambumbesye che Yakobo mwanagwe, ni che Yakobo nombe ŵaatesile iyoyo peyo achambuje ŵetu likumi ni ŵaŵili ŵala.
O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.
9 “Aŵala achambuje ŵetu ŵankolele wiu che Yusufu, ni ŵansyumisye aŵe kapolo ku chilambo cha Misili. Nambo Akunnungu ŵaliji pamo nawo,
“Nʼihi na ndị nna ochie ahụ nwere ekworo nʼebe Josef nọ. Ha resi ya ndị Ijipt dịka ohu. Ma Chineke nọnyeere ya,
10 ni kunkulupusya mmasausyo gakwe gose. Akunnungu ŵampele che Yusufu upile ni lunda paujo pa Falao, mwenye jwa ku Misili, ni mwenye Falao ŵammisile che Yusufu kuŵa jwankulu jwa chilambo ni jwa wose ŵaali mu nyuumba jao ja chimwenye.
zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.
11 Nipele kwatyochele sala jajikulungwa pa chilambo cha ku Misili ni ku Kanaani, ni ŵandu ŵalasile kwannope ligongo lya sala. Achambuje ŵetu nganakombola kuchipata chakulya chachilichose.
“Nʼoge ahụ, ụnwụ dara nʼala Ijipt na nʼala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri.
12 Nipele, che Yakobo paŵapilikene kuti kwana yakulya ku Misili ko, ŵaalajisye achiŵanagwe, yaani achatati ŵetu, ajaulangane kaandanda ku Misili ko.
Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri ọka dị nʼala Ijipt, o zipụrụ nna nna anyị ha ka ha gaa njem mbụ ha nʼIjipt. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipt.
13 Ni pa ulendo wao waŵili, che Yusufu ŵalikolasile kwa achapwakwe, ni mwenye jwa ku Misili ŵalumanyilile lukosyo lu che Yusufu.
Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.
14 Ni che Yusufu ŵaalajisye ŵandu kukwaŵilanga che Yakobo atatigwe ni achalongo achinjakwe wose, ŵandu sabini na mbili aichanje ku Misili.
Mgbe ahụ, Josef ziri ozi ka a kpọta nna ya bụ Jekọb na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise ka ha bịakwute ya.
15 Che Yakobo ŵajawile ku Misili, kweleko ni kuŵawilile pamo ni achambuje ŵetu.
Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ.
16 Ni malilo gao gajigalikwe mpaka ku Shekemu, ni kusikwa mwilembe liŵasumile che Iblahimu kutyochela ku lukosyo lwa Hamoli kwa mbiya simpepe.”
E budatara ozu ha na Shekem, ebe e liri ha nʼili nke Ebraham jiri ego ọlaọcha zụta nʼaka ụmụ Hamọ nʼala Shekem.
17 “Nambo pikaiche katema ka chilanga chiŵalumbile Akunnungu ku che Iblahimu, ŵandu ŵala ŵatupile ni konjecheka kwa nnope ku Misili kula.
“Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa na-abịaru nso, ndị Izrel nọ nʼIjipt mụbara nke ukwuu,
18 Nipele ŵajimwiche mwenye jwine ku Misili jwanganammanyilila che Yusufu.
ruo mgbe eze ọzọ nke na-amaghị Josef, bidoro ịchị ọchịchị nʼala Ijipt.
19 Mwenye jo ŵaatesile yangalumbana ni kwaonela achambuje ŵetu kwa kwakanganichisya akaajase achiŵana ŵao achanandi kuti nganasaka akole umi.
O megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbukwaa ha. Manye ndị nna nna anyị ha ka ha tufuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha ghara ịdị ndụ.
20 Katema ko che Musa ŵapagwile, nombejo ŵaliji jwambone paujo pa Akunnungu. Ŵalelitwe pa musi pa atatigwe kwa miesi jitatu,
“Ọ bụ nʼoge a ka a mụrụ Mosis, ọ mara mma nke ukwuu nʼanya Chineke. A zụrụ ya naanị ọnwa atọ nʼụlọ nna ya.
21 ni paŵalepele kungosa mwakupunda mu nyuumba ŵankopwesye paasa, mwali jwa mwenye jwa ku Misili ŵanjigele ni kunlela mpela mwanagwe nsyene.
Mgbe e tufuru ya, ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nwoke nke aka ya.
22 Che Musa ŵajigenywe indu ya lunda lwa Ŵamisili nombejo ŵaliji jwakulimbangana kwa maloŵe ni masengo.
A zụrụ Mosis nʼamamihe niile nke ndị Ijipt, ọ bụrụ dike nʼokwu na nʼọrụ ịtụnanya.
23 “Paŵaliji ni yaka alobaini, ntima wakwe wasachile kwajimajimila achinjakwe Ŵaisilaeli kukulola indu iŵapanganyichiswaga.
“Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nʼuche ịga ileta ụmụnna ya ndị Izrel.
24 Kweleko ŵambweni Mmisili jumo achimpanganyichisyaga yangalumbana jumo jwa achalongo achinjakwe, ŵapokasisye, ni che Musa kwakwauchisya ŵambuleje Mmisili jula.
Mgbe ọ hụrụ otu onye nʼime ha nke onye Ijipt na-emegide ya, ọ lụtara ya ọgụ, bọtakwara ya ọbọ site nʼigbu onye Ijipt ahụ.
25 Ŵaganisisye kuti achalongo achinjakwe Ŵaisilaeli akaimanyilile kuti Akunnungu akuntuma jwelejo kwakulupusya, nambo nganaimanyilila.
Mosis chere na ụmụnna ya ga-aghọta na Chineke akpọlitela ya isite nʼaka ya napụta ha. Ma ha aghọtaghị.
26 Malaŵi jakwe, ŵaweni Ŵaisilaeli ŵaŵili ali nkuputana achinsyene pe, ni ŵalinjile kwajilanya achitiji; ‘Ŵanyamwe ndi ŵa lukosyo lumo, ligongo chi nkusaka kuulasyana achinsyene pe?’
Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’
27 Nambo jwejula juŵamputaga njakwe jula ŵantutile pambali che Musa ni kunsalila, ‘Ana ŵaani ŵambisile mmwejo kuŵa chilongola ni jwakulamula pa uweji?
“Ma nwoke ahụ nke na-emegbu nwanna ya nupuru ya sị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị?
28 Ana nkusaka kumulaga mpela imwatite pakummulaga Mmisili jula liiso?’
Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’
29 Che Musa paŵagapilikene maloŵe go ŵatisile, ŵatemi ku chilambo cha ku Midiani nti jwannendo, ni kweleko ŵaŵelechele ŵanache ŵaŵili ŵachilume.
Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ.
30 “Payaichile yaka alobaini, katumetume jwa kwinani jwa Ambuje jwankopochele che Musa pa chisukutu chichakolelaga mooto kwipululu kula pachiŵandi ni Litumbi lya Sinai.
“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.
31 Che Musa ŵachisimonjile nnope chichaoneche cho, ŵasejelele pachiŵandi kukulolechesya uchenene, nambo ŵapilikene liloŵe lya Ambuje lilinkuti,
Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị,
32 ‘Uneji ndili Akunnungu ŵa achambuje ŵenu, Akunnungu ŵa che Iblahimu ni ŵa che Isaka ni ŵa che Yakobo!’ Che Musa ŵatetemele kwa lipamba ni nganapunda kulolechesya sooni.
‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’ Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.
33 Ambuje ŵansalile, ‘Mmuule italawanda yenu pakuŵa pelepo panjimi pali papaswela.
“Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.
34 Naiweni yangalumbana yakwapanganyichisya ŵandu ŵangu ŵakutama ku Misili. Mbilikene kulilasika kwao none ndulwiche kukwakulupusya, ni sambano chinantume ku Misili.’
Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’
35 “Che Musa aju ni jwejula juŵankanile Ŵaisilaeli paŵansalile, ‘Ana ŵaani ŵambisile mmwejo kuŵa chilongola ni jwakulamula pa uweji?’ Kwa litala lya julajula katumetume jwa kwinani juŵankopochele che Musa mu chisukutu chichakolelaga mooto, Akunnungu ŵantumile che Musa wo aŵe chilongola ni nkulupusyo.
“Ọ bụ otu Mosis ahụ ha jụrụ ajụ, mgbe ha sịrị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe?’ Ọ bụkwa ya ka Chineke zigara ị bụ onyeisi na onye nnapụta ha, site nʼinyeaka mmụọ ozi ahụ mere ka ọ hụ ya nʼọhịa ahụ.
36 Jwelejo ni juŵaalongwesye ŵandu akopoche ku Misili kwa kupanganya imanyisyo ni yakusimonjeka mu chilambo cha ku Misili ni mu bahali ja Shamu ni mwipululu, kwa yaka alobaini.
O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.
37 Che Musa ni juŵaasalile Ŵaisilaeli, ‘Akunnungu chanjimuchisye jwakulondola mpela uneji kutyochela mwa achalongo achinjenu mwachinsyene.’
“Onye a bụ Mosis ahụ gwara ụmụ Izrel, sị, ‘Chineke ga-eme ka onye amụma nke dị ka m, biliere unu site nʼetiti ụmụnne unu.’
38 Ŵaisilaeli paŵasongangene mwipululu mula, che Musa ŵaliji kweleko pamo ni achambuje ŵetu ni katumetume jwa kwinani juŵaŵechete najo mu Litumbi lya Sinai. Jweleju ni juŵagapochele maloŵe gagakwikanawo umi kutupa uweji.
Ya onwe ya nọ nʼọgbakọ nʼọzara, ya na mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nʼUgwu Saịnaị, na nna nna anyị ha; ebe ọ natakwara okwu dị ndụ inye anyị.
39 “Nambo achambuje ŵetu nganasakanga kumpilikanila che Musa, ŵantutile pambali ni ŵasachile mmitima jao kuujila ku Misili.
“Ma nna nna anyị ha jụrụ irubere ya isi. Kama ha nupuru ya nʼakụkụ, ma tụgharịa laghachi azụ nʼIjipt nʼobi ha,
40 Ŵansalile che Haluni, ‘Ntupanganyichisye achiminungu jati tujipopelele ni jitulongosye mwitala, pakuŵa che Musa juŵatulongwesye kopoka ku Misili ngatukuchimanyilila chichasimene!’
na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’
41 Katema ko ŵapanganyisye chinyago cha ng'ombe ja mwana, ni ŵatasile mbopesi kwa chinyago ni kuchijangalila chindu chichaliji masengo ga makono gao achinsyene.
Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha.
42 Nambo Akunnungu ŵatyosile pa ŵanyawo, ŵaalesile asipopele ndondwa sya kwiunde, mpela yaitite pakulembekwa mchitabu cha ŵakulondola ŵa Akunnungu, ‘Ŵanyamwe ŵandu ŵa chilambo cha ku Isilaeli! Ana ŵanyamwe mwambelechele inyama yesinje ni sadaka kwa yaka alobaini mwipululu mula?
Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma, “‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
43 Ŵanyamwe mwalijigele lisakasa lya nnungu jwenu Moleki, ni chinyago cha ndondwa ja nnungu jwenu Lefani. Inyago imwaipanganyisye ni iyoyo imwaipopele. Kwa ligongo lyo chinansamichisye ku ukapolo kwakutalika kupita ku Babeli!’
Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk na kpakpando nke chi unu bụ Refan, bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha. Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’
44 Achambuje ŵenu ŵakwete lisakasa lya umboni lyalikulosya kuti Akunnungu ali mwele mwipululu. Lisakasa lila lyakolochekwe mpela Akunnungu iŵatite pakwasalila che Musa akolosye, chisau ni achila chiŵachiweni.
“Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis.
45 Nipele achambuje ŵetu ŵapochelangene achinsyene pe mpaka katema ka che Yoshua, paŵachipatile chilambo chi kutyochela kwa ŵandu ŵaŵaŵinjikwe ni Akunnungu paujo pao. Lyatemi pelepo mpaka katema ka che Daudi.
Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.
46 Che Daudi ŵanonyelwe ni Akunnungu nombe che Daudi ŵaŵendile Akunnungu ŵaataŵile nyuumba ŵele ŵaali Akunnungu ŵa che Yakobo.
Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi.
47 Nambo che Selemani ni juŵantaŵile Akunnungu nyuumba.”
Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
48 “Natamuno yeleyo, Akumanani ngakutama mmajumba gagataŵikwe ni ŵandu, mpela yakuti jwakulondola jwa Akunnungu,
“Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
49 Ambuje akuti, ‘Kwinani kuli chitengu changu cha umwenye ni chilambo chili pakuŵichila makongolo gangu. Nyuumba jati uli jichimundaŵile une, ni liuto chi pachimbumulile?
“‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru.
50 Ana ngaŵa uneji jumbanganyisye yelei yose?’”
Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’
51 Che Stefano ŵapundile kuŵecheta, “Ŵakukanila achakulungwa ŵanyamwe! Mitima ni mawiwi genu gali mpela ga ŵandu ŵangakwamanyilila Akunnungu. Ŵanyamwe nli mpela achambuje ŵenu, moŵa gose nkukanilana ni Mbumu jwa Akunnungu.
“Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere.
52 Ana jwapi mwa ŵakulondola jwangananlagasya achambuje ŵenu? Ŵaauleje ŵelewo ŵaŵalajiswe kalakala ni Akunnungu asale kwika kwa ajula jwakupanganya yaili yambone. Ni sambano ŵanyamwe mungalawiche ni kumbulaga.
Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya.
53 Ŵanyamwe mwagapochele Malajisyo ga Akunnungu gagaiche kukwenu ni achikatumetume ŵa kwinani, nambo nganingakamulichisya.”
Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site nʼaka ndị mmụọ ozi, ma unu edebeghị ya.”
54 Achakulu ŵa Nkungulu paŵagapilikene maloŵe go, yachimile nnope ni kuchilimya meeno.
Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ.
55 Nambo che Stefano ali aguumbele Mbumu jwa Akunnungu, ŵalolite kwinani, ŵauweni ukulu wa Akunnungu ni Che Yesu ali ajimi kundyo kwa Akunnungu.
Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke.
56 Ni ŵatite, “Nnole! Ngukuwona kwinani kwakuugule ni Mwana jwa Mundu ajimi kundyo kwa Akunnungu.”
Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.”
57 Pelepo ŵandu wose ŵaŵaliji pa Nkungulu ula ŵagumisile kwa liloŵe lyekulungwa ni kusiŵila mawiwi ni makono gao. Nipele ŵanguluchile ŵanawose kwana kamo,
Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya,
58 Ni ŵankopwesye mmusi ni kumponya maganga. Ŵaumboni ŵala ŵaŵisile yakuwala yao kwa jwanchanda jumo liina lyakwe che Sauli kuti aigose.
dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl.
59 Paŵapundile kwaponya maganga, che Stefano ŵapopele achitiji, “Alakwe Ambuje Che Yesu, mpochele mbumu jangu!”
Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.”
60 Ŵatindiŵele ni ŵanyanyisye achitiji, “Ambuje nkaaŵalanjila sambi si.” Paŵaŵechete yeleyo ŵajasiche. Ni che Sauli ŵakundile kuti che Stefano akuŵajilwa kuulajikwa.
O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.