< 箴言 1 >

1 以色列王達味之子撒羅滿的箴言:
Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
2 是為教人學習智慧和規律,叫人明瞭哲言,
Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
3 接受明智的教訓--仁義、公平和正直,
nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
4 使無知者獲得聰明,使年少者獲得知識和慎重,
Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
5 使智慧者聽了,增加學識;使明達人聽了,汲取智謀,
Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
6 好能明瞭箴言和譬喻,明瞭智者的言論和他們的隱語。
Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
7 敬畏上主是智慧的肇基;只有愚昧人蔑視智慧和規律。
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
8 我兒,你應聽你父親的教訓,不要拒絕你母親的指教,
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
9 因為這就是你頭上的冠冕,你頸上的珠鏈。
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
10 我兒,如果惡人勾引你,你不要聽從;
Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela!
11 如果他們說:「來跟我們去暗算某人,無故地陷害無辜。
Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
12 我們要像陰府一樣活活地吞下他們,把他們整個吞下去,有如墮入深坑裏的人; (Sheol h7585)
Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. (Sheol h7585)
13 這樣,我們必獲得各種珍寶,以贓物充滿我們的房屋。
Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.
14 你將與我們平分秋色,我們將共有同一錢囊。」
Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
15 我兒,你不要與他們同流合污,該使你的腳遠離他們的道路,
Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
16 因為他們雙腳趨向兇惡,急於傾流人血。
nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
17 在一切飛鳥眼前,張設羅網,盡屬徒然。
Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
18 其實,他們不外是自流己血,自害己命。
Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
19 這就是謀財害命者的末路:他必要送掉自己的性命。
Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.
20 智慧在街上吶喊,在通衢發出呼聲;
Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama.
21 在熱鬧的街頭呼喚,在城門和市區發表言論:「
Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
22 無知的人,你們喜愛無知;輕狂的人,你們樂意輕狂;愚昧的人,你們憎恨知識,要到何時呢﹖
“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
23 你們應回心聽我的勸告。看,我要向你們傾吐我的心意,使你們瞭解我的言詞。
Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m.
24 但是,我呼喚了,你們竟予以拒絕;我伸出了手,誰也沒有理會。
Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
25 你們既蔑視了我的勸告,沒有接受我的忠言;
ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
26 因此,你們遭遇不幸時,我也付之一笑;災難臨到你們身上時,我也一笑置之。
ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
27 當災難如暴風似的襲擊你們,禍害如旋風似的捲去你們,困苦憂患來侵襲你們時,我也置之不顧。
Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
28 那時,他們呼求我,我必不答應:他們尋找我,必尋不著我;
“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
29 因為他們憎恨知識,沒有揀選敬畏上主,
Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị.
30 沒有接受我的勸告,且輕視了我的一切規諫。
Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m. Unu lelịrị ịba mba m anya.
31 所以他們必要自食其果,飽嘗獨斷獨行的滋味。
Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.
32 的確,無知者的執迷不悟殺害了自己;愚昧人的漠不關心斷送了自己。
Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha, ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.
33 但是,那聽從我的,必得安居,不怕災禍,安享太平。
Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi. Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”

< 箴言 1 >