< 彌迦書 2 >

1 禍哉,那些在床上籌劃不義,圖謀行惡的人! 因為你們手中有能力,一到天亮,就去實行。
Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha, na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche. Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara, nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha.
2 他們想要田地,便去霸佔;朼想要房屋,便去奪取:以暴力對付業主和他的家族,物主和他的產業。
Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike, na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike. Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha, ha na-ezunara ha ihe nketa ha.
3 為此上主這樣說:「看,我正在為這一家籌劃災禍,致令你們不能縮回你們的頭頸,也不能挺身前行,因為那是一個災禍的時刻。」
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.
4 在那一日,人要作詩諷刺你們,唱這悲慘的哀哥說:「我們完全被搶掠了,我人民的基業已被人瓜分了,再無人歸還;我們的土地已分配給搶掠我們的人! 」
Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, ‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, e kesaala ihe nnweta nke ndị m, ọ napụla m ha. O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’”
5 因此,你們在上主的集會中,再沒有拉繩測量和抽籤的人。
Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.
6 你們講說:「你們不要說預言。」「人不該預言這樣的事,恥辱決不會來到我們身上!
Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.”
7 雅各伯的家豈是可詛咒的﹖上主的氣量豈能變為狹小﹖難道這是衪的作風﹖衪的話豈不是有益於以色列子民﹖」
Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma?
8 「但是你們正像敵人一樣,起來攻擊我的人民,因為你們向沒有短衣的人索取長袍,向平安走路的人索取戰利品。
Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.
9 你們驅逐我人民的婦女離開她們的快樂家庭,從她們的嬰兒身上,永遠奪去我的光榮。
Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m site nʼụlọ afọ ojuju ha. Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m ruo mgbe ebighị ebi.
10 你們起來走吧! 因為這不是你們安息之所。為了不懂,這地必要遭受不可挽救的毀滅。」
Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.
11 假若有人隨從虛妄而撒謊說:「我要對你預言清酒和醇酒。」這人必可作這民族的先知。
Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, ‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.
12 我必要聚集雅各伯全民眾,我必要集合以色列的遺民,使他們合併在一處,有如羊欄裏的綿羊,有如牧場上的羊群,不再怕任何人。
“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb, aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe. Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ, dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya, ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.
13 開路者走在他們前面開道;他走在前面,眾人隨他穿門而過;他們的君王走在他們們前面,上主親作他們的響導。
Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”

< 彌迦書 2 >