< 詩篇 66 >
Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
3 請您們向天主說:您的作為是何等驚人!您威赫的大能,您的仇敵都向您奉承。
Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” (Sela)
5 請您們前來觀看天主的作為,他對世人作的事實在可奇。
Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
6 他曾使海洋乾涸,使人徒步走過江河,叫我們因他而喜樂。
O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.
7 他以自己的大能,永遠統治列國萬邦,他的眼睛鑒察萬民,不使叛逆者狂妄。
Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. (Sela)
8 萬民,請您們讚美我們的天主,請傳揚天主應受的榮耀。
Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;
O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.
10 天主,因為您曾考驗我們,像鍊銀子一般,也鍊我們;
Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.
11 您曾引領我們墜入了網羅,曾將鐵索繫在我們的身腰;
Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.
12 您曾使異民騎在我們頭上,使我們經過水深火熱中央,最後您使我們獲得解放。
I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.
13 我帶著全燔祭進入您的聖殿,我要向您償還我的各種誓願:
Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị
14 就是我從前在困厄中間,我口所許,我唇所發的願。
nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
15 我要以肥大牲畜作全燔祭,要把公羊的馨香獻與您,要將牛犢和山羊祭奠您。
Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. (Sela)
16 凡敬愛天主的人,請您們前來靜聽,我要敘述祂為我所作所行。
Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m.
Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.
Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;
19 然而天主終於俯聽了我,也傾聽了我哀號的祈禱,
ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.
20 天主應受讚美:因祂從未拒絕我的懇求,從未在我身上撤回祂的仁慈。
Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!