< 箴言 4 >

1 孩子,你們要聽父親的教訓,專心學習明智,
Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu, lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
2 因為我把好教訓授給你們,你們不要拋棄我的規勸。
Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu; ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
3 我也曾在父親面前作過孝子,在我母親膝下是唯一的嬌兒。
Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m, mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
4 我父曾訓誨我說:你應留心牢記我的話,遵守我的命令,好使你生存;
ọ ziri m ihe, sịkwa m, “Ka obi gị jidesie okwu m niile ike, debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
5 你應緊握智慧,握住明智,不要忘記,也不要離棄我口中的教訓:
Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
6 你若不捨棄她,她必護佑你;你若喜愛她,她必看顧你。
Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
7 首先應爭取的是智慧,因此你應尋求智慧,應犧牲一切去爭取明智。
Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
8 你若顯揚智慧,智慧也必顯揚你;你若懷抱她,她也必光榮你:
Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
9 將華冠加在你的頭上,將榮冕賜給你。
Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”
10 我兒,你若聽取我的訓言,你必延年益壽。
Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
11 我要教給你智慧的道路,引你走上正直的途徑:
M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
12 這樣,你若行走,你的腳決不會受阻礙;即便你奔馳,也決不致顛仆。
Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
13 你要堅持教訓,切勿把她拋棄;你應保存她,因為她是你的生命。
Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
14 惡人的道路,你不要進去;壞人的途徑,你不要踏入;
Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
15 反應躲避,不經其上;遠遠離去,繞道他往。
Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
16 因為他們不作惡,不能入睡;不使人跌倒,就要失眠。
nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
17 他們吃的是邪惡的餅,飲的是暴虐的酒。
Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.
18 但是,義人的途徑,像黎明的曙光,越來越明亮,直至成日中;
Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
19 惡人的道路,卻宛如幽暗,他們不知道,要跌在何處。
Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
20 我兒,你要注意我的訓言,側耳傾聽我的教導;
Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma.
21 不要讓她離開你的視線,卻要牢記在心中。
Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
22 因為,凡找著她的,必獲得生命;他整個身軀,必獲得健康。
nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.
23 在一切之上,你要謹守你的心,因為生命是由此而生。
Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
24 你應摒絕口舌的欺詐,遠避唇舌的乖謬。
Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
25 你的眼睛應向前直視,你的視線應向前集中。
Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
26 你要修平你腳下的行徑,要鞏固你一切的路途。
Leruo ije ụkwụ gị anya, doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
27 你斷不可左傾右依,務使你的腳遠離邪惡。
Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe; si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.

< 箴言 4 >