< 民數記 20 >
1 以色列子民全會眾於正月來到了親曠野,人民就在卡德士住下了。米黎盎在那裏死了,也就埋在那裏。
Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya.
Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn.
3 民眾同梅瑟爭辯說:「巴不得我們的兄弟也上主面前死去時,我們也死了!
Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
4 為什麼你們領上主的會眾來到這曠野裏,叫我們和我們的牲畜都死在這裏﹖
Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a?
5 為什麼你們使我們由埃及上來,領我們來到這樣壞的地方﹖這地方不但沒有糧食,沒有無花果,沒有葡萄,沒有石榴,而且連喝的水也沒有! 」
Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
6 梅瑟和亞郎遂離開會眾,來到會幕門口,俯伏在地;上主的榮耀遂發現給他們。
Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya.
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
8 「你拿上棍杖,然後你和你的兄弟亞郎召集會眾,當著他們眼前對這磐石發命,叫磐石流水。這樣你便可使水由磐石中給他們流出,給會眾和他們的牲畜喝」。
“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị.
10 梅瑟和亞郎召集會眾來到磐石前,對他們說:「你們這些叛徒,聽著! 我們豈能從這磐石中給你們引出水來﹖」
Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
11 梅瑟遂舉起手來,用棍杖打了磐石兩次,才有大量的水湧出,會眾和他們的生畜都喝夠了。
Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
12 上主卻對梅瑟和亞郎說:「因為你們沒有相信我,使我以色列子民眼前被尊為聖,所以你們不得領這會眾進入我賜給他們的土地」。
Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.”
13 這就是默黎巴水的來歷,因為以色列子民在那裏與上主爭辯過,上主因而顯示了自己的聖德。
A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
14 梅瑟由卡德士派遺使者去見厄東王說:「你的兄弟以色列這樣說:你知道我們所遭遇的一切困難,
Mosis sitere nʼọzara Kadesh, zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya, “Otu a ka nwanne gị bụ Izrel na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị.
15 我們的祖先下到了埃及。我們在埃及住了很久,埃及人虐待了我們和我們的祖先。
Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ.
16 我們曾向上主呼號,衪俯聽了我們的呼聲,派來了一位使者,領我們出離了埃及。看,我們現在就在你邊境上的卡德士城,
Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.
17 求你讓我們由你的境內經過;我們決不會踏過莊田或葡萄園,菩提不喝井裏的水,只走王道,不偏右,也不偏左;直至走過你的國境」。
Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”
18 厄東卻答覆說:「不准你們由我們這裏經過,不然我要以刀相迎」。
Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”
19 以色列子民再向他說:「我們只沿大路走,我們和我們的牲畜若喝了你的水,我們願付錢;只求經過這點小事」。
Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”
20 他仍然說:「不准你經過」。厄東即領大隊人馬和武裝步隊出迎。
Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.
21 厄東既然不讓以色列由他境內經過,以色列就從那裏折回。
Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.
22 以色列子民全會眾由卡德士起程,來到了曷爾山。
Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.
23 在厄東國界的了曷爾山上,上主對梅瑟和亞郎說:
Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
24 「亞郎要歸到他祖先那裏去,他不能進入我賜給以色列子民的地方,因為你們在默黎巴取水的事上,違背了我的訓令。
“Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.
25 你帶亞郎和他的兒子厄肋阿匝爾,一同上曷爾山上去,
Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.
26 將亞郎的長袍脫下,給他的兒子厄肋阿匝爾穿上,因為亞郎要被召回歸去,死在那裏」。
Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”
27 梅瑟就照上主吩咐的做了。當著全會眾的面,他們上了曷爾山。
Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.
28 梅瑟把亞郎的長袍脫下,給他的兒子厄肋阿匝爾穿上,亞郎就在山頂死了。以後梅瑟和厄肋阿匝爾由山上下來。
Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.
29 全會眾知道亞郎死了,以色列全家為亞郎舉哀三十天。
Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.