< 箴言 7 >

1 我兒,你要持守我的訓言,把我的誡命藏在心中;
Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.
2 你要遵守我的誡命,好叫你得以生存;應恪守我的教訓,像保護你眼中的瞳人。
Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.
3 應將我的誡命繫在指間,刻在心上;
Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
4 應對智慧說:「你是我的姊妹,」並應稱睿智為你的女友,
Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.
5 好能保護你遠避奸婦,即那甜言蜜語的淫婦。
Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.
6 我曾由我家的窗口,透過窗格往外觀看,
Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,
7 分明看見在愚昧人中,在少年人中,有一個無知的少年,
hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ,
8 沿著淫婦屋角的街道經過,向她的住宅走去,
ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme,
9 那時正是黃昏,日已西沉,已入黝黑深夜。
nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi.
10 看,有一個女人向他迎面而來──她身穿妓裝,存心不軌;
Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.
11 她健談好蕩,不能停留家中:
(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.
12 一會在街頭,一會在市場,在每個角落上兜搭──
Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)
13 她遂上前擁抱那少年,與他接吻,嬉皮笑臉對他說:「
O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:
14 我原許過願,要獻和平祭,今日纔得償還我許的願。
“Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
15 所以我走了出來,好能與你相遇;我急切尋找你,可好現在我見了你。
Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.
16 我的床榻已舖設了絨毯,放上了埃及的線繡臥單;
Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
17 又用沒藥、蘆薈和肉桂薰了我的睡床。
Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m.
18 來讓我們通宵達旦,飽享愛情;讓我們在歡愛中盡情取樂,
Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.
19 因為我的丈夫現不在家,他已出外遠行,
Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.
20 隨身帶了錢囊,不到月圓不歸家。」
O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”
21 淫婦用許多花言巧語籠絡他,以諂言媚語勾引他。
Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.
22 少年遂跟她去了,好像一隻引入屠場的公牛,又像一隻自陷圈套的牡鹿,
O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya,
23 直至箭矢射穿他的心肝;他還像一隻跳入羅網的小鳥,不知這與他的性命有關。
nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.
24 現在,孩子! 你們應聽從我,留意我口中的訓言:
Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu.
25 不要讓你的心傾向她的道路,不要誤入她的迷途,
Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị.
26 因為她使許多人倒地身亡,連最強健的,都作了她的犧牲。
Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya.
27 她的家是通往陰府的大道,是引入死境的斜坡。 (Sheol h7585)
Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ. (Sheol h7585)

< 箴言 7 >