< 提多書 2 >

1 至於你,你所講的,該合乎健全的道理;
Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.
2 教訓老人應節制、端莊。慎重,在信德、愛德和忍耐上,要正確健全。
Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi.
3 也要教訓老婦在舉止上要聖善,不毀謗人,不沉淪於酒,但教人行善,
Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma.
4 好能教導青年婦女愛丈夫、愛子女、
Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya.
5 慎重、貞潔、勤理家務、善良、服從自己的丈夫,免得抵毀天主的聖道。
Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.
6 你也要教訓青年人在一切事上要慎重。
Nʼotu ụzọ ahụ kwa, gbaakwa ụmụ okorobịa ume ka ha jide onwe ha.
7 你該顯示自己的為行善的模範,在教導上應表示純正莊重,
Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
8 要講健全無可指摘的話,使反對的人感到慚愧,說不出我們什麼不好來。
Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.
9 教訓奴隸在一切事上要服從自己的主人,常叫他們喜悅,不要抗辯,
Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe niile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu,
10 不要竊取,惟要事事表示自己實在忠信,好使我們救主天主的聖道,在一切事上獲得光榮。
ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.
11 的確,天主救眾人的恩寵已經出現,
Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè.
12 教導我們棄絕不虔敬的生活,和世俗的貪慾,有節制,公正地、虔敬地在今世生活, (aiōn g165)
Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. (aiōn g165)
13 期待所希望的幸福,和我們偉大的天主及救主耶穌基督的顯現。
Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst.
14 衪為我們捨棄了自己,是為救贖我們脫離一切罪惡,洗淨我們,使我們能成為衪的選民,叫我們熱心行善。
Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.
15 你要宣講這些事,以全規勸和指摘,不要讓任何人輕視你。
Na-akụzi ihe ndị a, werekwa ha na-adụ ndị gị ọdụ site nʼikike niile i nwere. Werekwa ha na-atụ ha mmehie ha nʼihu. Ka mmadụ ọbụla ghara ilelị gị anya.

< 提多書 2 >