< 詩篇 89 >
1 以斯拉人以探的訓誨詩。 我要歌唱耶和華的慈愛,直到永遠; 我要用口將你的信實傳與萬代。
Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
2 因我曾說:你的慈悲必建立到永遠; 你的信實必堅立在天上。
Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.
3 我與我所揀選的人立了約, 向我的僕人大衛起了誓:
Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,
4 我要建立你的後裔,直到永遠; 要建立你的寶座,直到萬代。 (細拉)
‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’” (Sela)
5 耶和華啊,諸天要稱讚你的奇事; 在聖者的會中,要稱讚你的信實。
O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.
6 在天空誰能比耶和華呢? 神的眾子中,誰能像耶和華呢?
Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?
7 他在聖者的會中,是大有威嚴的上帝, 比一切在他四圍的更可畏懼。
Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
8 耶和華-萬軍之上帝啊, 哪一個大能者像你耶和華? 你的信實是在你的四圍。
O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.
Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
10 你打碎了拉哈伯,似乎是已殺的人; 你用有能的膀臂打散了你的仇敵。
Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
11 天屬你,地也屬你; 世界和其中所充滿的都為你所建立。
Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
12 南北為你所創造; 他泊和黑門都因你的名歡呼。
Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
13 你有大能的膀臂; 你的手有力,你的右手也高舉。
Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
14 公義和公平是你寶座的根基; 慈愛和誠實行在你前面。
Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
15 知道向你歡呼的,那民是有福的! 耶和華啊,他們在你臉上的光裏行走。
Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
16 他們因你的名終日歡樂, 因你的公義得以高舉。
Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.
17 你是他們力量的榮耀; 因為你喜悅我們,我們的角必被高舉。
Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.
18 我們的盾牌屬耶和華; 我們的王屬以色列的聖者。
Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.
19 當時,你在異象中曉諭你的聖民,說: 我已把救助之力加在那有能者的身上; 我高舉那從民中所揀選的。
I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.
Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya.
Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
23 我要在他面前打碎他的敵人, 擊殺那恨他的人。
Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.
24 只是我的信實和我的慈愛要與他同在; 因我的名,他的角必被高舉。
Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.
26 他要稱呼我說:你是我的父, 是我的上帝,是拯救我的磐石。
Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
28 我要為他存留我的慈愛,直到永遠; 我與他立的約必要堅定。
Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
29 我也要使他的後裔存到永遠, 使他的寶座如天之久。
Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.
30 倘若他的子孫離棄我的律法, 不照我的典章行,
“Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,
ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
32 我就要用杖責罰他們的過犯, 用鞭責罰他們的罪孽。
aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
33 只是我必不將我的慈愛全然收回, 也必不叫我的信實廢棄。
ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.
35 我一次指着自己的聖潔起誓: 我決不向大衛說謊!
Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha,
36 他的後裔要存到永遠; 他的寶座在我面前如日之恆一般,
na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
37 又如月亮永遠堅立, 如天上確實的見證。 (細拉)
Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” (Sela)
Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
39 你厭惡了與僕人所立的約, 將他的冠冕踐踏於地。
Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.
40 你拆毀了他一切的籬笆, 使他的保障變為荒場。
Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.
Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.
42 你高舉了他敵人的右手; 你叫他一切的仇敵歡喜。
I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.
43 你叫他的刀劍捲刃, 叫他在爭戰之中站立不住。
I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara.
I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.
45 你減少他青年的日子, 又使他蒙羞。 (細拉)
I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.
46 耶和華啊,這要到幾時呢? 你要將自己隱藏到永遠嗎? 你的忿怒如火焚燒要到幾時呢?
Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?
47 求你想念我的時候是何等的短少; 你創造世人,要使他們歸何等的虛空呢?
Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!
48 誰能常活免死、 救他的靈魂脫離陰間的權柄呢? (細拉) (Sheol )
Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? (Sela) (Sheol )
49 主啊,你從前憑你的信實 向大衛立誓要施行的慈愛在哪裏呢?
O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
50 主啊,求你記念僕人們所受的羞辱, 記念我怎樣將一切強盛民的羞辱存在我懷裏。
Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
51 耶和華啊,你的仇敵用這羞辱羞辱了你的僕人, 羞辱了你受膏者的腳蹤。
O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.
52 耶和華是應當稱頌的,直到永遠。 阿們!阿們!
Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.