< 那鴻書 3 >
1 禍哉!這流人血的城, 充滿謊詐和強暴- 搶奪的事總不止息。
Ahụhụ dịrị obodo ọbara, nke jupụtara nʼụgha, na ihe e zutere nʼohi. Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu.
Ụda ụtarị, ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya, ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ, na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha!
3 馬兵爭先,刀劍發光, 槍矛閃爍,被殺的甚多, 屍首成了大堆, 屍骸無數,人碰着而跌倒,
Ndị agha ịnyịnya, na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma, na ùbe ha na-egbuke egbuke. Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ, ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile, ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe.
4 都因那美貌的妓女多有淫行, 慣行邪術,藉淫行誘惑列國, 用邪術誘惑多族。
Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko, onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche, onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya, na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya.
5 萬軍之耶和華說:我與你為敵; 我必揭起你的衣襟,蒙在你臉上, 使列國看見你的赤體, 使列邦觀看你的醜陋。
“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile.
6 我必將可憎污穢之物拋在你身上, 辱沒你,為眾目所觀。
Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche, meso gị mmeso onye e ledara anya, mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile.
7 凡看見你的,都必逃跑離開你, 說:尼尼微荒涼了!有誰為你悲傷呢? 我何處尋得安慰你的人呢?
Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”
8 你豈比挪亞們強呢? 挪亞們坐落在眾河之間,周圍有水; 海作她的濠溝, 又作她的城牆。
Ị dị mma karịa Tibs, bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl, nke mmiri gbara gburugburu? Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya, mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
9 古實和埃及是她無窮的力量; 弗人和路比族是她的幫手。
Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.
10 但她被遷移,被擄去; 她的嬰孩在各市口上也被摔死。 人為她的尊貴人拈鬮; 她所有的大人都被鍊子鎖着。
Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ dịka ohu a dọtara nʼagha. A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume, nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile. E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ, e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.
11 你也必喝醉,必被埋藏, 並因仇敵的緣故尋求避難所。
Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke, ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.
12 你一切保障必像無花果樹上初熟的無花果, 若一搖撼就落在想吃之人的口中。
Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya.
13 你地上的人民如同婦女; 你國中的關口向仇敵敞開; 你的門閂被火焚燒。
Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.
14 你要打水預備受困; 要堅固你的保障, 踹土和泥,修補磚窯。
Seta mmiri maka oge nnọchibido, mee ka ebe gị niile nke ewusiri ike siekwa ike karịa. Gwupụta ụrọ, zọta aja, jiri ụrọ ndị ahụ kpụtakwa aja, rụzikwaa ụlọ ahụ.
15 在那裏,火必燒滅你; 刀必殺戮你, 吞滅你如同蝻子。 任你加增人數多如蝻子, 多如蝗蟲吧!
Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị, mma agha ga-egbutu gị. Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu. Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana, maọbụ mụbaa dịka igurube.
Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga
17 你的首領多如蝗蟲; 你的軍長彷彿成群的螞蚱, 天涼的時候齊落在籬笆上, 日頭一出便都飛去, 人不知道落在何處。
Ndị nche gị bara ụba igurube, ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga; ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa.
18 亞述王啊,你的牧人睡覺; 你的貴冑安歇; 你的人民散在山間,無人招聚。
Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ gị na-ero ụra, ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ. Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile, ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha.
19 你的損傷無法醫治; 你的傷痕極其重大。 凡聽你信息的必都因此向你拍掌。 你所行的惡誰沒有時常遭遇呢?
Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa. Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị. Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gị ga-eji ọṅụ kụọ aka ha, nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụ nke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị?