< 約伯記 10 >
1 我厭煩我的性命, 必由着自己述說我的哀情; 因心裏苦惱,我要說話,
“Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.
2 對上帝說:不要定我有罪, 要指示我,你為何與我爭辯?
Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe, kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.
3 你手所造的, 你又欺壓,又藐視, 卻光照惡人的計謀。 這事你以為美嗎?
Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?
Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?
5 你的日子豈像人的日子, 你的年歲豈像人的年歲,
Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ, ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?
Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m ma nyochaa mmehie m?
7 其實,你知道我沒有罪惡, 並沒有能救我脫離你手的。
Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m, na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.
8 你的手創造我,造就我的四肢百體, 你還要毀滅我。
“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m. Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?
9 求你記念-製造我如摶泥一般, 你還要使我歸於塵土嗎?
Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?
10 你不是倒出我來好像奶, 使我凝結如同奶餅嗎?
Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?
11 你以皮和肉為衣給我穿上, 用骨與筋把我全體聯絡。
Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ, werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?
12 你將生命和慈愛賜給我; 你也眷顧保全我的心靈。
I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị, nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.
13 然而,你待我的這些事早已藏在你心裏; 我知道你久有此意。
“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị, amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.
Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.
15 我若行惡,便有了禍; 我若為義,也不敢抬頭, 正是滿心羞愧, 眼見我的苦情。
Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m! A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu nʼihi na ejupụtara m nʼihere, bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.
16 我若昂首自得,你就追捕我如獅子, 又在我身上顯出奇能。
Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
17 你重立見證攻擊我, 向我加增惱怒, 如軍兵更換着攻擊我。
I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.
18 你為何使我出母胎呢? 不如我當時氣絕,無人得見我;
“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.
19 這樣,就如沒有我一般, 一出母胎就被送入墳墓。
A sịkwarị na amụpụtaghị m maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!
20 我的日子不是甚少嗎? 求你停手寬容我, 叫我在往而不返之先- 就是往黑暗和死蔭之地以先- 可以稍得暢快。
Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole? Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,
tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ebe m na-agaghị esi pụtakwa.
22 那地甚是幽暗,是死蔭混沌之地; 那裏的光好像幽暗。
Nʼala nke oke ọchịchịrị, ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị, ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”