< 尼希米記 13 >

1 那日,當著民眾宣讀梅瑟書時,人們聽到書中寫著說:「永遠不准阿孟人和摩阿布人,加入天主的會眾,
Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke.
2 因為他們沒有攜帶飲食歡迎以色列人民,反賄賂巴郎詛咒他們,我們的天主卻將詛咒轉為祝福。
Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)
3 民眾一聽了這法律,便將各外族由以色列人中隔絕。
Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha.
4 這事以前,厄肋雅史布司祭,曾被派管理天主的倉庫,他是托彼雅的親信,
Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,
5 遂為托彼雅準備了一所大倉房,以前其中是存敦供物、乳香、器具、以及肋未人。歌詠者和守門者按法律所應得的什一之榖、酒和油,並司祭所應得的供物。
o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.
6 發生這一切事時,我不在耶路撒冷,因為在巴比倫王阿塔薛西斯三十二年,我已回到君王那裏;滿了一個時以後,我又求得君王准許,
Mgbe ihe ndị a na-eme, anọghị m na Jerusalem, nʼihi na nʼiri afọ atọ na abụọ nke ọchịchị Ataksekses, eze Babilọn, a lọghachikwutere m eze. Ma e mesịrị m nata ya ike
7 回了耶路撒冷;此時我才發覺出,厄雅史布為托彼雅所行的壞事,為他在天主聖殿的庭院中,準備了一所大倉房。
laghachikwa na Jerusalem. Nʼebe a ka m nọ mata banyere ihe ọjọọ ahụ Eliashib mere, inye Tobaya otu ọnụụlọ nke dị nʼogige ụlọ Chineke ka ọ bụrụ ebe izuike ya.
8 我感覺十分難受,立即將托彼雅的一切器物,拋出倉房之外,
Iwe were m nke ukwuu, nke mere na m sitere nʼọnụụlọ ahụ tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile nʼezi.
9 下命清潔那倉房,將天主聖殿的器具、供物和乳香仍放在裏面。
Enyere m iwu ka e doo ọnụụlọ ndị ahụ niile ọcha, a chighachikwara m ngwongwo ụlọ Chineke niile nʼime ha, ha na onyinye mkpụrụ ọka, na ụda na-esi isi ụtọ ndị ahụ.
10 我還發覺肋未人應得之分,人們已不繳納,為此供職的肋未人和歌詠者,各回了本鄉。
A chọpụtakwara m na-enyebeghị ndị Livayị oke ihe ruru ha, nke mere na ndị ọbụ abụ, na ndị nche ndị ọ bụ ọrụ ha i doo ofufe, alaghachila nʼubi ha dị iche iche.
11 我便責斥首長們說:「為什麼又將肋未人召喚起來,又恢復了他們的職務。
Nʼihi ya, abaara m ha mba jụọ ha si: “Gịnị mere unu jiri gbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ?” Mgbe ahụ akpọghachiri m ndị Livayị nyekwa ha ọrụ ha nʼụlọnsọ.
12 那時,全猶大又將什一之穀、酒和油送入倉房。
Ndị Juda niile bidokwara iweta ụtụ ha, na onyinye ọka, na mmanya vaịnị na mmanụ oliv ha nʼụlọ ịchịkọba ihe dị nʼụlọnsọ.
13 我派定了舍肋米雅司祭、匝多克經師和肋未人培達雅,作管理倉房的人;委任瑪塔尼雅的子孫,匝雇爾的兒子哈南,作他們的助手,都是忠實可靠的人;他們的職務是將十一之物,分給他們的兄弟。
E tinyere m Shelemaya onye nchụaja, na Zadọk ode akwụkwọ, na Pedaia onye Livayị, ka ha bụrụ ndị na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe niile ahụ. Emekwara m Hanan nwa Zakua, nwa Matanaya, onye ga na-enyere ha aka, nʼihi na a gụrụ ha dịka ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikere ndị Livayị ibe ha niile oke.
14 我的天主,這了這事,請記憶我! 不要抹去我對我天主的聖殿,和其中的禮儀所做的一切善事。
Chineke m, biko cheta m nʼihi nke a, ehichapụkwala ihe niile m ji obi m niile rụọ nʼụlọnsọ gị na ije ozi niile ya.
15 那時我在猶大,看見有人在安息日踏榨酒池,搬運禾綑,馱在驢上,並把油、葡萄無花果和其他各種重載,安息日運到耶路撒冷;為了他們在此日買賣應用品,我曾警戒了他們。
Nʼụbọchị ndị ahụ, ka m hụrụ na Juda ndị na-azọcha mmanya vaịnị nʼụbọchị izuike, ndị ji ịnyịnya ibu na-ebubata ogbe ọka, na-ebokwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu, tinyekwara mmanya, na mkpụrụ vaịnị na fiig, na ibu niile ọbụla. Ha na-ebubatakwa ha nʼime Jerusalem nʼụbọchị izuike. Nke a mere m ji dọọ ha aka na ntị megide ire nri nʼụbọchị ahụ.
16 有住這裏的提洛人,運來了魚和各種貨物,安息日還在耶路撒冷賣給猶太人,
Ndị si obodo Taịa, bụ ndị birila na Jerusalem nọ na-ebubata azụ na ngwa ahịa ndị ọzọ dị iche iche, na-ere ha na Juda, nakwa na Jerusalem nʼụbọchị izuike.
17 我遂責斥有權勢的猶太人說:「你們怎麼行這樣的壞事,褻瀆安息日呢,
A baara m ndị a na-asọpụrụ na Juda mba, si ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a unu na-eme, na-emerụ ụbọchị izuike?
18 你們的祖先不是曾這樣行事,而使我們的天主,加給了我們和這城這一切災禍嗎﹖現今你們褻瀆安息日,還要義怒再多加在以色列人身上嗎﹖
Ọ bụghị otu ihe a ka nna nna unu ha mere, nke mere na Chineke wetara ọdachi a tụkwasị anyị nakwa obodo a? Ugbu a, unu na-akpali ọnụma tụkwasị na nke dị megide Izrel site nʼimerụ ụbọchị izuike?”
19 所以在安息日前一天,陰影一來到耶路撒冷城門,我就下令關閉城門,不准開門,直到安息日過去;並派我的僕役守門,安息日不准任何重載運進。
Nʼihi nke a, enyere m iwu na a ga-emechi ọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼuhuruchi tupu ụbọchị izuike, ruo mgbe ụbọchị izuike gafesịrị. Emere m ka ụfọdụ ndị ohu m na-anọ na nche nʼebe ahụ, ịhụ na ọ dịghị onye ahịa ọbụla ga-abata nʼime obodo Jerusalem nʼụbọchị izuike.
20 有一兩次,販夫和賣各種貨物的商人,在耶路撒冷外過夜;
Ya mere, ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ụdị ngwa ahịa dị iche iche, na-anọ ọnọdụ abalị nʼazụ Jerusalem, otu gboro maọbụ ugboro abụọ.
21 我警告他們說:「你們為什麼在城垣前過夜﹖若是你們再這樣做,我就要向你們下手,」從此以後,安息日他們不敢再來。
Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.
22 我也命令肋未人先聖潔自己,然後去看守城門,為聖化聖日。我的天主,為了這事,也請你記憶我! 照你的大仁慈憐恤我!
Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.
23 那時,我還發見好些猶太人,娶了阿市多得、阿孟和摩阿布人的女子為妻。
Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab,
24 他們的兒子,有一半只會說阿市多得話,或這些民族的一種語言,而不會講猶太話。
chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị.
25 我遂責斥咒罵這樣的男人,其中一些我還打了他們,扯了他們的頭髮,叫他們指著天主起誓,向他們說:「你們不可再把你們的女兒,嫁給他們的兒子,也不可為你們的兒子並為你們自己,娶他們的女兒。
Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ.
26 以色列的君王撒羅滿,豈不是在這事上犯了罪嗎﹖在這樣多民族中,沒有一個相似他的君王,他又是天主所愛的,天主使他成為全以色列的君王,但是外方女子竟引他犯了罪。
Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị.
27 我們豈能任憑你們行這一切大壞事,娶外方婦女,背棄天主嗎﹖」
Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?”
28 大司祭厄肋雅史布的兒子約雅達,有個兒子是曷龍人桑巴拉特的女婿,我便驅逐他離開我。
Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.
29 我的天主,請記住他們! 因為他們褻瀆了司祭和肋未的誓約。
Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị.
30 如此我清除了一切異類,整頓了司祭和肋未人職守,規定了各人應盡的職務,
Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.
31 劃定了奉獻木柴和什一之物的時期。我的天主! 求你記憶我,使我蒙福!
Emekwara m ka a na-ebubata nkụ nke ebe ịchụ aja nʼoge kwesiri, meekwa ka a na-ewebata onyinye mkpụrụ mbụ niile nʼoge ha. Cheta m Chineke, gosi m ihuọma gị.

< 尼希米記 13 >