< 尼希米记 7 >

1 城墙修完,我安了门扇,守门的、歌唱的,和利未人都已派定。
Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị.
2 我就派我的弟兄哈拿尼和营楼的宰官哈拿尼雅管理耶路撒冷;因为哈拿尼雅是忠信的,又敬畏 神过于众人。
Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.
3 我吩咐他们说:“等到太阳上升才可开耶路撒冷的城门;人尚看守的时候就要关门上闩;也当派耶路撒冷的居民各按班次看守自己房屋对面之处。”
Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”
4 城是广大,其中的民却稀少,房屋还没有建造。
Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị.
5 我的 神感动我心,招聚贵胄、官长,和百姓,要照家谱计算。我找着第一次上来之人的家谱,其上写着:
Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:
6 巴比伦王尼布甲尼撒从前掳去犹大省的人,现在他们的子孙从被掳到之地回耶路撒冷和犹大,各归本城。
Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.
7 他们是同着所罗巴伯、耶书亚、尼希米、亚撒利雅、拉米、拿哈玛尼、末底改、必珊、米斯毗列、比革瓦伊、尼宏、巴拿回来的。
Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
8 以色列人民的数目记在下面:巴录的子孙二千一百七十二名;
Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ,
9 示法提雅的子孙三百七十二名;
nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ,
10 亚拉的子孙六百五十二名;
nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ,
11 巴哈·摩押的后裔,就是耶书亚和约押的子孙二千八百一十八名;
nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ,
12 以拦的子孙一千二百五十四名;
nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ,
13 萨土的子孙八百四十五名;
nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise,
14 萨改的子孙七百六十名;
nke Zakai, narị asaa na iri isii,
15 宾内的子孙六百四十八名;
nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ,
16 比拜的子孙六百二十八名;
nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ,
17 押甲的子孙二千三百二十二名;
nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ,
18 亚多尼干的子孙六百六十七名;
nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa,
19 比革瓦伊的子孙二千零六十七名;
nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa,
20 亚丁的子孙六百五十五名;
nke Adin, narị isii na iri ise na ise,
21 亚特的后裔,就是希西家的子孙九十八名;
nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ,
22 哈顺的子孙三百二十八名;
nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ,
23 比赛的子孙三百二十四名;
nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ,
24 哈拉的子孙一百一十二名;
nke Harif, otu narị na iri na abụọ,
25 基遍人九十五名;
nke Gibiọn, iri itoolu na ise.
26 伯利恒人和尼陀法人共一百八十八名;
Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ,
27 亚拿突人一百二十八名;
ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ,
28 伯·亚斯玛弗人四十二名;
ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ,
29 基列·耶琳人、基非拉人、比录人共七百四十三名;
ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ,
30 拉玛人和迦巴人共六百二十一名;
ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu,
31 默玛人一百二十二名;
ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ,
32 伯特利人和艾人共一百二十三名;
ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ,
33 别的尼波人五十二名;
ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ,
34 别的以拦子孙一千二百五十四名;
ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ,
35 哈琳的子孙三百二十名;
ndị Harim, narị atọ na iri abụọ,
36 耶利哥人三百四十五名;
ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise,
37 罗德人、哈第人、阿挪人共七百二十一名;
ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu,
38 西拿人三千九百三十名。
ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ.
39 祭司:耶书亚家,耶大雅的子孙九百七十三名;
Ndị nchụaja: ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ,
40 音麦的子孙一千零五十二名;
ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ,
41 巴施户珥的子孙一千二百四十七名;
ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa,
42 哈琳的子孙一千零一十七名。
ndị Harim, otu puku, na iri na asaa.
43 利未人:何达威的后裔,就是耶书亚和甲篾的子孙七十四名。
Ndị Livayị: ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ.
44 歌唱的:亚萨的子孙一百四十八名。
Ndị ọbụ abụ: ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ.
45 守门的:沙龙的子孙、亚特的子孙、达们的子孙、亚谷的子孙、哈底大的子孙、朔拜的子孙,共一百三十八名。
Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu: ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ.
46 尼提宁:西哈的子孙、哈苏巴的子孙、答巴俄的子孙、
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ: ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
47 基绿的子孙、西亚的子孙、巴顿的子孙、
Keros, Sia, Padon,
48 利巴拿的子孙、哈迦巴的子孙、萨买的子孙、
Lebana, Hagaba, Shalmai,
49 哈难的子孙、吉德的子孙、迦哈的子孙、
Hanan, Gidel, Gaha,
50 利亚雅的子孙、利汛的子孙、尼哥大的子孙、
Reaya, Rezin, Nekoda,
51 迦散的子孙、乌撒的子孙、巴西亚的子孙、
Gazam, Ụza, Pasea,
52 比赛的子孙、米乌宁的子孙、尼普心的子孙、
Besai, Meunim, Nefusim,
53 巴卜的子孙、哈古巴的子孙、哈忽的子孙、
Bakbuk, Hakufa, Hahua,
54 巴洗律的子孙、米希大的子孙、哈沙的子孙、
Bazlut, Mehida, Hasha,
55 巴柯的子孙、西西拉的子孙、答玛的子孙、
Bakos, Sisera, Tema,
56 尼细亚的子孙、哈提法的子孙。
Nezaya na Hatifa.
57 所罗门仆人的后裔,就是琐太的子孙、琐斐列的子孙、比路大的子孙、
Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida,
58 雅拉的子孙、达昆的子孙、吉德的子孙、
Jaala, Dakon, Gidel,
59 示法提雅的子孙、哈替的子孙、玻黑列·哈斯巴音的子孙、亚们的子孙。
Shefataya, Hatil, Pokeret-Hazebaim na Amọn.
60 尼提宁和所罗门仆人的后裔共三百九十二名。
Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ.
61 从特米拉、特哈萨、基绿、亚顿、音麦上来的,不能指明他们的宗族谱系是以色列人不是;
Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
62 他们是第莱雅的子孙、多比雅的子孙、尼哥大的子孙,共六百四十二名。
Ndị agbụrụ: Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ.
63 祭司中,哈巴雅的子孙、哈哥斯的子孙、巴西莱的子孙;因为他们的先祖娶了基列人巴西莱的女儿为妻,所以起名叫巴西莱。
Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ: Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).
64 这三家的人在族谱之中寻查自己的谱系,却寻不着,因此算为不洁,不准供祭司的职任。
Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha.
65 省长对他们说:“不可吃至圣的物,直到有用乌陵和土明决疑的祭司兴起来。”
Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.
66 会众共有四万二千三百六十名。
Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii,
67 此外,还有他们的仆婢七千三百三十七名,又有歌唱的男女二百四十五名。
nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa, ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise.
68 他们有马七百三十六匹,骡子二百四十五匹,
Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii, ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise,
69 骆驼四百三十五只,驴六千七百二十匹。
ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise, ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ.
70 有些族长为工程捐助。省长捐入库中的金子一千达利克,碗五十个,祭司的礼服五百三十件。
Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo, iri efere ọlaedo ise na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ.
71 又有族长捐入工程库的金子二万达利克,银子二千二百弥拿。
Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ.
72 其余百姓所捐的金子二万达利克,银子二千弥拿,祭司的礼服六十七件。
Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ, na minas ọlaọcha puku abụọ, na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa.
73 于是祭司、利未人、守门的、歌唱的、民中的一些人、尼提宁,并以色列众人,各住在自己的城里。
Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha. Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,

< 尼希米记 7 >