< 诗篇 86 >
1 大卫的祈祷。 耶和华啊,求你侧耳应允我, 因我是困苦穷乏的。
Ekpere Devid. Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.
2 求你保存我的性命,因我是虔诚人。 我的 神啊,求你拯救这倚靠你的仆人!
Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ Chineke m;
meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.
4 主啊,求你使仆人心里欢喜, 因为我的心仰望你。
Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m.
5 主啊,你本为良善,乐意饶恕人, 有丰盛的慈爱赐给凡求告你的人。
Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.
6 耶和华啊,求你留心听我的祷告, 垂听我恳求的声音。
O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.
Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m.
8 主啊,诸神之中没有可比你的; 你的作为也无可比。
Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m; ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ.
9 主啊,你所造的万民都要来敬拜你; 他们也要荣耀你的名。
Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube.
Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke.
11 耶和华啊,求你将你的道指教我; 我要照你的真理行; 求你使我专心敬畏你的名!
Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.
12 主—我的 神啊,我要一心称赞你; 我要荣耀你的名,直到永远。
Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.
13 因为,你向我发的慈爱是大的; 你救了我的灵魂免入极深的阴间。 (Sheol )
Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. (Sheol )
14 神啊,骄傲的人起来攻击我, 又有一党强横的人寻索我的命; 他们没有将你放在眼中。
O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.
15 主啊,你是有怜悯有恩典的 神, 不轻易发怒,并有丰盛的慈爱和诚实。
Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
16 求你向我转脸,怜恤我, 将你的力量赐给仆人,救你婢女的儿子。
Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi.
17 求你向我显出恩待我的凭据, 叫恨我的人看见便羞愧, 因为你—耶和华帮助我,安慰我。
Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.