< 約伯記 34 >

1 以利戶又說:
Mgbe ahụ Elihu sịrị:
2 你們智慧人要聽我的話; 有知識的人要留心聽我說。
“Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe; gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta.
3 因為耳朵試驗話語, 好像上膛嘗食物。
Ntị na-anwale okwu dịka ire si anụ ụtọ ihe oriri.
4 我們當選擇何為是, 彼此知道何為善。
Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi; ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.
5 約伯曾說:我是公義, 上帝奪去我的理;
“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume, ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
6 我雖有理,還算為說謊言的; 我雖無過,受的傷還不能醫治。
Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha ma a na-ahụta m dịka onye ụgha; ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’
7 誰像約伯, 喝譏誚如同喝水呢?
Olee nwoke dịka Job, nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
8 他與作孽的結伴, 和惡人同行。
Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi, ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.
9 他說:人以上帝為樂, 總是無益。
Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’
10 所以,你們明理的人要聽我的話。 上帝斷不致行惡; 全能者斷不致作孽。
“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta. Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume, bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
11 他必按人所做的報應人, 使各人照所行的得報。
Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.
12 上帝必不作惡; 全能者也不偏離公平。
Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi, na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.
13 誰派他治理地, 安定全世界呢?
Onye họpụtara ya ịchị ụwa? Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile?
14 他若專心為己, 將靈和氣收歸自己,
Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
15 凡有血氣的就必一同死亡; 世人必仍歸塵土。
mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi, mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja.
16 你若明理,就當聽我的話, 留心聽我言語的聲音。
“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a; gee ntị nʼokwu m.
17 難道恨惡公平的可以掌權嗎? 那有公義的、有大能的,豈可定他有罪嗎?
Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị? Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?
18 他對君王說:你是鄙陋的; 對貴臣說:你是邪惡的。
Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’ ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’
19 他待王子不徇情面, 也不看重富足的過於貧窮的, 因為都是他手所造。
Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze, onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye, nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
20 在轉眼之間,半夜之中, 他們就死亡。 百姓被震動而去世; 有權力的被奪去非借人手。
Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị; ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga; a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.
21 上帝注目觀看人的道路, 看明人的腳步。
“Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ; ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile.
22 沒有黑暗、陰翳能給作孽的藏身。
Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị, ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.
23 上帝審判人,不必使人到他面前再三鑒察。
Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ, nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
24 他用難測之法打破有能力的人, 設立別人代替他們。
Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha.
25 他原知道他們的行為, 使他們在夜間傾倒滅亡。
Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile, ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
26 他在眾人眼前擊打他們, 如同擊打惡人一樣。
Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,
27 因為他們偏行不跟從他, 也不留心他的道,
nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha, ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.
28 甚至使貧窮人的哀聲達到他那裏; 他也聽了困苦人的哀聲。
Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị, nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa.
29 他使人安靜,誰能擾亂呢? 他掩面,誰能見他呢? 無論待一國或一人都是如此-
Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe? Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya? Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,
30 使不虔敬的人不得作王, 免得有人牢籠百姓。
igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo, ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ.
31 有誰對上帝說: 我受了責罰,不再犯罪;
“Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke, ‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ.
32 我所看不明的,求你指教我; 我若作了孽,必不再作?
Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ; ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’
33 他施行報應, 豈要隨你的心願、叫你推辭不受嗎? 選定的是你,不是我。 你所知道的只管說吧!
Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị mgbe ị jụrụ ichegharị? Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ; ya mere gwa m ihe ị mara.
34 明理的人和聽我話的智慧人必對我說:
“Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si, ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m,
35 約伯說話沒有知識, 言語中毫無智慧。
‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe; okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’
36 願約伯被試驗到底, 因他回答像惡人一樣。
Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ maka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ!
37 他在罪上又加悖逆; 在我們中間拍手, 用許多言語輕慢上帝。
Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya; na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo, ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide Chineke.”

< 約伯記 34 >