< 箴言 28 >

1 惡人無人追蹤,仍然竄逃;義人安然自得,有如雄獅。
Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
2 由於國家的罪,領袖時有更迭;惟賴明哲之士,邦國方能久存。
Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
3 欺壓弱小的惡霸,有如沖沒穀糧的暴雨。
Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
4 違法的人,稱揚敗類;守法的人,與之為敵。
Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.
5 作惡的人,不明瞭正義;尋求上主的,卻全洞識。
Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.
6 為人正直的窮人,勝於行為邪僻的富人。
Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.
7 遵守法律的,是智慧之子;交結蕩子的,是取辱己父。
Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
8 誰放貸取利增加己產,是為憐恤貧乏者積蓄。
Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye, na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.
9 對於法律,人若充耳不聞,他的祈禱,也為上主所惡。
Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị, ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.
10 勾引正直的人走上邪路的,必落在自己所掘的坑內;但正直的人仍能繼承幸福。
Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ, ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara, ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.
11 富貴的人,自認為有智慧,聰明的窮人一眼即看穿。
Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe, ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.
12 義人獲勝,群情歡騰;惡霸當道,人人走避。
Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ, ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.
13 文過飾非的,必不會順利;認錯悔改的,將蒙受憐憫。
Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
14 常戒慎的人,必蒙祝福;心硬如鐵者,必遭災禍。
Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke, ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
15 暴君欺凌貧窮弱小,有如咆哮怒獅,飢餓野熊。
Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.
16 無知的昏君,必橫行霸道;憎恨貪婪的,將延年益壽。
Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya; ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.
17 身負血債者,雖逃至死地,也無人搭救。
Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe ruo ala mmụọ. Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.
18 行走正路的,必安然無恙;愛走曲徑的,必墮入陷阱。
Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe, ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.
19 自耕其地的,必常得飽食;追求虛幻的,必飽嘗貧苦。
Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.
20 忠誠篤實的人,將滿渥福祉;急於致富的人,將難免無過。
Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị, ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.
21 顧及人的情面,原非一件好事;但為一片麵包,人卻陷身不義。
Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya. Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.
22 眼睛貪婪的人,匆匆急於致富;豈知貧乏窮困,即將臨他身上!
Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.
23 責斥他人的,終比奉承的,更得人愛戴。
Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.
24 向自己父母行竊,卻說「這並不是罪,」與強盜是同路人。
Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa, “Olee ihe ọjọọ dị na ya?” Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.
25 貪得無厭的人,必引起爭端;信賴上主的人,必心安理得。
Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu, ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.
26 自恃聰明的,實是糊塗人;行事智慧的,必安全無恙。
Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.
27 樂施濟貧的,決不會匱乏;視若無睹的,必飽受咒罵。
Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.
28 惡霸當道,人人走避;惡霸滅亡,義人興旺。
Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha, ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.

< 箴言 28 >