< 民數記 31 >

1 上主訓示梅瑟說:「
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 你應在米德楊人身上為以色列子民報仇,以後你就要歸到你親族那裡去。」
“Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.”
3 梅瑟於是吩咐人民說:「你們要選拔壯丁,武裝起來,準備作戰,進攻米德楊,在他們身上為上主雪仇。
Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.
4 以色列每支派應派遣一千人出征作戰。」
Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.”
5 這樣,每支派出一千人,以色列的部隊共有一萬二千武裝出征的人。
Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.
6 梅瑟就派遣他們──每支派一千人,出征作戰,並派遣大司祭厄肋阿匝爾的兒子丕乃哈斯與他們同去,手內帶著聖器和發號令的喇叭,
Mosis zipụrụ ha ibu agha, otu puku, otu puku site nʼebo ọbụla. Finehaz nwa Elieza, onye nchụaja, du ha gaa agha ahụ. O bu ngwongwo si nʼebe nsọ, tinyere opi ike nke a ga-afụ.
7 他們遂照上主對梅瑟所吩咐的,攻擊了米德楊,殺了所有的男子。
Ha busoro ndị Midia agha dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Ha gburu onye ọbụla bụ nwoke.
8 除這些被殺的以外,還殺了米德楊五個王子:厄威、勒耿、族爾、胡爾和勒巴;也用刀殺了貝敖爾的兒子巴郎。
Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa.
9 以色列子民俘虜了米德楊人的婦女和幼童,掠奪了他們所有的牲畜、羊群和財產;
Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha.
10 火燒了他們所住的一切城邑和營寨。
Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.
11 以後把一切所搶所奪之物,人和牲畜都帶走,
Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ.
12 把俘虜和所搶所奪之物,帶到梅瑟和大司祭厄肋阿匝爾以及以色列子民全會眾那裡,即帶到耶里哥的對面,約但河邊,摩阿布曠野中的營盤那裡。
Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.
13 梅瑟和大司祭厄勒阿匝爾以及會眾各首領,都到營外歡迎他們。
Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
14 梅瑟對作戰回來的軍官、千夫長和百夫長大發忿怒,
Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta.
15 向他們說:「你們為什麼還讓這一些婦女活著﹖
Mosis jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji debe ndị inyom niile ndị a ndụ?
16 看正是她們聽了巴郎的話誘惑了以色列子民,在培敖爾事件上違背了上主,致使災禍降在上主的會眾身上。
Ọ bụ ndị a bụ ndị gbasoro ndụmọdụ Belam, rafuo ndị Izrel mee ka ha ghọọ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị nʼihe gbasara okwu Peoa. Ọ bụ nke a mere ka nrịa nrịa ọjọọ ahụ na-efe efe dakwasị ndị nke Onyenwe anyị.
17 今應將所有的男童殺死,將所有認識過男人,與男人同過房的女人,都一律殺掉。
Ugbu a, gbuonụ ụmụnta ndị nwoke niile, na ndị inyom niile matarala nwoke.
18 至於那些沒有與男人來往同過房的女童,可為你們保留。
Naanị ụmụntakịrị ndị nwanyị ha nke nwoke na-edinabeghị ka unu ga-ahapụ ka ha dịrị ndụ. Unu nwere ike debere onwe unu ndị dị otu a.
19 你們應七天住在營外;你們和你們的俘虜,凡殺過人,或接觸過屍首的,應在第三天和第七天上取潔;
“Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa.
20 對所有的衣服、皮具、毛織品和木器,都應行取潔禮。」
Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.”
21 大司祭厄肋阿匝爾對作戰回來的軍隊說:「這是上主吩咐梅瑟的法令:
Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
22 金銀、銅、鐵、錫、鉛,
Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu,
23 凡能耐火之物,應經過火,再以取潔水取潔,才算潔淨;凡不能耐火之物,應經過水洗。
na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha.
24 第七天應洗你們的衣服,你們才算潔淨,然後方可回營。」
Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.”
25 上主又訓示梅瑟說:「
Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,
26 你和厄肋阿匝爾司祭以及會眾的家長,應統計一下掠奪的勝利品,無論是人或牲畜,
“Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ.
27 然後把勝利品平分,一半給出征作戰的兵士,一半給其餘全體會眾。
Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.
28 由出征作戰的兵士所得的一分中,抽出五百分之一,不論是人、牛、驢或羊,奉獻給上主;
Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.
29 把所取出的交給厄肋阿匝爾司祭,作為屬於上主的獻儀。
Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara.
30 由以色列子民分得的一半中,應抽出五十分之一,不論是人、牛、驢、羊,或是其他牲畜,交給那些在上主會幕內服務的肋未人。」
Otu aka ahụ kwa, site nʼoke ndị Izrel ga-eketa, kee ụtụ. Otu ụzọ nʼime iri ise, maọbụ mmadụ, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, maọbụ igwe anụ ụlọ ụzọ. Were ha nye ndị Livayị, ndị ọ dị nʼaka ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ oke nke ha.”
31 梅瑟和厄肋阿匝爾司祭就照上主吩咐梅瑟的做了。
Ya mere, Mosis na Elieza onye nchụaja mere dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu.
32 作戰部隊所掠奪的物品,尚存的戰利品,計有羊六十七萬五千隻,
Ihe nweta bụ nke fọdụrụ nʼihe ndị agha lụtara nʼagha bụ ndị a, bụ atụrụ dị narị puku isii, iri puku asaa na puku ise,
33 牛七萬二千頭,
Ehi dị iri puku asaa na puku abụọ,
34 驢六萬一千匹;
ịnyịnya ibu dị iri puku isii na otu puku,
35 人口,尚未與男人來往同過房的女人,計有三萬二千。
Ụmụ agbọghọ na-amatabeghị nwoke dị iri puku atọ na puku abụọ.
36 出征作戰所得的一半,計羊三十三萬七千五百隻;
Ya mere, ọkara e nyere ndị gara lụọ agha dị: Igwe ewu na atụrụ dị narị puku atọ na iri puku atọ na puku asaa na narị ise.
37 由這些羊中,給上主作獻儀的,為六百七十五隻;
Nʼime ya, ụtụ e nyere Onyenwe anyị site nʼigwe atụrụ ahụ dị narị isii na iri asaa na ise.
38 牛三萬六千頭,給上主作獻儀的,為七十二頭;
Igwe ehi dị iri puku atọ na puku isii. Nʼime ya, ihe e nyere Onyenwe anyị bụ iri asaa na abụọ.
39 驢三萬五百匹,給上主作獻儀的,為六十一匹;
Ịnyịnya ibu dị iri puku atọ na narị ise. Nke e nyere Onyenwe anyị bụ iri isii na otu.
40 人口一萬六千,給上主作獻儀的,為三十二人。
Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ dị puku iri na isii. Ndị e nyere Onyenwe anyị dị iri atọ na abụọ.
41 梅瑟就照上主對他所吩咐的,將取出作為上主獻儀的一份,交給了厄肋阿匝爾司祭。
Mosis nyere Elieza bụ onye nchụaja Onyenwe anyị oke nʼihe ndị ahụ niile a tụrụ nʼụtụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
42 至於梅瑟分配給以色列子民的那一半,即與作戰的兵士平分出來的,
Ma ọkara nke ahụ dịrị ndị Izrel, nke Mosis kewapụtara site na nke ndị ikom lụrụ agha.
43 那屬於會眾的一半,計有羊三十三萬七千五百隻,
Ọkara nke nzukọ dị, igwe ewu na atụrụ, narị puku atọ, iri puku atọ, puku asaa na narị ise,
44 牛三萬六千頭,
igwe ehi, iri puku atọ na isii,
45 驢三萬五百匹,
ịnyịnya ibu, iri puku atọ na narị ise,
46 人口一萬六千。
ụmụ agbọghọ, puku iri na isii.
47 梅瑟照上主對他所吩咐的,由屬於以色列子民的這一半,抽出五十分之一的人和牲畜,交給了那些在上主會幕內服務的肋未人。
Site nʼoke ndị Izrel Mosis họpụtara otu ụzọ nʼime iri ise, ma mmadụ ma anụ ụlọ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. O nyere ha ndị Livayị na-elekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị mmadụ na anụ ụlọ ndị a.
48 出征作戰的軍官,千夫長和百夫長,來到梅瑟前,
Mgbe ahụ, ndịisi agha niile na ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha bịakwutere Mosis,
49 對他說:「你的僕人們調查了所屬的作戰士兵,一個也沒有少。
sị ya, “Ndị ohu gị agụọla ndị niile gara agha nọ nʼokpuru anyị, chọpụta na o nweghị onye ọbụla a na-achọ achọ.
50 為此我們每人將所獲得的金器,如臂鐲、腕鐲、戒指、耳環和項鏈,獻於上主作獻儀,好在上主面前為我們贖罪。」
Ya mere, anyị wetaara Onyenwe anyị onyinye site nʼihe anyị kwatara nʼagha. Onyinye anyị bụ ihe onye ọbụla nwetara, ihe ọlaedo a na-agba nʼụkwụ na mgbaaka, na ọlaaka ikike, na ọlantị na ihe iyi nʼolu niile, i ji ha chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onwe anyị nʼihu Onyenwe anyị.”
51 梅瑟和厄肋阿匝爾司祭由他們手中接受了這一切金製物品。
Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị ahụ bụ ihe a kpụrụ akpụ site nʼaka ha.
52 千夫長和百夫長獻給上主作獻儀的金子,共計一萬六千七百五十「協刻耳。」
Ịdị arọ nke ihe ọlaedo niile nke ndị ọchịagha na-achị imerime puku ndị agha, na ndị na-achị narị ndị agha, nke Mosis na Elieza chere nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye, dị narị kilogram na iri itoolu.
53 兵丁所掠奪的東西,各歸己有。
Ndị ahụ lụrụ agha ahụ nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha debeere onwe ha.
54 梅瑟和厄肋阿匝爾司祭遂將由千夫長和百夫長所收下的金子,帶入會幕內,好使上主記念以色列子民。
Mosis na Elieza onye nchụaja natara onyinye ọlaedo ndị a dị iche site nʼaka ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha na narị ndị agha. E webatara onyinye ndị a nʼụlọ nzute, debe ha nʼihu Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe ncheta nye Onyenwe anyị nʼihi ndị Izrel niile.

< 民數記 31 >