< Masengo 4 >

1 Che Petulo ni che Yohana paŵaliji nkukunguluka ni ŵandu, ŵaiche ŵambopesi ni jwankulu jwa ŵakulindilila Nyuumba ja Akunnungu pamo ni Masadukayo.
Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha.
2 Ŵatumbile nnope pakuŵa achinduna ŵala ŵaajiganyaga ŵandu kuti Che Yesu ŵasyuchile, chindu chachikulosya pangasisa kuti ŵandu ŵawile chachisyuka.
Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị.
3 Nipele ŵakamwile che Petulo ni che Yohana, ŵaŵisile mu nyuumba jakutaŵilwa mpaka malaŵi jakwe, pakuŵa chaŵandichile chilo.
Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi.
4 Nambo ŵajinji mwa ŵelewo ŵaŵapilikanile utenga u che Petulo ni che Yohana ŵakulupilile, ni ŵandu ŵaŵakulupilile ŵajonjesyeche ŵaliji mpela achalume elufu tano.
Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise.
5 Malaŵi jakwe, achakulu ŵa Ŵayahudi ni achachekulu ni ŵakwiganya Malajisyo ga Akunnungu gaŵapele che Musa ŵasongangene pamo ku Yelusalemu.
Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem.
6 Ŵachingangene nawo che Anasi Jwambopesi Jwankulu ni che Kayafa ni che Yohana ni che Alekisanda ni ŵaneŵane ŵaŵaliji ŵa lukosyo lwao Jwambopesi Jwankulu.
Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja.
7 Ŵaajimiche che Petulo ni che Yohana paujo pao, ŵaausisye, “Ana ŵanyamwe ntesile chelechi kwa machili chi ni kwa ulamusi wa acheni?”
Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”
8 Pelepo che Petulo ali aguumbele Mbumu jwa Akunnungu, ŵajanjile, “Mwanya Ilongola ŵa ŵandu ni achachekulu!
Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye.
9 Iŵaga lelo jino nkutuusya yankati chindu chambone chachitendekwe kwa mundu juŵaliji ngakwenda ni iyatite pakulama,
Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya,
10 nipele, ŵanyamwe ni ŵandu wose ŵa ku Isilaeli nkusachilwa kumanyilila kuti mundu ju akwima paujo penu lelo jino, alamiswe kwa machili ga liina li Che Yesu Kilisito jwa ku Nasaleti jumwaŵambile pansalaba, nambo Akunnungu ŵansyusisye.
ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
11 Che Yesu ni jwakungamba Mmalembelo Gamaswela gagakuti, ‘Liganga limwalikanile ŵanyamwe ŵakutaŵa, sambano lilyolyo litendekwe kuŵa liganga lyekulungwa lya nsingi wa nyuumba.’
Jisọs a bụ “‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
12 Jwelejo jikape ni jwakukombola kwakulupusya ŵandu, pakuŵa pachilambo pose ngapagwa liina litupegwilwe lyalitukukombola kukulupuswa nalyo.”
Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
13 Achakulu ŵa Nkungulu wo ŵaimanyilile kuti che Petulo ni che Yohana ŵaliji ŵanduŵandupe ni ŵandu ŵangasyoma, nipele ŵasimosile nnope kuwona iŵatite pakwanga pangali lipamba, ŵaimanyilile kuti ŵaliji pamo ni Che Yesu.
Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ.
14 Nambo paŵambweni mundu juŵalamiswe jula ali ajimi pamo nawo, nganakola chakuŵecheta.
Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.
15 Nipele, ŵalamwile che Petulo ni che Yohana ajaulangane paasa pa Nkungulu ni achakulu ŵa Nkungulu ŵasigalile nkati achiusyanaga achinsyene pe.
Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a.
16 Ni ŵausyene, “Twatende ichichi ŵandu ŵa? Pakuŵa wose ŵakutama mu Yelusalemu akumanyilila chenene kuti atesile chimanyisyo chachikulungwa ni uweji ngatukukombola kukanila.
Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.
17 Nambo pakuti tusiŵile ikajenela nnope kwa ŵandu twajamuche kuti akaŵecheta ni mundu jwalijose kwa liina li Che Yesu.”
Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.”
18 Nipele ilongola ŵaaŵilasile sooni nkati ni kwakanya kuti anaŵechete sooni pelanga, atamuno kwiganya mu liina li Che Yesu.
Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs.
19 Nambo che Petulo ni che Yohana ŵaajanjile ŵanyawo, “Iŵaga ili yambone paujo pa Akunnungu kunchimbichisyanga ŵanyamwe kupunda Akunnungu, nlamule mwachinsyene.
Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị?
20 Pakuŵa ngatukombola kuleka kusala yeila itwiweni ni kuipilikana.”
Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.”
21 Nipele achakulu ŵa Nkungulu wo ŵaakanyisye sooni che Petulo ni che Yohana kwa kalipa nnope ni kwagopola. Nganakombolanga kwajamuka pakuŵa ŵandu wose ŵaliji nkwakusya Akunnungu kwaligongo lya chichatendekwe cho.
Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.
22 Ni ajula mundu juŵalamiswe kwa litala lya chimanyisyo chi, ŵaliji jwampunde yaka alobaini.
Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.
23 Papopo che Petulo ni che Yohana paŵaagopwele ŵaiche kwa achinjao ni kwaŵalanjila yose iŵasalilwe ni ŵambopesi ni achachekulu.
Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha.
24 Ŵanyawo paŵajipilikene ngani jo, kwa ntima umo ŵaapopelele Akunnungu achitiji, “Ambuje, alakwe ni jumwagumbile kwinani ni chilambo ni bahali ni indu yose yaili mwelemo!
Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha.
25 Mwaŵechete kwa litala lya Mbumu jwa Akunnungu kwa kang'wa ja katumetume jwenu che Daudi atati ŵetu, ‘Ana kwachichi ŵandu ŵa ilambo ine atumbile? Ana kwachichi ŵandu akuganisya yangalimate?
Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
26 Mamwenye ŵa ilambo aliŵichile chile, ni achakulu asongangene pamo, kuti ŵakanile Ambuje, ni Kilisito jwao juŵansagwile.’
Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’
27 “Pakuŵa, kusyene che Helode ni che Pontio Pilato ni ŵandu ŵa ku Isilaeli pamo ni ŵandu ŵangaŵa Ŵayahudi, ŵasongangene papapa pa musi, kunkanila Che Yesu katumetume jwenu jwanswela jumunsagwile aŵe Kilisito.
Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,
28 Elo, ŵasongangene kukutendekanya yeila imwaisachile chitandile kundanda ikopochele kwa ulamusi wenu.
ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.
29 Nambo, alakwe Ambuje, nnole sambano kutujogoya kwao. Ntukombolechesye uweji achikapolo ŵenu kulalichila liloŵe lyenu pangajogopa.
Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.
30 Ngolosye nkono wenu mwalamye ŵandu ni kutendekanya imanyisyo ni yakusimonjeka kwa ulamusi u Che Yesu Katumetume jwenu Jwanswela.”
Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”
31 Paŵamalisisye kupopela, peuto paŵasongangene pala patenganiche, ni wose ŵagumbele Mbumu jwa Akunnungu ni ŵajendelechele kulalichila liloŵe lya Akunnungu pangali lipamba.
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
32 Ni mpingo wa ŵelewo ŵakukulupilila waliji ni ntima umo ni nningwa umo. Ni nganapagwa mundu juŵatite kuti iŵakwete yo yakwe nsyene, nambo ŵagaŵene yose iŵakwete.
Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.
33 Kwa machili gamajinji achinduna ŵala ŵaŵalasile umboni wa kusyuka kwa Ambuje Che Yesu, nombe Akunnungu ŵapele upile weujinji.
Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba.
34 Nganapagwa mundu jwalijose juŵasoŵilwe ni chachilichose, pakuŵa juŵakwete ngunda atamuno majumba ŵasumisyaga ni kwikanasyo mbiya,
O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha,
35 ni kwapa achinduna, nombewo ŵagaŵenye kwa jwalijose mpela yaikuti pakunsoŵa.
nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.
36 Ni kwaliji ni Mlawi, juŵapagwile ku Kupulo, liina lyakwe che Yusufu, ni achinduna ŵala ŵammilasile che Banaba, malumbo gakwe, “Mundu jwakwatulasya ŵandu mitima.”
Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”).
37 Nombejo ŵakwete ngunda wakwe, ni ŵausumisye, ŵajigele mbiya syo ni kwapa achinduna.
O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.

< Masengo 4 >