< 民數記 36 >

1 那時若瑟後裔的家族中,有默納協的子孫,瑪基爾的兒子基肋阿得子孫的家族首領,來到梅瑟和叵子民各家族的首領前說:
Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha:
2 「上主吩咐我主,以抽籤來分給以色列子民土地為產業,我主又領了木的保,將我們兄弟責羅斐哈得的產業,分給他的女兒們。
“Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom.
3 現在,如果她們嫁給了以色列子民另一支派的人,她們的產業就脫離了我們祖先的產業,而加在所嫁給的那一支派的產業上:這樣,我們抽籤分得的產業就減少了。
Ugbu a, ọ bụrụ na ha alụọ ndị ikom Izrel si nʼebo ọzọ, mgbe ahụ, ihe nketa ha ga-abụ nke anapụrụ anyị, tụkwasị nʼihe nketa nke ebo ebe ha lụrụ di. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa anyị ga-abụ nke e wepụrụ ihe site na ya.
4 甚至一到以色列子民的喜年,她們的產業仍舊加在所嫁的那一支派的產業內,我們祖先支派的產業就減少了她們那一份」。
Mgbe afọ inwere onwe nye Izrel ruru, a ga-agụnye ihe nketa ha nʼebo ebe ha lụrụ dị. A ga-esi otu a wepụ ala ha site nʼihe nketa nke nna nna anyị ha ketara.”
5 梅瑟依上主的指示訓令以色列子民說:「若瑟子孫支派說的有理。
Mgbe ahụ, Mosis nyere ndị Izrel ntụziaka site nʼiwu Onyenwe anyị sị, “Ihe ndị ikom ebo Josef na-ekwu ziri ezi.
6 上主對於責羅斐哈得的女兒們這樣這樣吩咐說:她們可任意嫁給自己所喜愛的人,但只應嫁給屬於自己祖先支派的人。
Ma nke a bụ iwu Onyenwe anyị na-enye maka ụmụ ndị inyom Zelofehad. Ha nwere ike ịlụ onye ọbụla masịrị ha, ma onye ha ga-alụ ga-abụrịrị onye si nʼagbụrụ ebo nna ha.
7 以色列子民的產業不可由一支派轉移至另一支派,因為以色列子民每人應固守自己祖先支派的產業。
O nweghị ihe nketa ọbụla nʼIzrel ga-esi nʼaka otu ebo gafee nʼebo ọzọ. Nʼihi na ihe nketa nke ebo ọbụla ga-adịgidere ha dịka otu e siri kee ya nye nna nna ha.
8 以色列子民支派中,凡繼承產業的子女,應嫁給她祖先支派的人為妻,好使每個以色列子民能固守祖先的產業。
Nwa nwanyị Izrel ọbụla ketara ala nʼebo Izrel ọ bụla ga-alụ di site nʼagbụrụ ebo nna ya. Ka ala ha ghara ịgafere ebo ọzọ.
9 這樣產業就不會由一支派轉移至另一支派,因為以色列子民各支派應固守自己的產業」。
Ọ dịghị ihe nketa ọbụla ga-esi nʼotu ebo feere ebo ọzọ. Nʼihi na ebo Izrel ọbụla ga-edebere onwe ha ala ha ketara.”
10 上主怎樣吩咐了梅瑟,責羅斐哈得的女兒們就怎樣做了。
Ya mere, ụmụ ndị inyom Zelofehad mere dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
11 責羅斐哈得的女兒:瑪赫拉、提爾匝、曷米革拉、米耳加和諾阿,嫁給了自己叔伯的兒子們,
Ụmụ Zelofehad ndị a: Mahla, na Tịaza, na Hogla, na Milka, na Noa, lụrụ ndị ikom si nʼebo nna ha.
12 即嫁給了若瑟的兒子默納協子孫家族的人:如此她們的產業仍留在她們祖先家族的支派內。
Ha lụrụ di nʼagbụrụ ụmụ Manase, nwa Josef. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa ha dịgidere nʼebo na agbụrụ nna ha.
13 這是上主在耶利哥對面,約旦河邊,摩阿布曠野內,藉梅瑟向以色列子民所頒佈的誡命和規則。
Ndị a bụ iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị sitere nʼaka Mosis nye ndị Izrel nʼoge ha nọ nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko.

< 民數記 36 >