< 约伯记 40 >
Onyenwe anyị zara Job sị:
2 强辩的岂可与全能者争论吗? 与 神辩驳的可以回答这些吧!
“Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị? Ka onye ahụ na-ebo Chineke ebubo zaghachi ya.”
Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị:
4 我是卑贱的!我用什么回答你呢? 只好用手捂口。
“Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m.
Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
“Kwadoo onwe gị dịka dimkpa; enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị, achọkwara m ka i nye m ọsịsa.
8 你岂可废弃我所拟定的? 岂可定我有罪,好显自己为义吗?
“Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara?
Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke? Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya?
Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe.
11 要发出你满溢的怒气, 见一切骄傲的人,使他降卑;
Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ, weda ha nʼala,
12 见一切骄傲的人,将他制伏, 把恶人践踏在本处;
lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo.
13 将他们一同隐藏在尘土中, 把他们的脸蒙蔽在隐密处;
Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili.
Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.
15 你且观看河马; 我造你也造它。 它吃草与牛一样;
“Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya.
Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.
Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe.
19 它在 神所造的物中为首; 创造它的给它刀剑。
Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke, ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso.
Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu.
21 它伏在莲叶之下, 卧在芦苇隐密处和水洼子里。
Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri, zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị.
Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya, osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu.
23 河水泛滥,它不发战; 就是约旦河的水涨到它口边,也是安然。
Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ.
24 在它防备的时候,谁能捉拿它? 谁能牢笼它穿它的鼻子呢?
Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya, maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?