< 詩篇 60 >

1 達味金詩,交與樂官。 約阿布歸來,在鹽谷殺了一萬二千人。 天主,你拋棄了我們,粉碎了我們!你曾發怒,今求你復興我們。
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu. O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
2 你曾使大地震動,使地裂土崩,求你彌補裂縫,因它搖搖不定。
I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
3 你使你的百姓遭受艱苦,使我們喝了麻醉的烈酒。
I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
4 然後你為敬愛你的人,豎起旗幟,為使他們閃避仇敵的弓矢;
Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. (Sela)
5 為叫你所愛的人,獲得救恩;求你以右手協助,垂允我們。
Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
6 天主在自己的聖所說:「我要凱旋,將舍根分疆,將穌苛特的平原測量。
Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
7 基肋阿得地屬於我,默納協地也屬於我;我的頭盔就是厄弗辣因,猶大成為我手中的權棍;
Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
8 摩阿布是我的沐浴池,我向厄東投我的鞋隻,我還要戰勝培肋舍特。
Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
9 誰弔領我進入堅城,誰領導我走進厄東?
Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
10 天主,莫非你已將我們拋棄,難道不率領我軍出擊?
Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
11 求你援助我們抵抗仇讎,因為人的援助盡是虛無。
Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
12 我們倚靠天主奮勇行事,祂必要,踐踏我們的仇敵。
Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

< 詩篇 60 >