< 诗篇 139 >
1 大卫的诗,交与伶长。 耶和华啊,你已经鉴察我,认识我。
Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma
2 我坐下,我起来,你都晓得; 你从远处知道我的意念。
Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
3 我行路,我躺卧,你都细察; 你也深知我一切所行的。
Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.
4 耶和华啊,我舌头上的话, 你没有一句不知道的。
O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.
Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị.
6 这样的知识奇妙,是我不能测的, 至高,是我不能及的。
Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.
7 我往哪里去躲避你的灵? 我往哪里逃、躲避你的面?
Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
8 我若升到天上,你在那里; 我若在阴间下榻,你也在那里。 (Sheol )
Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. (Sheol )
Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,
10 就是在那里,你的手必引导我; 你的右手也必扶持我。
ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m aka nri gị ga-ejidesi m ike.
11 我若说:黑暗必定遮蔽我, 我周围的亮光必成为黑夜;
Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”
12 黑暗也不能遮蔽我,使你不见, 黑夜却如白昼发亮。 黑暗和光明,在你看都是一样。
Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.
13 我的肺腑是你所造的; 我在母腹中,你已覆庇我。
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
14 我要称谢你,因我受造,奇妙可畏; 你的作为奇妙,这是我心深知道的。
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
15 我在暗中受造,在地的深处被联络; 那时,我的形体并不向你隐藏。
Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
16 我未成形的体质,你的眼早已看见了; 你所定的日子,我尚未度一日, 你都写在你的册上了。
Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.
17 神啊,你的意念向我何等宝贵! 其数何等众多!
Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu.
18 我若数点,比海沙更多; 我睡醒的时候,仍和你同在。
Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.
19 神啊,你必要杀戮恶人; 所以,你们好流人血的,离开我去吧!
O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!
20 因为他们说恶言顶撞你; 你的仇敌也妄称你的名。
Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.
21 耶和华啊,恨恶你的,我岂不恨恶他们吗? 攻击你的,我岂不憎嫌他们吗?
O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?
Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.
23 神啊,求你鉴察我,知道我的心思, 试炼我,知道我的意念,
O Chineke, nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.
24 看在我里面有什么恶行没有, 引导我走永生的道路。
Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.