< 箴言 19 >

1 窮而行為正直,勝於富而唇舌欺詐。
Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
2 熱誠無謀,誠不可取;步伐匆忙,難免失足。
Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
3 人因愚蠢自毀前途;他的心反遷怒上主。
Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
4 財富招來許多朋友,窮人卻為親朋所棄。
Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
5 作假見證的人,難免受罰;撒播謊言的人,勢必難逃。
Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
6 大方的人,人人奉承;好施的人,人都諂媚。
Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
7 人窮兄弟恨,朋友更遠離;誰追求空言,是捕風捉影。
Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
8 獲得明哲的,必愛惜自己;珍惜明智的,必覓得幸福。
Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
9 作假見證的人,難免受罰;撒播謊言的人,自趨滅亡。
Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ, onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
10 安逸的生活,不適於愚人;奴隸管君主,更是不相宜。
Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya; ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
11 明智的人,緩於發怒,寬恕愆尤,引以為榮。
Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
12 君主的盛怒,有如獅子的怒吼;君王的恩惠,有如草上的朝露。
Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm. Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
13 愚昧的兒子,是父親的災禍;吵鬧的女人,有如屋頂漏水。
Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna, nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm, mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
14 房屋與錢財,是父母的遺產;賢明的妻子,是上主的恩賜。
Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
15 懶慢怠惰,使人沉睡;閒蕩的人,必要挨餓。
Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
16 恪守上主誡命的,可保全生命;輕視上主道路的,必自趨喪亡。
Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
17 向窮人施捨,是借貸於上主;對他的功德,上主必要報答。
Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
18 尚有希望時,應懲罰兒子;但不可存心置他於死地。
Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
19 易怒的人,應當受罰:你越寬容,使他越乖戾。
Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
20 你應聽取勸告,接受教訓,使你今後成個明智的人。
Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
21 人在心中儘可策劃多端,實現的卻是上主的計劃。
Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
22 慷慨為人有利,窮漢勝過騙子。
Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
23 敬畏上主,使人得生命,滿懷敬畏,必無殃無禍。
Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
24 懶惰人伸手到食盤,卻懶於送回到口邊。
Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
25 你若杖責輕狂人,幼稚者將變明智;你只譴責明智者,他即更明瞭義理。
Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
26 苛待父親,迫走母親的,實是卑賤可恥的兒子。
Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
27 我兒,你停止聽取教訓,就是遠離智慧的訓言。
Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m, ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.
28 邪曲的見證,戲笑公義;惡人們的嘴,吞食不義。
Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo. Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.
29 體刑是為輕狂人而設,鞭笞是為愚人背而備。
Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ; a ga-etikwa ha ihe.

< 箴言 19 >