< 詩篇 77 >

1 阿撒夫的詩歌,交與樂官耶杜通。 我呼號,我的呼聲上達天主前,我向天主高呼,求他俯聽矜憐。
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma. Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka; etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.
2 我在患難之日,尋求上主,雖整夜伸手,亦不覺辛苦,我的心靈且不接受安撫。
Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ. Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
3 我一懷念天主,即咨嗟哀歎,我一沉思考慮,即心灰意懶。
O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. (Sela)
4 您使我的眼睛徹夜不眠,我實煩燥難安,苦不堪言。
I kweghị ka anya m abụọ mechie; nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.
5 我回憶往昔的時日,我懷念過去的歲月。
Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, na afọ niile ndị gara aga.
6 我的心靈夜間默默自問,我的神魂時時沉思質詢:
Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị. Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
7 難道天主永遠拒絕,難道不再回顧憐愛?
“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?
8 難道他的恩愛永遠停止,他的諾言也將永世廢棄?
Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla? Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?
9 難道天主忘記了慈悲﹖因憤怒而將慈愛關閉?
Chineke, o chefuola i mere anyị ebere? O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” (Sela)
10 因此我說:這是我的苦難:至高者的右手已經改變。
Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.
11 我現今追念上主的作為,回想您往昔所行的奇蹟;
Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
12 沉思您的一切所作所為,更要默想您的一切異事。
Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
13 天主,您的行徑完全在於聖化,何神像我們的天主如此偉大?
O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ. Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?
14 只有您是施行奇蹟的天主!在萬民中彰顯了您的威武。
Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
15 您以臂力拯救了您的人民,就是雅各伯和若瑟的子孫。
I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. (Sela)
16 大水一旦看見您,天主,大水一見您就都恐怖,連深淵汪洋也都顫抖。
Osimiri hụrụ gị, O Chineke, osimiri hụrụ gị, taa; ogbu mmiri mere mkpọtụ.
17 雲天大雨傾降,烏雲發出巨響,火箭滿天飛翔。
Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile.
18 您的雷霆在旋風中發響,閃電也將整個世界照亮,大地驚慌失措而又搖盪。
A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, amụma gị nyere ụwa niile ihe; elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.
19 您的道路雖然經過海底,您的途徑雖然穿越大水,卻沒有顯露出您的足跡。
Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
20 您曾藉著梅瑟和亞郎的手掌,領導您的子民有如領導群羊。
I sitere nʼaka Mosis na Erọn duo ndị gị dịka igwe atụrụ.

< 詩篇 77 >