< 詩篇 11 >

1 大衛的詩,交與伶長。 我是投靠耶和華; 你們怎麼對我說:你當像鳥飛往你的山去。
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.”
2 看哪,惡人彎弓,把箭搭在弦上, 要在暗中射那心裏正直的人。
Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.
3 根基若毀壞, 義人還能做甚麼呢?
Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
4 耶和華在他的聖殿裏; 耶和華的寶座在天上; 他的慧眼察看世人。
Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.
5 耶和華試驗義人; 惟有惡人和喜愛強暴的人,他心裏恨惡。
Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.
6 他要向惡人密布網羅; 有烈火、硫磺、熱風,作他們杯中的分。
Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.
7 因為耶和華是公義的,他喜愛公義; 正直人必得見他的面。
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.

< 詩篇 11 >