< 尼希米記 4 >

1 桑巴拉特一聽說我們重修城垣,就大發忿怒,十分生氣,譏諷猶太人,
Iwe were Sanbalat nke ukwuu mgbe ọ nụrụ na anyị na-ewuzigharị mgbidi ahụ niile. O were iwe dị ọkụ, ọnụma jukwara ya obi. Ọ chịrị ndị Juu ọchị, kwaakwa ha emo.
2 向他們的同僚即撒瑪黎雅的軍隊說:「這些可憐的猶太人想作什麼﹖他們想要修築城垣嗎﹖想要獻祭嗎﹖想要在一天內完成嗎﹖想從那堆灰土中,在立起那些燒過的石頭來嗎﹖」
Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, “Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?”
3 阿孟託人托彼雅也在旁說到:「讓他們修罷! 就是上去一隻野狗,也能推翻他們修了石牆。」
Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; “Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ọ ga-ada!”
4 我們的天主,請聽! 我們是怎樣受侮辱! 請把這辱罵歸到他們的頭上,使他們在流亡之地受迫害。
Mgbe ahụ, e kpere m ekpere sị, “Chineke, biko nụrụ emo a na-akwa anyị. Ka ịkwa emo ha laghachikwa ha nʼisi; ka a dọtakwa ha nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
5 不要遮掩他們的罪行,他們的罪孽也不應從你面前抹去,因為他們實在侮辱了修建的人。
Elefula mmehie ha anya, agbagharakwala ha, nʼihi na ha ledara gị anya, ledakwa anyị anya, bụ ndị na-ewuzi mgbidi gị.”
6 我們仍繼續修建城牆,把整個城牆都聯結起來,高底已到一半,因為民眾都有心火工作。
Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ.
7 當桑巴拉特和托彼雅,以及阿剌伯人、阿孟人和阿市多得人,聽說耶路撒冷城垣正在進行修建中,缺口已開始修補,就大發忿怒,
Ma mgbe Sanbalat, Tobaya, ndị Arab, ndị Amọn na ndị Ashdọd nụrụ na ọrụ iwuzi mgbidi Jerusalem na-aga nʼihu, nụkwa na-emechichala ebe niile puru epu, iwe were ha nke ukwuu.
8 都聯合起來,圖謀來攻打耶路撒冷,擾亂我們。
Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ.
9 我們一面祈求我們的天主,一面派了衛隊,日夜防守。
Ma anyị kpere ekpere nye Chineke, kwụbakwa ndị nche iguzogide ha ehihie na abalị.
10 有一個猶太人說︰「運夫的力量已耗盡,積土又太多,我們不能再修建城牆了! 」
Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ.
11 我們的仇敵已議決說:「不讓他們知道,不讓他們看出,我們直衝入他們中間,將他們殺掉,停止那工程。」
Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị.
12 那時,有些靠近他們居住的猶太人,十次前來通知我們說︰「他們由所住的各方上來,攻打我們,
Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.”
13 已在城牆下低處的田野中安了營。」我就按照家族分派了人,帶上刀槍和弓。
Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị.
14 我巡視之後,就起來對權貴、長官和其餘的人民說︰「對他們,你們不可畏縮! 要記住吾主是偉大而可畏的:應為你們的兄弟、兒女、妻子、家庭而作戰。」
Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”
15 我們的敵人一聽說我們得了情報,同時天主也破壞了他們的陰謀,他們遂都撤退;我們也都回到城牆那裏,各返自己的工作崗位。
Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ.
16 從那天起,我的僕人一半做工,一半佩帶著刀、矛盾、弓和鎧甲,立在全猶大家後邊,
Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, anyị kere onwe anyị ụzọ abụọ. Ụfọdụ ndị ji ùbe, ọta na ụta na-anọ na nche mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Ndịisi niile pụtakwara guzo nʼazụ ndị Juda niile ebe ha nọ nʼihu ọrụ ha.
17 即在城牆作工的人後邊。那些搬運的人,也都武裝起來︰一手作工,一手拿著武器;
Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ.
18 修牆的工人,每人腰間都配著刀工作。吹號筒的站在我身旁。
Ndị ọzọ tinyere mma agha ha nʼukwu ha. Ndị na-egbu opi nọkwa m nʼakụkụ mgbe niile maka ịfụ opi mgbe a chọrọ ya.
19 我向權貴、長官和其餘的人民說︰「這工程範圍很大,我們在城牆上彼此分離甚遠,
Mgbe ahụ, asịrị m ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị na ndị mmadụ ọzọ ahụ niile, “Ọrụ anyị nwere ịrụ dị ukwuu, gbasapụkwa, anyị anọkọtaghị ọnụ nʼotu ebe, ekewakwara anyị ebe dị iche iche na mgbidi.
20 所以你們無論在什麼地方,一聽到號聲,就立時聚集在我們身旁;我們的天主必為我們戰爭。」
Ya mere, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda opi, gbaranụ ọsọ bịa nʼebe m nọ. Chineke ga-alụkwara anyị ọgụ.”
21 我們便這樣繼續工作,由旭日初昇,直到星辰出現。
Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche.
22 同時我又吩咐民眾說:「每人和他的僕人,應在耶路撒冷過夜。如此在夜間可為我們守衛,白天可以工作。」
Agwara m ndịisi ọrụ niile okwu sị ha na onyeisi ọrụ ọbụla na ndị na-enyere ya aka nʼọrụ ga na-anọ na Jerusalem nʼabalị niile. Nʼụzọ dị otu a, ndị ọrụ ga-arụ ọrụ ha nʼoge ihe dị, ma ha ga-anọkwa na nche nʼabalị.
23 至於我和我的兄弟,以及我的僕人和跟隨我、護衛我的人,沒有一人脫過衣服,各人手中常拿著武器。
Nʼoge ndị a niile, eyipụghị m uwe m yi nʼahụ. O nwekwaghị onye ọbụla ọzọ, maọbụ nwanne m nwoke, maọbụ ndị nche na-eso m onye yipụrụ uwe ya ma onye ukwu ma onye nta. Mma agha anyị na-adịkwa anyị nʼukwu mgbe niile, ọbụladị mgbe anyị chọrọ mmiri.

< 尼希米記 4 >