< 列王纪下 21 >

1 玛拿西登基的时候年十二岁,在耶路撒冷作王五十五年。他母亲名叫协西巴。
Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Hefziba.
2 玛拿西行耶和华眼中看为恶的事,效法耶和华在以色列人面前赶出的外邦人所行可憎的事。
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel.
3 重新建筑他父希西家所毁坏的邱坛,又为巴力筑坛,做亚舍拉像,效法以色列王亚哈所行的,且敬拜事奉天上的万象;
O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya lara nʼiyi. O wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nye Baal, pịakwa ogidi Ashera, dịka Ehab eze Izrel mere. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe, feekwa ha ofufe.
4 在耶和华殿宇中筑坛。耶和华曾指着这殿说:“我必立我的名在耶路撒冷。”
O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.”
5 他在耶和华殿的两院中为天上的万象筑坛,
O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe, nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
6 并使他的儿子经火,又观兆,用法术,立交鬼的和行巫术的,多行耶和华眼中看为恶的事,惹动他的怒气;
O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.
7 又在殿内立雕刻的亚舍拉像。耶和华曾对大卫和他儿子所罗门说:“我在以色列众支派中所选择的耶路撒冷和这殿,必立我的名,直到永远。
O were chi Ashera a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke Onyenwe anyị gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.
8 以色列人若谨守遵行我一切所吩咐他们的和我仆人摩西所吩咐他们的一切律法,我就不再使他们挪移离开我所赐给他们列祖之地。”
Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.”
9 他们却不听从。玛拿西引诱他们行恶,比耶和华在以色列人面前所灭的列国更甚。
Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
10 耶和华借他仆人众先知说:
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị,
11 “因犹大王玛拿西行这些可憎的恶事比先前亚摩利人所行的更甚,使犹大人拜他的偶像,陷在罪里;
“Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie.
12 所以耶和华—以色列的 神如此说:我必降祸与耶路撒冷和犹大,叫一切听见的人无不耳鸣。
Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru.
13 我必用量撒马利亚的准绳和亚哈家的线铊拉在耶路撒冷上,必擦净耶路撒冷,如人擦盘,将盘倒扣。
Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala.
14 我必弃掉所余剩的子民,把他们交在仇敌手中,使他们成为一切仇敌掳掠之物;
Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile,
15 是因他们自从列祖出埃及直到如今,常行我眼中看为恶的事,惹动我的怒气。”
nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.”
16 玛拿西行耶和华眼中看为恶的事,使犹大人陷在罪里,又流许多无辜人的血,充满了耶路撒冷,从这边直到那边。
Nke ka nke, Manase gbukwara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha, ruo na ọ wụsaara ọbara ha site nʼotu akụkụ Jerusalem ruo nʼakụkụ nke ọzọ ya, nke a agụnyeghị mmehie ahụ nke o dubara ndị Juda ime, nke mere ka ha mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
17 玛拿西其余的事,凡他所行的和他所犯的罪都写在犹大列王记上。
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ihe niile o mere, tinyere mmehie niile nke o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
18 玛拿西与他列祖同睡,葬在自己宫院乌撒的园内;他儿子亚们接续他作王。
Manase soro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼime ubi a gbara ogige nʼụlọeze ya, bụ ubi Ụza a gbara ogige. Amọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
19 亚们登基的时候年二十二岁,在耶路撒冷作王二年。他母亲名叫米舒利密,是约提巴人哈鲁斯的女儿。
Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Meshulemet, ada Haruz onye Jotba.
20 亚们行耶和华眼中看为恶的事,与他父亲玛拿西所行的一样;
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Manase mere.
21 行他父亲一切所行的,敬奉他父亲所敬奉的偶像,
Ọ gbasoro ụzọ ahụ niile dị iche nke nna ya gbasoro. O fere arụsị niile nke nna ya fere, kpọọkwa isiala nye ha.
22 离弃耶和华—他列祖的 神,不遵行耶和华的道。
Ọ jụrụ iso Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha, jụkwa ibi ndụ irube isi nye ya.
23 亚们王的臣仆背叛他,在宫里杀了他。
Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu eze nʼime ụlọeze ya.
24 但国民杀了那些背叛亚们王的人,立他儿子约西亚接续他作王。
Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.
25 亚们其余所行的事都写在犹大列王记上。
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amọn na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
26 亚们葬在乌撒的园内自己的坟墓里。他儿子约西亚接续他作王。
E liri ya nʼili nke aka ya, dị nʼogige Ụza. Josaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

< 列王纪下 21 >