< 約伯記 6 >
2 惟願我的煩惱稱一稱, 我一切的災害放在天平裏;
“A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!
Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri, nke mere okwu m ji ada ike ike.
4 因全能者的箭射入我身; 其毒,我的靈喝盡了; 上帝的驚嚇擺陣攻擊我。
Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m; mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha; ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.
Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata, ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?
A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?
A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.
“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.
Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.
10 我因沒有違棄那聖者的言語, 就仍以此為安慰, 在不止息的痛苦中還可踴躍。
Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.
11 我有甚麼氣力使我等候? 我有甚麼結局使我忍耐?
“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?
12 我的氣力豈是石頭的氣力? 我的肉身豈是銅的呢?
Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?
13 在我豈不是毫無幫助嗎? 智慧豈不是從我心中趕出淨盡嗎?
Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka, ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?
14 那將要灰心、離棄全能者、 不敬畏上帝的人, 他的朋友當以慈愛待他。
“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.
15 我的弟兄詭詐,好像溪水, 又像溪水流乾的河道。
Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha, dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,
nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi, nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.
17 天氣漸暖就隨時消化, 日頭炎熱便從原處乾涸。
Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị, nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.
18 結伴的客旅離棄大道, 順河偏行,到荒野之地死亡。
Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha. Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.
Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri, otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.
Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi, ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.
Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru, unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.
22 我豈說:請你們供給我, 從你們的財物中送禮物給我?
O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m, sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,
23 豈說:拯救我脫離敵人的手嗎? 救贖我脫離強暴人的手嗎?
gbapụtanụ m nʼaka ndị iro, maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?
24 請你們教導我,我便不作聲; 使我明白在何事上有錯。
“Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ, gosi m ebe m si mejọọ.
25 正直的言語力量何其大! 但你們責備是責備甚麼呢?
Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi! Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?
26 絕望人的講論既然如風, 你們還想要駁正言語嗎?
Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m? Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?
Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna, ma refukwaa enyi unu.
“Lezie m anya nke ọma, ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?
29 請你們轉意,不要不公; 請再轉意,我的事有理。
Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi, tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.
30 我的舌上豈有不義嗎? 我的口裏豈不辨奸惡嗎?
Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta? Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?