< 路得記 4 >
1 波阿次走上城門口,坐在那裏。可巧,波阿次所說的那位至親,正從那裏經過,他就對他說:「某兄,請過來,坐一坐! 」他就過去坐下了。
Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala.
2 波阿次又由城內的長老中,邀請了十位,對他們說:「請你們在這裏坐一坐! 」他們就都坐下。
Boaz kpọrọ mmadụ iri, ndị bụ ndị okenye obodo ahụ, gwa ha, “Nọdụnụ ala nʼebe a.” Ha mere otu ahụ.
3 波阿次便對那位至親說:「從摩阿布鄉間回來的納敖米要賣我們兄弟厄里默肋客的一塊田。
Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek.
4 我認為我應在你面前說明這事,並請你當著在坐的諸位及民眾的長老前,購買這塊地。若你願意盡你至親的義務,就盡;若你不願意盡,起告訴我知道;因為除你應盡這義務之外,沒有別人了;你以後就是我。」那人答說:「我盡。」
Ahụrụ m na o kwesiri ka m buru ụzọ gwa gị ka ị zụọ ya nʼihu ndị a nọ ọdụ nʼebe a, na nʼihu ndị okenye obodo anyị. Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gwa m, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị agbara ya, gwa m, ka m mara ihe m ga-eme. Nʼihi na ọ bụ gị ka ọ dịrị ịgbapụta ya. Mụ onwe m na-esote gị.” Ọ zara sị, “Aga m agbapụta ya.”
5 波阿次接著說:「你從納敖米手中購得田地的那一天,也應娶亡者之妻,即摩阿布女子盧德,好給死者在嗣業上留名。」
Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.”
6 那位至親答說:「那麼我就不能盡這義務了,免得我的產業受害,你盡我應盡的義務罷! 我不能盡了。」
Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.”
7 從前在以色列中間,無論對於買賣或交易,為確定一事,有這樣的一個風俗:就是一方應脫下自己的鞋,交與另一方:這在以色列就算為證據。
Na mgbe ochie nʼala Izrel, ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel.
8 那為至親對波阿次說:「你購買罷! 」遂就脫下了自己的鞋。
Nʼihi ya, mgbe nwoke ahụ gwara Boaz sị ya, “Zụrụ ala ahụ nʼonwe gị,” o yipụtara akpụkpọụkwụ ya.
9 於是波阿次對長老以及所有在坐的民眾說:「今天你們作證,我從納敖米手中購得了屬於厄里默肋客及基肋雍與瑪赫隆的一切產業;
Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere.
10 同時我也取得了瑪赫隆的妻,摩阿布的女子盧德為我的妻室,好給死者在嗣業上留名,不叫死者的名字,在自己的兄弟和故鄉的門戶中失傳;今日你們為此作證! 」
Azụrụkwala m Rut onye Moab, nwunye Mahlọn ka ọ bụrụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide, ka aha ha hapụ ifu nʼetiti ndị ikwu ya maọbụ site nʼobodo ebe amụrụ ya. Taa unu niile bụ ndị akaebe m.”
11 在城門旁的民眾和長老都回答說:「我們作證。願上主使這走進你家中的婦女,像似那兩位曾建立了以色列家的辣黑耳和肋阿! 願你在厄弗辣大昌盛,願你在白冷得享盛名!
Mgbe ahụ, ndị okenye na ndị niile nọ nʼọnụ ụzọ ama kwuru sị, “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Onyenwe anyị mee nwanyị a na-abata nʼezinaụlọ gị ka ọ dịrị ka Rechel na Lịa, ndị ebo Izrel niile sitere na ha pụta! Ka ị bụrụkwa ọgaranya nʼagbụrụ Efrata, ghọọkwa onye a ma ama na Betlehem.
12 願你的家藉上主使這少婦給你所生的後裔,相似塔瑪爾給猶大所生的培勒茲的家。」波阿次娶盧德
Site nʼụmụ Onyenwe anyị ga-enye gị site na nwanyị a, ka ezinaụlọ gị dịrị ka nke Perez onye Tama mụụrụ Juda.”
13 波阿次遂娶了盧德,她就成了他的妻子。他走近了他,上主賜她懷孕,生了一個兒子。
Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, Onyenwe anyị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.
14 婦女們就對納敖米說:「願上主受頌揚! 因為他沒有使你今日缺乏承繼者。願他在以色列中得享盛名!
Mgbe ahụ, ndị inyom obodo ahụ bịakwutere Naomi sị ya, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye na-agbawaghị gị aka onye agbụrụ mgbapụta dị nso. Ka aha ya bụrụ ihe ga-ada ụda nʼala Izrel niile.
15 他是你心靈的安慰,是你老年的依靠,因為他是愛你的兒媳所生的;像這樣的兒媳,對你實勝過七個兒子。」
Ya wetakwara gị ntute na ndụ gị ma bụrụkwa onye ga-azụ gị nʼisi awọ gị. Nʼihi na nwunye nwa gị, onye hụrụ gị nʼanya, onye baara gị uru karịa ndị ikom asaa, amụọrala gị nwa nwoke.”
Naomi kuuru nwantakịrị ahụ, jikụọ ya nʼapata ya, lekọtaa ya.
17 鄰近的婦女喊著說:「納敖米得了個兒子! 」他們就給他起名叫敖貝得;他就是達味的父親葉瑟的父親。達味族譜
Ndị inyom ndị agbataobi ya sịrị, “Ugbu a, nʼikpeazụ, Naomi enwetala nwa nwoke ọzọ!” Ha gụrụ ya Obed. Ọ bụkwa onye ahụ bụ nna Jesi, onye bụ nna Devid.
Nke a bụ usoro ndị a mụrụ site na Perez. Perez mụrụ Hezrọn
Hezrọn mụrụ Ram Ram mụrụ Aminadab
Aminadab mụrụ Nashọn Nashọn mụrụ Salmọn
Salmọn mụrụ Boaz Boaz mụrụ Obed
Obed mụrụ Jesi Jesi mụrụ Devid.