< 詩篇 116 >

1 我對上主愛慕傾心,因祂俯聽我的禱聲;
Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
2 在我呼籲祂的那日,祂向我側祂的聖耳。
Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
3 死亡的圈套纏住了我,陰府的羅網縛住了我, (Sheol h7585)
Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. (Sheol h7585)
4 我呼求了上主的聖名,上主,求您救我的性命。
Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
5 上主富有憐憫和正義,我們的天主仁愛無比;
Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
6 上主,保護誠樸的人,我若軟弱,祂必救助。
Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
7 我的靈魂,您回到您的安息,因為上主實在是厚待了您。
Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
8 因為祂救拔我的靈魂脫免死亡,不使我的眼睛流淚,不使我的腳跌傷。
Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
9 我要在人的地域,在上主的面前行走。
ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
10 雖然說我已痛苦萬分,但是我仍然抱有信心。
Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
11 我在彷徨中曾說:眾人都虛詐不誠。
nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
12 我要怎樣報謝上主,謝祂賜給我的一切恩佑?
Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
13 我要舉起救恩的杯,我要呼顅上主的名,
Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
14 我要在眾百姓面前,向上主還我的誓願。
Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
15 上主的聖者的去世,在上主的眼中十分珍貴。
Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
16 我的上主!我是您的僕役,您僕役是您婢女的兒子;您將我的鎖鏈給我開釋,
O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
17 我要給您奉獻讚頌之祭,我要呼號上主的名字。
Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
18 我要在眾百姓面前,向上主還我的誓願,
Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
19 要在上主聖殿的庭院,耶路撒冷! 即在您中間。
nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.

< 詩篇 116 >