< 撒母耳记下 3 >
1 扫罗家和大卫家争战许久。大卫家日见强盛;扫罗家日见衰弱。
Agha dị nʼetiti ndị ụlọ Sọl na ụlọ Devid dịịrị ruo oge toro ogologo. Ma ka Devid na-aga nʼihu na-esiwanye ike, ụlọ Sọl na-aga azụ na-ada ada.
2 大卫在希伯 得了几个儿子:长子暗嫩是耶斯列人亚希暖所生的;
A mụtaara ọtụtụ ụmụ ndị ikom nye Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn nke, Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ.
3 次子基利押是作过迦密人拿八的妻亚比该所生的;三子押沙龙是基述王达买的女儿玛迦所生的;
Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ. Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua mụrụ.
4 四子亚多尼雅是哈及所生的;五子示法提雅是亚比她所生的;
Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit. Nke ise bụ Shefataya nwa Abital;
5 六子以特念是大卫的妻以格拉所生的。大卫这六个儿子都是在希伯 生的。
nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid. Ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn.
6 扫罗家和大卫家争战的时候,押尼珥在扫罗家大有权势。
O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl.
7 扫罗有一妃嫔,名叫利斯巴,是爱亚的女儿。一日,伊施波设对押尼珥说:“你为什么与我父的妃嫔同房呢?”
Ma Sọl nwererịị otu iko nwanyị aha ya bụ Rizpa, nwa Aịa. Ishboshet jụrụ Abna ajụjụ sị, “Gịnị mere gị na iko nwanyị nna m ji dinaa?”
8 押尼珥因伊施波设的话就甚发怒,说:“我岂是犹大的狗头呢?我恩待你父扫罗的家和他的弟兄、朋友,不将你交在大卫手里,今日你竟为这妇人责备我吗?
Iwe were Abna nke ukwuu nʼihi ihe Ishboshet kwuru. Ya mere, ọ zara, “Ọ bụ isi nkịta nke ụlọ Juda ka m bụ? Taa ka m ji obi m niile na-ejere ụlọ nna gị, bụ Sọl, na ezinaụlọ ya, na ndị enyi ya ozi. Ewerebeghị m gị nyefee nʼaka Devid. Ma lee, ugbu a i na-ebo m ebubo ajọ omume nʼihe metụtara nwanyị a.
9 我若不照着耶和华起誓应许大卫的话行,废去扫罗的位,建立大卫的位,使他治理以色列和犹大,从但直到别是巴,愿 神重重地降罚与我!”
Ka Chineke mesoo Abna mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m emereghị Devid ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye ya.
Ịnapụ ụlọ Sọl alaeze ahụ, na ime ka ocheeze Devid guzosie ike nʼebe Izrel niile na Juda niile nọ, site na Dan ruo Bịasheba.”
Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu.
12 押尼珥打发人去见大卫,替他说:“这国归谁呢?”又说:“你与我立约,我必帮助你,使以色列人都归服你。”
Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.”
13 大卫说:“好!我与你立约。但有一件,你来见我面的时候,若不将扫罗的女儿米甲带来,必不得见我的面。”
Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.”
14 大卫就打发人去见扫罗的儿子伊施波设,说:“你要将我的妻米甲归还我;她是我从前用一百非利士人的阳皮所聘定的。”
Devid ziri Ishboshet nwa Sọl ozi sị ya, “Dulatara m nwunye m Mikal, nʼihi na ọ bụ narị apị ndị Filistia ka m ji lụtara ya onwe m.”
15 伊施波设就打发人去,将米甲从拉亿的儿子、她丈夫帕铁那里接回来。
Na-atụfughị oge, Ishboshet nyere iwu ka e site nʼaka di ya bụ Paltiel, nwa Laish, kpọpụta ya.
16 米甲的丈夫跟着她,一面走一面哭,直跟到巴户琳。押尼珥说:“你回去吧!”帕铁就回去了。
Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa.
17 押尼珥对以色列长老说:“从前你们愿意大卫作王治理你们,
Abna na ndị okenye Izrel kparịtara ụka. Ọ chetaara ha sị ha, “Ọ dịla anya kemgbe unu na-achọ ka Devid bụrụ eze unu.
18 现在你们可以照心愿而行。因为耶和华曾论到大卫说:‘我必借我仆人大卫的手,救我民以色列脱离非利士人和众仇敌的手。’”
Ugbu a meenụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị kweere Devid nkwa, ‘Site nʼaka ohu m bụ Devid ka m ga-esi zọpụta ndị m bụ Izrel site nʼaka ndị Filistia, nakwa site nʼaka ndị iro ha niile.’”
19 押尼珥也用这话说给便雅悯人听,又到希伯 ,将以色列人和便雅悯全家一切所喜悦的事说给大卫听。
Abna gwakwara ndị Benjamin okwu. Emesịa, o jere Hebrọn ịgwa Devid ihe niile ndị Izrel na ndị Benjamin zubere ime.
20 押尼珥带着二十个人来到希伯 见大卫,大卫就为押尼珥和他带来的人设摆筵席。
Abna, ya na iri ndị ikom abụọ so gakwuru Devid na Hebrọn. Mgbe ha ruru, Devid meere ha oke oriri.
21 押尼珥对大卫说:“我要起身去招聚以色列众人来见我主我王,与你立约,你就可以照着心愿作王。”于是大卫送押尼珥去,押尼珥就平平安安地去了。
Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo.
22 约押和大卫的仆人攻击敌军,带回许多的掠物。那时押尼珥不在希伯 大卫那里,因大卫已经送他去,他也平平安安地去了。
Nʼotu mgbe ahụ, ndị ikom Devid na Joab si nʼebe ha gara ịpụnara ndị mmadụ ihe lọta, bukọrọ ọtụtụ ihe nkwata. Ma Abna anọghịkwa na Hebrọn ya na Devid, nʼihi na Devid ezipụla ya, ọ pụọla nʼudo.
23 约押和跟随他的全军到了,就有人告诉约押说:“尼珥的儿子押尼珥来见王,王送他去,他也平平安安地去了。”
Mgbe Joab na ndị agha ya lọtara, a kọọrọ ya na Abna, nwa Nea, bịara hụ eze, na ọ laakwala nʼudo.
24 约押去见王说:“你这是做什么呢?押尼珥来见你,你为何送他去,他就踪影不见了呢?
Ya mere Joab jekwuuru eze sị ya, “Gịnị ka i mere? Lee, Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ laa? Lee ya ugbu a, ọ laala!
25 你当晓得,尼珥的儿子押尼珥来是要诓哄你,要知道你的出入和你一切所行的事。”
Ị maara onye Abna nwa Nea bụ? Ọ bịara ịghọ gị aghụghọ, na inyocha njegharị gị, ịchọpụta ihe niile ị na-eme.”
26 约押从大卫那里出来,就打发人去追赶押尼珥,在西拉井追上他,将他带回来,大卫却不知道。
Mgbe Joab si nʼihu Devid pụta, o zipụrụ ndị ozi ka ha sochie Abna azụ, gwa ya ka ọ laghachi. Ha hụrụ ya nʼolulu mmiri Sira. O sokwara ha laghachi, ma Devid amaghị ihe banyere nke a.
27 押尼珥回到希伯 ,约押领他到城门的瓮洞,假作要与他说机密话,就在那里刺透他的肚腹,他便死了。这是报杀他兄弟亚撒黑的仇。
Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel.
28 大卫听见了,就说:“流尼珥的儿子押尼珥的血,这罪在耶和华面前必永不归我和我的国。
Mgbe emesịrị, Devid nụrụ banyere ya, ọ sịrị, “Aka m dị ọcha, ya na nke alaeze m nʼihu Onyenwe anyị banyere ọbara Abna, nwa Nea.
29 愿流他血的罪归到约押头上和他父的全家;又愿约押家不断有患漏症的,长大麻风的,架拐而行的,被刀杀死的,缺乏饮食的。”
Ka ikpe ọmụma a dakwasị Joab nʼisi, nakwa ezinaụlọ nna ya niile, ka a gharakwa ịhụ nʼụlọ Joab onye na-adịghị arịa ọrịa ahụ ihe ntokasị, maọbụ ọrịa ekpenta, maọbụ onye ji mkpara eji akpa akwa, maọbụ onye ga-anwụ site na mma agha, maọbụ onye ụkọ nri adịghị akọ.”
30 约押和他兄弟亚比筛杀了押尼珥,是因押尼珥在基遍争战的时候杀了他们的兄弟亚撒黑。
Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn.
31 大卫吩咐约押和跟随他的众人说:“你们当撕裂衣服,腰束麻布,在押尼珥棺前哀哭。”大卫王也跟在棺后。
Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ.
32 他们将押尼珥葬在希伯 。王在押尼珥的墓旁放声而哭,众民也都哭了。
Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.
33 王为押尼珥举哀,说: 押尼珥何竟像愚顽人死呢?
Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị, “O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu?
34 你手未曾捆绑,脚未曾锁住。 你死,如人死在罪孽之辈手下一样。 于是众民又为押尼珥哀哭。
E kekwaghị aka gị abụọ ihe. E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ. Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.” Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya.
35 日头未落的时候,众民来劝大卫吃饭,但大卫起誓说:“我若在日头未落以前吃饭,或吃别物,愿 神重重地降罚与我!”
Mgbe ahụ, ndị mmadụ bịakwutere Devid rịọọ ka o ritụ ihe, mgbe ìhè ụbọchị ka dị, ma Devid ṅụrụ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m edetụ achịcha maọbụ ihe ọbụla ọzọ ọnụ tutu ruo mgbe anyanwụ dara.”
36 众民知道了就都喜悦。凡王所行的,众民无不喜悦。
Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ.
37 那日,以色列众民才知道杀尼珥的儿子押尼珥并非出于王意。
Nʼụbọchị ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ ka Izrel niile matara na eze amaghị ihe banyere ọnwụ Abna, nwa Nea.
38 王对臣仆说:“你们岂不知今日以色列人中死了一个作元帅的大丈夫吗?
Devid jụrụ ndị ikom ya ajụjụ sị, “Unu ghọtakwara na onye a dara nʼIzrel taa bụ nwa eze na onye dị mkpa?
39 我虽然受膏为王,今日还是软弱;这洗鲁雅的两个儿子比我刚强。愿耶和华照着恶人所行的恶报应他。”
Ọ bụ ezie na m bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ ịbụ eze, ma o nweghị ihe m pụrụ ime ụmụ ndị ikom Zeruaya ndị a, nʼihi na ha dị ike karịa m. Ka Onyenwe anyị kwụghachi onye ọjọọ ihe ọjọọ ọ mere.”